< ܓܠܛܝ̈ܐ 2 >

ܬܘܒ ܕܝܢ ܡܢ ܒܬܪ ܐܪܒܥܤܪܐ ܫܢܝܢ ܤܠܩܬ ܠܐܘܪܫܠܡ ܥܡ ܒܪܢܒܐ ܘܕܒܪܬ ܥܡܝ ܠܛܛܘܤ 1
Mgbe afọ iri na anọ gasịrị, ejeghachiri m Jerusalem ọzọ. Mụ na Banabas laghachiri Jerusalem, akpọkwara m Taịtọs jee.
ܤܠܩܬ ܕܝܢ ܒܓܠܝܢܐ ܘܓܠܝܬ ܠܗܘܢ ܤܒܪܬܐ ܕܡܟܪܙ ܐܢܐ ܒܥܡܡܐ ܘܚܘܝܬܗ ܠܐܝܠܝܢ ܕܡܤܬܒܪܝܢ ܗܘܘ ܕܡܕܡ ܐܝܬܝܗܘܢ ܒܝܢܝ ܘܠܗܘܢ ܕܡ ܤܪܝܩܐܝܬ ܪܗܛܬ ܐܘ ܪܗܛ ܐܢܐ 2
Agara m nʼihi mkpughe m nwere. Na nzukọ nzuzo nke m na ndị ndu nwere, akọwaara m ha ihe banyere oziọma nke m na-ekwusa nʼetiti ndị mba ọzọ. Nʼihi na-achọghị m ka ọrụ niile m rụrụ nʼoge gara aga, na ọrụ m na-arụ ugbu a, bụrụ ihe efu.
ܐܦ ܛܛܘܤ ܕܥܡܝ ܕܐܪܡܝܐ ܗܘܐ ܠܐ ܐܬܐܢܤ ܕܢܓܙܘܪ 3
Ọ bụladị Taịtọs onye mụ na ya so, o nweghị onye manyere ya ka e bie ya ugwu nʼagbanyeghị na ọ bụ onye Griik.
ܡܛܠ ܕܝܢ ܐܚܐ ܕܓܠܐ ܕܥܠܘ ܥܠܝܢ ܕܢܓܫܘܢ ܚܐܪܘܬܐ ܕܐܝܬ ܠܢ ܒܝܫܘܥ ܡܫܝܚܐ ܐܝܟܢܐ ܕܢܫܥܒܕܘܢܢܝ 4
Ndị ahụ na-abụghị ndị kwere ekwe nʼezie e zobatara na nzukọ inyochapụta otu anyị si nwere onwe anyị nʼime Kraịst Jisọs, ka ha nwee ike mee anyị ndị ohu.
ܐܦܠܐ ܡܠܐ ܫܥܐ ܐܬܪܡܝܢ ܠܫܘܥܒܕܗܘܢ ܕܫܪܪܗ ܕܤܒܪܬܐ ܢܩܘܐ ܠܘܬܟܘܢ 5
Ma o nweghị oge anyị ji gee ntị nʼihe ha kwuru, nʼihi na anyị chọrọ ichedo eziokwu ahụ dị nʼoziọma ka a ghara ịgwa ya ihe ọbụla nʼetiti unu.
ܗܢܘܢ ܕܝܢ ܕܡܤܬܒܪܝܢ ܕܐܝܬܝܗܘܢ ܡܕܡ ܡܢ ܕܝܢ ܐܝܬܝܗܘܢ ܠܐ ܒܛܝܠ ܠܝ ܐܠܗܐ ܓܝܪ ܒܐܦܝ ܒܢܝܢܫܐ ܠܐ ܢܤܒ ܗܢܘܢ ܕܝܢ ܗܠܝܢ ܡܕܡ ܠܐ ܐܘܤܦܘ ܠܝ 6
Banyere ndị a na-ewe ka ndị dị ndu dị mkpa, ihe ọbụla ọnọdụ ha bụ ewetaghị mgbanwe ọbụla nʼebe m nọ, nʼihi na Chineke adịghị ele mmadụ anya nʼihu. Ndị ahụ atụkwasịghị ihe ọbụla nʼoziọma m na-ezisa.
ܐܠܐ ܐܚܪܢܝܐܝܬ ܚܙܘ ܓܝܪ ܕܐܬܗܝܡܢܬ ܤܒܪܬܐ ܕܥܘܪܠܘܬܐ ܐܝܟ ܕܐܬܗܝܡܢ ܟܐܦܐ ܒܓܙܘܪܬܐ 7
Ma nʼaka nke ọzọ, mgbe ha hụrụ na e nyere m ọrụ izisa oziọma nʼetiti ndị e bighị ugwu, dịka e nyere Pita izisa oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu.
ܗܘ ܓܝܪ ܕܚܦܛ ܠܟܐܦܐ ܒܫܠܝܚܘܬܐ ܕܓܙܘܪܬܐ ܚܦܛ ܐܦ ܠܝ ܒܫܠܝܚܘܬܐ ܕܥܡܡܐ 8
Nʼihi na Chineke onye si nʼaka Pita na-arụ ọrụ onyeozi oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu, sikwa nʼime m na-arụ ọrụ onyeozi izisara ndị mba ọzọ oziọma.
ܘܟܕ ܝܕܥܘ ܛܝܒܘܬܐ ܕܐܬܝܗܒܬ ܠܝ ܝܥܩܘܒ ܘܟܐܦܐ ܘܝܘܚܢܢ ܗܢܘܢ ܕܡܤܬܒܪܝܢ ܗܘܘ ܕܐܝܬܝܗܘܢ ܥܡܘܕܐ ܝܡܝܢܐ ܕܫܘܬܦܘܬܐ ܝܗܒܘ ܠܝ ܘܠܒܪܢܒܐ ܕܚܢܢ ܒܥܡܡܐ ܘܗܢܘܢ ܒܓܙܘܪܬܐ 9
Mgbe Jemis, Sefas na Jọn ndị a maara dị ka ide ji ụlọ nʼetiti ndị ndu ahụ niile nara m na Banabas aka nnwekọ, nabatakwa amara e nyere m. Ha gbara anyị ume, sị anyị gaa nʼihu nʼọrụ anyị, ikwusa oziọma nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha kwa gaa nʼihu ịrụ ọrụ nke ha nʼetiti ndị e biri ugwu.
ܒܠܚܘܕ ܕܠܡܤܟܢܐ ܗܘܝܢ ܥܗܕܝܢܢ ܘܐܬܒܛܠ ܠܝ ܕܗܝ ܗܕܐ ܐܥܒܕܝܗ 10
Ọ bụ naanị otu ihe ka ha rịọrọ anyị, nke bụ ka anyị cheta ndị ogbenye. Nke a bụkwa ihe m na-achọsi ike ime.
ܟܕ ܐܬܐ ܕܝܢ ܟܐܦܐ ܠܐܢܛܝܘܟܝ ܒܐܦܘܗܝ ܐܟܤܬܗ ܡܛܠ ܕܡܬܬܩܠܝܢ ܗܘܘ ܒܗ 11
Ma mgbe Sefas bịaruru Antiọk, eguzogidere m ya nʼihu ya, nʼihi na ihe o mere mara ya ikpe.
ܕܥܕܠܐ ܢܐܬܘܢ ܐܢܫܐ ܡܢ ܠܘܬ ܝܥܩܘܒ ܥܡ ܥܡܡܐ ܐܟܠ ܗܘܐ ܟܕ ܐܬܘ ܕܝܢ ܢܓܕ ܗܘܐ ܢܦܫܗ ܘܦܪܫ ܡܛܠ ܕܕܚܠ ܗܘܐ ܡܢ ܗܢܘܢ ܕܡܢ ܓܙܘܪܬܐ 12
Tupu ndị Jemis zitere abịaruo ebe ahụ, ya na ndị mba ọzọ na-erikọ nri, ma mgbe ha rutere, ọ wepụrụ aka na nri laghachi azụ nʼihi na egwu ndị e biri ugwu na-atụ ya.
ܘܐܬܪܡܝܘ ܗܘܘ ܥܡܗ ܠܗܕܐ ܐܦ ܫܪܟܐ ܕܝܗܘܕܝܐ ܗܟܢܐ ܕܐܦ ܒܪܢܒܐ ܐܬܕܒܪ ܗܘܐ ܠܡܤܒ ܒܐܦܝܗܘܢ 13
Ndị Juu ụfọdụ sonyekwara ya inwe ihu abụọ a, nke mere na e si otu a duhiekwa Banabas nʼonwe ya.
ܘܟܕ ܚܙܝܬ ܕܠܐ ܐܙܠܝܢ ܬܪܝܨܐܝܬ ܒܫܪܪܗ ܕܐܘܢܓܠܝܘܢ ܐܡܪܬ ܠܟܐܦܐ ܠܥܝܢ ܟܠܗܘܢ ܐܢ ܐܢܬ ܕܝܗܘܕܝܐ ܐܢܬ ܐܪܡܐܝܬ ܚܝܐ ܐܢܬ ܘܠܐ ܝܗܘܕܐܝܬ ܐܝܟܢܐ ܐܠܨ ܐܢܬ ܠܥܡܡܐ ܕܝܗܘܕܐܝܬ ܢܚܘܢ 14
Ma mgbe m hụrụ na ha adịghị eme ihe dị ka eziokwu nke oziọma ahụ si dị, agwara m Sefas okwu nʼihu ha niile, sị, “Ọ bụrụ na gị nwa onye Juu na-ebi ndụ dịka onye mba ọzọ, na-abụghị dịka onye Juu, olee otu ị ga-esi manye ndị mba ọzọ ka ha na-ebi ndụ dịka ndị Juu?”
ܚܢܢ ܓܝܪ ܕܡܢ ܟܝܢܢ ܝܗܘܕܝܐ ܚܢܢ ܘܠܐ ܗܘܝܢ ܡܢ ܥܡܡܐ ܚܛܝܐ 15
Anyị onwe anyị bụ ndị Juu site nʼọmụmụ a mụrụ anyị, anyị abụkwaghị ndị mba ọzọ ndị mmehie,
ܡܛܠ ܕܝܕܥܝܢܢ ܕܠܐ ܡܙܕܕܩ ܒܪܢܫܐ ܡܢ ܥܒܕܐ ܕܢܡܘܤܐ ܐܠܐ ܒܗܝܡܢܘܬܐ ܕܝܫܘܥ ܡܫܝܚܐ ܐܦ ܚܢܢ ܒܗ ܒܝܫܘܥ ܡܫܝܚܐ ܗܝܡܢܢ ܕܡܢ ܗܝܡܢܘܬܗ ܕܡܫܝܚܐ ܢܙܕܕܩ ܘܠܐ ܡܢ ܥܒܕܐ ܕܢܡܘܤܐ ܡܛܠ ܕܡܢ ܥܒܕܐ ܕܢܡܘܤܐ ܠܐ ܡܙܕܕܩ ܟܠ ܒܤܪ 16
ma anyị maara na a dịghị agụ mmadụ ọbụla dị ka onye ezi omume site nʼọrụ nke iwu kama ọ bụ naanị site nʼokwukwe na Jisọs Kraịst. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst ka a gụọ anyị na ndị ezi omume, site nʼokwukwe anyị kwere na Kraịst, ọ bụghị nʼihi na anyị rụrụ ọrụ nke iwu. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a ga-agụnye ka onye ezi omume nʼihi na ọ rụrụ ọrụ nke iwu.
ܐܢ ܕܝܢ ܟܕ ܒܥܝܢܢ ܕܢܙܕܕܩ ܒܡܫܝܚܐ ܐܫܬܟܚܢ ܠܢ ܐܦ ܚܢܢ ܚܛܝܐ ܡܕܝܢ ܝܫܘܥ ܡܫܝܚܐ ܡܫܡܫܢܐ ܗܘ ܕܚܛܝܬܐ ܚܤ 17
Ma ọ bụrụ, na mgbe anyị na-achọ ka a gụọ anyị dị ka ndị ezi omume nʼime Kraịst, anyị onwe anyị a bụrụ ndị achọpụtara dịka ndị mmehie. Nke a, ọ pụtara na Kraịst na-akwado mmehie? Mba!
ܐܢ ܓܝܪ ܠܐܝܠܝܢ ܕܤܬܪܬ ܬܘܒ ܠܗܝܢ ܒܢܐ ܐܢܐ ܚܘܝܬ ܥܠ ܢܦܫܝ ܕܥܒܪ ܥܠ ܦܘܩܕܢܐ ܐܢܐ 18
Kama, ọ bụrụ na m ewugharịa ihe ndị ahụ m buru ụzọ mebie, ana m egosi na m bụ onye na-emebi iwu.
ܐܢܐ ܓܝܪ ܒܢܡܘܤܐ ܠܢܡܘܤܐ ܡܝܬܬ ܕܠܐܠܗܐ ܐܚܐ 19
Nʼihi na-esitere m nʼaka iwu nwụọ nʼebe iwu dị, ka m nwee ike dị ndụ nʼebe Chineke nọ. Akpọgidela mụ na Kraịst nʼobe.
ܘܥܡ ܡܫܝܚܐ ܙܩܝܦ ܐܢܐ ܘܡܟܝܠ ܠܐ ܗܘܐ ܐܢܐ ܚܝ ܐܢܐ ܐܠܐ ܚܝ ܒܝ ܡܫܝܚܐ ܘܗܢܐ ܕܗܫܐ ܚܝ ܐܢܐ ܒܒܤܪ ܒܗܝܡܢܘܬܐ ܗܘ ܕܒܪܗ ܕܐܠܗܐ ܚܝ ܐܢܐ ܗܘ ܕܐܚܒܢ ܘܝܗܒ ܢܦܫܗ ܚܠܦܝܢ 20
Ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nʼime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a nʼanụ ahụ m bụ nke m na-adị nʼihi okwukwe m nwere nʼime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nʼanya, ma werekwa onwe ya nye nʼihi m.
ܠܐ ܛܠܡ ܐܢܐ ܛܝܒܘܬܗ ܕܐܠܗܐ ܐܢ ܓܝܪ ܒܝܕ ܢܡܘܤܐ ܗܝ ܙܕܝܩܘܬܐ ܡܫܝܚܐ ܡܓܢ ܡܝܬ 21
Anaghị m akpọ amara Chineke ihe na-enweghị isi. Nʼihi na a sị na a pụrụ ịgụ mmadụ dị ka onye ezi omume site nʼidebe iwu, mgbe ahụ ọnwụ Kraịst nwụrụ abaghị uru.

< ܓܠܛܝ̈ܐ 2 >