< ܐ-ܛܝܡܬܐܘܣ 2 >

ܒܥܐ ܐܢܐ ܗܟܝܠ ܡܢܟ ܕܡܢ ܩܕܡ ܟܠܡܕܡ ܒܥܘܬܐ ܬܗܘܐ ܡܩܪܒ ܠܐܠܗܐ ܘܨܠܘܬܐ ܘܬܚܢܢܬܐ ܘܬܘܕܝܬܐ ܚܠܦ ܟܠܗܘܢ ܒܢܝܢܫܐ 1
Na mbụ, ana m arịọ ka e kpee ekpere, kwuchite ọnụ ndị ọzọ nʼekpere, ma nye ekele nʼisi mmadụ niile,
ܚܠܦ ܡܠܟܐ ܘܪܘܪܒܢܐ ܕܥܘܡܪܐ ܫܠܝܐ ܘܢܝܚܐ ܢܥܡܪ ܒܟܠܗ ܕܚܠܬ ܐܠܗܐ ܘܕܟܝܘܬܐ 2
kpee ekpere maka ndị eze niile, na ndị niile nọ nʼọnọdụ ọchịchị, ka anyị nwee ike bie ndụ udo na nke nsogbu na-adịghị, nʼime ịsọpụrụ Chineke dị ka ọ chọrọ.
ܗܕܐ ܓܝܪ ܫܦܝܪܐ ܘܡܩܒܠܐ ܩܕܡ ܐܠܗܐ ܡܚܝܢܢ 3
Nke a bụkwa ihe dị mma na ihe na-atọ Chineke Onye nzọpụta anyị ezi ụtọ.
ܗܘ ܕܨܒܐ ܕܟܠܗܘܢ ܒܢܝܢܫܐ ܢܚܘܢ ܘܢܬܦܢܘܢ ܠܝܕܥܬܐ ܕܫܪܪܐ 4
Onye chọrọ ka a zọpụta mmadụ niile, ka ha niile bịaruo na mmazu nke eziokwu.
ܚܕ ܗܘ ܓܝܪ ܐܠܗܐ ܘܚܕ ܗܘ ܡܨܥܝܐ ܕܐܠܗܐ ܘܕܒܢܝܢܫܐ ܒܪܢܫܐ ܝܫܘܥ ܡܫܝܚܐ 5
Nʼihi na ọ bụ naanị otu Chineke dị. Ọ bụkwa naanị otu onye ogbugbo dị nʼetiti Chineke na mmadụ. Kraịst Jisọs, onye ya onwe ya bụ mmadụ.
ܗܘ ܕܝܗܒ ܢܦܫܗ ܦܘܪܩܢܐ ܚܠܦ ܟܠ ܐܢܫ ܤܗܕܘܬܐ ܕܐܬܬ ܒܙܒܢܗ 6
Onye weere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nʼihi mmadụ niile, nke bụ ịgba ama a na-enye nʼoge ya.
ܗܝ ܕܐܢܐ ܐܬܤܝܡܬ ܟܪܘܙܗ ܘܫܠܝܚܗ ܩܘܫܬܐ ܐܡܪ ܐܢܐ ܘܠܐ ܡܕܓܠ ܐܢܐ ܕܗܘܝܬ ܡܠܦܢܐ ܕܥܡܡܐ ܒܗܝܡܢܘܬܐ ܕܫܪܪܐ 7
Nʼihi nke a, a họpụtara m ka m bụrụ ọnụ na-ekwuru ọha nakwa onyeozi, na onye nkuzi nye ndị mba ọzọ banyere ezi okwukwe ahụ. Eziokwu ka m na-ekwu, anaghị m agha ụgha.
ܨܒܐ ܐܢܐ ܗܟܝܠ ܕܗܘܘ ܡܨܠܝܢ ܓܒܪܐ ܒܟܠ ܕܘܟܐ ܟܕ ܡܪܝܡܝܢ ܐܝܕܝܗܘܢ ܕܟܝܐܝܬ ܕܠܐ ܪܘܓܙܐ ܘܕܠܐ ܡܚܫܒܬܐ 8
Nʼihi nke a, achọrọ m ka ndị ikom, nʼebe niile na-achili aka dị nsọ elu nʼekpere, na-ebughị iwe nʼobi, na-arụkwaghị ụka.
ܗܟܢܐ ܐܦ ܢܫܐ ܒܐܤܟܡܐ ܢܟܦܐ ܕܠܒܘܫܐ ܒܬܚܡܨܬܐ ܘܒܢܟܦܘܬܐ ܢܗܘܐ ܬܨܒܝܬܗܝܢ ܠܐ ܒܓܕܘܠܐ ܘܒܕܗܒܐ ܐܘ ܒܡܪܓܢܝܬܐ ܐܘ ܒܢܚܬܐ ܫܦܝܪܐ 9
Achọkwara m ka ndị inyom kwadoo onwe ha nʼụzọ kwesiri ekwesi, ka ha jiri nsọpụrụ na uche zuruoke chọọ onwe ha mma. Ọ bụghị isi a kpara akpa, ma ọ bụkwanụ ngwa mma nke ọlaedo maọbụ pieal, maọbụ uwe dị oke ọnụahịa ha na-eyi.
ܐܠܐ ܒܥܒܕܐ ܛܒܐ ܐܝܟܢܐ ܕܝܐܐ ܠܢܫܐ ܕܡܫܬܘܕܝܢ ܕܚܠܬ ܐܠܗܐ 10
Kama site nʼezi ọrụ ọma ha nke kwesiri ndị inyom na-ekwupụta na ha na-ekpere Chineke.
ܐܢܬܬܐ ܒܫܠܝܐ ܗܘܬ ܝܠܦܐ ܒܟܠ ܫܘܥܒܕ 11
Nwanyị kwesikwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe.
ܠܐܢܬܬܐ ܓܝܪ ܠܡܠܦܘ ܠܐ ܡܦܤ ܐܢܐ ܘܠܐ ܠܡܡܪܚܘ ܥܠ ܓܒܪܐ ܐܠܐ ܬܗܘܐ ܒܫܠܝܐ 12
Ekwenyeghị m ka nwanyị zie ihe, maọbụ ka ọ bụrụ onyeisi nʼebe ndị nwoke nọ. Ha kwesiri ịnọ nwayọọ mgbe ọbụla unu zukọrọ.
ܐܕܡ ܓܝܪ ܐܬܓܒܠ ܠܘܩܕܡ ܘܗܝܕܝܢ ܚܘܐ 13
Ọ bụ nʼihi na e buru ụzọ kee Adam tupu e kee Iiv.
ܘܐܕܡ ܠܐ ܛܥܐ ܐܢܬܬܐ ܕܝܢ ܛܥܬ ܘܥܒܪܬ ܥܠ ܦܘܩܕܢܐ 14
Ọ bụkwaghị Adam ka a ghọgburu, kama ọ bụ nwanyị ka a ghọgburu mee ka ọ bụrụ onye mmebi iwu.
ܚܝܐ ܕܝܢ ܒܝܕ ܝܠܕܝܗ ܐܢ ܢܩܘܘܢ ܒܗܝܡܢܘܬܐ ܘܒܚܘܒܐ ܘܒܩܕܝܫܘܬܐ ܘܒܢܟܦܘܬܐ 15
Ma a ga-azọpụta ha site nʼọmụmụ nwa ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ebi ndụ okwukwe na ịhụnanya, na ịdị nsọ, na nke uche zuruoke.

< ܐ-ܛܝܡܬܐܘܣ 2 >