< 1 Wakorintho 15 >

1 Sasa ninawakumbusha, akina kaka na akina dada, juu ya injili niliyowahubiria, ambayo mliipokea na kusimama kwayo.
Ụmụnna m, ugbu a achọrọ m ime ka unu cheta oziọma ahụ m ziri unu mgbe m buru ụzọ bịakwute unu, nke unu kweere na ya, na nke unu guzosikwara ike nʼelu ya.
2 Ni katika injili hii mmeokolewa, kama mkilishika imara neno nililowahubiri ninyi, isipokuwa mliamini bure.
E si nʼoziọma a zọpụta unu, ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile jidesie ihe unu kweere na ya ike. Inwe okwukwe nʼihe ọzọ dị iche agaghị enyere unu aka.
3 Kama kwanza nilivyo ipokea kwa umuhimu niliileta kwenu kama ilivyo: kwamba kutokana na maandiko, Kristo alikufa kwa ajili ya dhambi zetu,
Ihe m nyefere unu nʼaka na mbụ bụ ozi ahụ m natara ị debe, nke dị oke mkpa, na Kraịst nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie anyị, dịka akwụkwọ nsọ kwuru na ọ ga-anwụ.
4 kutokana na maandiko alizikwa, na kwamba alifufuka siku ya tatu.
Na e liri ya, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ, dịka akwụkwọ nsọ kwukwara na ọ ga-eme.
5 Na kwamba alimtokea Kefa, kisha kwa wale kumi na wawili.
O gosiri Sefas onwe ya, emesịa, ndị ozi iri na abụọ ahụ hụkwara ya.
6 Kisha aliwatokea kwa wakati mmoja akina kaka na akina dada zaidi ya mia tano. Wengi wao bado wako hai, lakini baadhi yao wamelala usingizi.
Emesịakwa, o gosiri ihe karịrị narị mmadụ ise nʼime ụmụnna onwe ya, nʼotu mgbe, ọtụtụ nʼime ndị ahụ ka nọ ndụ taa, ọ bụ ezie na ụfọdụ nʼime ha adaala nʼụra ọnwụ.
7 Kisha alimtokea Yakobo, kisha mitume wote.
Emesịa, Jemis hụrụ ya; o mekwara ka ndị ozi niile hụ ya.
8 Mwisho wa yote, alinitokea mimi, kama vile kwa mtoto aliye zaliwa katika wakati usio sahihi.
Nʼikpeazụ, mụ onwe m hụkwara ya, dịka a ga-asị na m bụ nwa a na-amụghị nʼoge.
9 Kwa kuwa mimi ni mdogo kati ya mitume. Sistahili kuitwa mtume, kwa sababu nililitesa kanisa la Mungu.
Nʼihi na ọ bụ m kachasị nta nʼime ndị ozi. O kwesikwaghị ka a akpọọ m onyeozi ya nʼihi na alụsoro m nzukọ Chineke ọgụ nke ukwuu.
10 Lakini kwa neema ya Mungu nipo kama nilivyo, na neema yake kwangu haikuwa bure. Badala yake, nilifanya bidii kuliko wote. Lakini haikuwa mimi, bali neema ya Mungu iliyo ndani yangu.
Ma site nʼamara nke Chineke, abụ m ihe m bụ. Ọ pụtakwara na amara ya nʼebe m nọ abụghị ihe efu. Kama arụsịrị m ọrụ ike karịchasịa ndị ozi niile. Ma nʼezie, ọ bụghị m na-arụ ọrụ a, kama ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ ya nʼime m.
11 Kwa hiyo kama ni mimi au wao, tuna hubiri hivyo na tunaamini hivyo.
Ma ọ bụ m, maọbụ ndị ọzọ, otu a ka anyị siri kwusaa, otu a ka unu sikwa kwere.
12 Sasa kama Kristo alihubiriwa kama aliyefufuka kwa wafu, iweje baadhi yenu mseme hakuna ufufuo wa wafu?
Ma ọ bụrụ na a na-ekwusa na Kraịst si nʼọnwụ bilie, gịnị mere ụfọdụ unu ji na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ apụghị isi nʼọnwụ bilie ọzọ.
13 Lakini kama hakuna ufufuo wa wafu, basi hata Kristo pia hakufufuka.
Ọ bụrụ na ndị nwụrụ anwụ a pụghị i si nʼọnwụ bilie, nke a pụtara na e meghị ka Kraịst site nʼọnwụ bilie.
14 Na kama Kristo hakufufuka, hivyo mahubiri yetu ni bure, na imani yenu ni bure.
Ọ bụrụkwa na e meghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, ihe anyị na-ezisa bụ ihe efu, okwukwe unu nwere bụkwa ihe efu.
15 Na tumepatikana kuwa mashahidi wa uongo kumuhusu Mungu, kwa sababu tulimshushuhudia Mungu kinyume, kusema alimfufua Kristo, wakati hakumfufua.
Ma karịa nke a, a na-ahụta anyị ka ndị ama ụgha nke Chineke, nʼihi na anyị gbara ama banyere Chineke, na-asị na o mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, bụ onye ọ na-emeghị ka o si nʼọnwụ bilie ma ọ bụrụ na-emeghị ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ.
16 Kama ikiwa wafu hawafufuliwi, Yesu pia hakufufuliwa.
Nʼihi na, ọ bụrụ na a pụghị ime ka ndị nwụrụ anwụ bilie dị ndụ ọzọ, emekwaghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie.
17 Na kama Kristo hakufufuliwa, imani yenu ni bure na bado mko kwenye dhambi zenu.
Ma ọ bụrụ na-emeghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, okwukwe unu bụ ihe efu, unu ka ga-anwụ na mmehie unu.
18 Hivyo hata wale waliokufa katika Kristo pia wameangamia.
Mgbe ahụ ndị nwụrụ anwụ nʼime Kraịst lara nʼiyi.
19 Ikiwa kwa maisha haya peke yake tunaujasiri kwa wakati ujao ndani ya Kristo, watu wote, sisi niwakuhurumiwa zaidi ya watu wote.
Ọ bụrụkwa na olileanya anyị nʼime Kraịst gwụrụ naanị na ndụ anyị nʼime ụwa a, anyị bụ ndị e kwesiri ka e mere ebere.
20 Lakini sasa Kristo amefufuka kutoka kwa wafu, matunda ya kwanza ya wale waliokufa.
Ma e mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie nʼezie, onye mbụ nʼetiti ndị niile nwụrụ anwụ.
21 Kwa kuwa kifo kilikuja kupitia mwanadamu, pia kupitia mwanadamu ufufuo wa wafu.
Nʼihi na dịka ọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa, otu a kwa ka mbilite nʼọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa.
22 Kwa kuwa kama katika Adam wote wanakufa, hivyo pia katika Kristo wote watafanywa hai.
Dịka mmadụ niile si anwụ site nʼaka Adam, otu a kwa ka mmadụ niile ga-esi dịkwa ndụ nʼime Kraịst.
23 Lakini kila moja katika mpango wake: Kristo, matunda ya kwanza, na kisha wale walio wa Kristo watafanywa hai wakati wa kuja kwake.
Onye ọbụla ga-ebili nʼusoro nke ya, Kraịst mkpụrụ mbụ si nʼọnwụ bilie. Mgbe ọ lọghachiri, ndị niile bụ ndị nke Kraịst ga-esote.
24 Ndipo utakuwa mwisho, pale Kristo atakapo kabidhi ufalme kwa Mungu Baba. Hii ni pale atakapo komesha utawala wote na mamlaka yote na nguvu.
Mgbe nke a gasịrị, ọgwụgwụ ihe niile ga-abịa, mgbe ọ ga-enyefe alaeze nʼaka Chineke bụ Nna, nʼihi na o meriela ịchị isi niile, na ikike niile na ike niile.
25 Kwa kuwa lazima atawale mpaka atakapoweka maadui zake wote chini ya nyayo zake.
Nʼihi na ọ ga-abụ eze tutu ruo mgbe ọ lụgburu ndị iro ya niile, doo ha nʼokpuru ụkwụ ya.
26 Adui wa mwisho kuharibiwa ni kifo.
Onye iro ikpeazụ a ga-emeri bụ ọnwụ.
27 Kwa kuwa “ameweka kila kitu chini ya nyayo zake.” Lakini inaposema “ameweka kila kitu,” ni wazi kwamba hii haihusishi wale walioweka kila kitu chini yake mwenyewe.
Nʼihi na “O doola ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Ma mgbe ọbụla asịrị, “e doola ihe niile” nʼokpuru ụkwụ ya, o doro anya na Chineke agụnyeghị onwe ya, nʼihi na ọ bụ ya tinyere ihe niile nʼokpuru Kraịst.
28 Wakati vitu vyote vimewekwa chini yake, kisha Mwana mwenyewe atawekwa chini kwake Yeye ambaye aliviweka vitu vyote chini yake. Hii itatokea ili kwamba Mungu Baba awe yote katika vyote.
Mgbe e merela ka ihe niile nọrọ nʼokpuru ya, mgbe ahụ, Ọkpara ya nʼonwe ya, ga-edobe onwe ya nʼokpuru onye ahụ dobere ihe niile nʼokpuru ya, ka Chineke bụrụ onye na-achị ihe niile.
29 Au pia watafanya nini wale waliobatizwa kwa ajili ya wafu? Kama wafu hawafufuliwi kabisa, kwa nini tena wanabatizwa kwa ajili yao?
Ma ọ bụghị otu a, gịnị mere ụfọdụ ji eme ndị otu ha baptizim nʼọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? Ọ bụrụ na e meghị ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie ma ọlị, nʼihi gịnị ka a na-eme mmadụ ndị a baptizim nʼọnọdụ ha?
30 Na kwa nini tuko katika hatari kila saa?
Gịnị mere anyị ji nọrọ nʼize ndụ nʼoge awa ọbụla?
31 Kaka na dada zangu, kupitia kujisifu kwangu katika ninyi, ambayo ninayo katika Kristo Yesu Bwana wetu, natangaza hivi: nakufa kila siku.
Nʼịgwa unu eziokwu, ụmụnna m, ana m ezute ọnwụ kwa ụbọchị. Ihe m ji kwupụta nke a bụ nʼihi ịnya isi nke m ji unu anya nʼime Jisọs Kraịst, Onyenwe anyị.
32 Inanifaidia nini, katika mtazamo wa wanadamu, kama nilipigana na wanyama wakali huko Efeso, kama wafu hawafufuliwi? “Acha basi tule na kunywa, kwa kuwa kesho tunakufa.”
Ọ bụrụ na ndụ anyị na-agwụ nʼụwa a, dịka ndị mmadụ na-ekwu, gịnị bụkwanụ uru m nwere nʼihi ọgụ m na-alụso anụ ọhịa, bụ ndị ikom Efesọs? Ọ bụrụ na a gaghị eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ, nʼihi na echi anyị ga-anwụ.”
33 Msidanganywe: “Makundi mabaya huharibu tabia njema.
Unu ekwela ka e duhie unu. Nʼihi na mkparịkọta agwa ọjọọ na-emebi ezi agwa.
34 “Muwe na kiasi! muishi katika haki! msiendelee kutenda dhambi. Kwa kuwa baadhi yenu hamna maarifa ya Mungu. Nasema hivi kwa aibu yenu.
Sitenụ na ndụ enweghị nghọta unu lọghachita dịka unu kwesiri, unu emehiekwala ọzọ. Nʼihi na-enwere ụfọdụ bụ ndị na-amaghị Chineke. Ana m ekwu nke a ka ihere mee unu.
35 Lakini mtu mwingine atasema, “Jinsi gani wafu wanafufuliwa? Nao watakuja na aina gani ya mwili?”
Ma ụfọdụ ga-ajụ, “Olee otu a ga-esi mee ka onye nwụrụ anwụ bilie? Olee ụdị ahụ ha ga-enwe mgbe ha ga-apụta?”
36 Wewe ni mjinga sana! Kile ulichopanda hakiwezi kuanza kukua isipokuwa kimekufa.
Onye nzuzu! Mkpụrụ ọka i tinyere nʼala agaghị epu ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ nwụọ.
37 Na kile unachopanda sio mwili ambao utakuwa, bali ni mbegu iliyochipua. Inaweza kuwa ngano au kitu kingine.
Mgbe ị na-agha mkpụrụ, ọ bụghị anụ ahụ nke ga-apụta ka ị na-agha, kama ọ bụ naanị mkpụrụ nkịtị, eleghị anya mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ mkpụrụ ọzọ.
38 Lakini Mungu ataipa mwili kama apendavyo, na katika kila mbengu mwili wake mwenyewe.
Ma Chineke na-enye ya ahụ dịka o si chọọ. Ọ na-enyekwa mkpụrụ ọbụla nʼime mkpụrụ niile ahụ nke kwesiri ya.
39 Miili yote haifanani. Isipokuwa, kuna mwili mmoja wa wanadamu, na mwili mwingine wa wanyama, na wili mwingine wa ndege, na mwingine kwa ajili ya samaki.
Anụ ahụ niile abụghị otu, mmadụ nwere anụ ahụ dị iche, anụ ọhịa nwere ụdị anụ ahụ nke ha. Anụ ufe nwere anụ ahụ ha, azụ nwekwara nke ha.
40 Pia kuna miili ya mbinguni na miili ya duniani. Lakini utukufu wa miili ya mbinguni ni aina moja na utukufu wa duniani ni mwingine.
Ahụ nke eluigwe na ahụ nke ụwa dịkwa. Ma ịma mma na ebube nke ahụ nke eluigwe bụ otu, ịma mma na ebube nke ahụ nke ụwa dịkwa iche.
41 Kuna utukufu mmoja wa jua, na utukufu mwingine wa mwezi, na utukufu mwingine wa nyota. Kwa kuwa nyota moja inatofautiana na nyota nyingine katika utukufu.
Anyanwụ nwere ebube nke ya, ọnwa nwekwa nke ya, kpakpando nwekwara ebube nke ya. Kpakpando dịkwa iche site nʼibe ya nʼịma mma na ebube.
42 Hivyo ndivyo ulivyo pia ufufuo wa wafu. Kinacho pandwa kinaharibika, na kinacho ota hakiharibiki.
Otu a ka ọ dị nʼebe mbilite nʼọnwụ ndị nwụrụ anwụ dị. Mgbe e liri anụ ahụ anyị, ihe nwụrụ anwụ na nke pụrụ ire ure ka ọ bụ, ma mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ.
43 Kimepandwa katika matumizi ya kawaida, kinaoteshwa katika utukufu. Kimepandwa katika udhaifu, kinaoteshwa katika nguvu.
A na-eli ahụ onye nwụrụ anwụ dịka ihe enweghị ugwu, ma a na-eme ka o si nʼọnwụ bilie nʼebube. A na-eli onye nwụrụ anwụ nʼadịghị ike, ma a na-eme ka o si nʼọnwụ bilie nʼịdị ike.
44 Kimepandwa katika mwili wa asili, kinaoteshwa katika mwili wa kiroho. Kama kuna mwili wa asili, kuna mwili wa kiroho pia.
A na-eli onye nwụrụ anwụ dịka anụ ahụ nkịtị, ma a na-eme ka o jiri ahụ nke mmụọ kulite. Ọ bụrụ na e nwere anụ ahụ nkịtị, e nwekwara ahụ nke mmụọ.
45 Hivyo pia imeandikwa, “Mtu wa kwanza Adamu alifanyika roho inayo ishi.” Adamu wa mwisho alifanyika roho itoayo uhai.
E dere ya, “Mmadụ mbụ, bụ Adam, ghọrọ mkpụrụobi dị ndụ, Adam nke ikpeazụ bụ mmụọ na-enye ndụ.”
46 Lakini wa kiroho hakuja kwanza bali wa asili, na kisha wa kiroho.
Ma mmụọ e bughị ụzọ, kama ọ bụ ahụ nkịtị, ma mmụọ bịara nʼikpeazụ.
47 Mtu wa kwanza ni wa dunia, alitengenezwa kwa mavumbi. Mtu wa pili anatoka mbinguni.
Mmadụ nke nwoke sitere nʼala, ejikwa aja kpụọ ya; mmadụ nke abụọ si nʼeluigwe bịa.
48 Kama vile yule aliyetengenezwa kwa mavumbi, hivyo pia wale waliotengenezwa kwa mavumbi. Kama vile mtu wa mbinguni alivyo, hivyo pia wale wa mbinguni.
Dị ka mmadụ nke mbụ ahụ e jiri aja kpụọ dị, otu a ka ndị niile si nʼaja pụta dịkwa. Ma dị ka mmadụ nke eluigwe ahụ dị, otu a ka ndị niile bụ ụmụ eluigwe dịkwa.
49 Kama ambavyo tumebeba mfano wa mtu wa mavumbi, tutabeba pia mfano wa mtu wa mbinguni.
Dịka anyị niile yikwasịrị onyinyo nke nwoke e jiri aja kpụọ, otu ahụkwa ka anyị ga-esi yikwasị onyinyo nke nwoke nke eluigwe.
50 Sasa nawaambia, kaka na dada zangu, kwamba mwili na damu haviwezi kuurithi ufalme wa Mungu. Wala wakuharibika kurithi wakutoharibika.
Ihe m na-ekwu, ụmụnna m, bụ na anụ ahụ na ọbara enweghị ike iketa alaeze Chineke. Ihe na-ere ure agaghịkwa eketa ereghị ure.
51 Tazama! Nawaambia ninyi siri ya kweli: Hatutakufa wote, bali wote tutabadilishwa.
Ma geenụ ntị ka m gwa unu ihe omimi a! Ọ bụghị anyị niile na-aga ịnwụ, kama, a ga-enye anyị anụ ahụ ọhụrụ nke pụrụ iche.
52 Tutabadilishwa katika wakati, katika kufumba na kufumbua kwa jicho, katika tarumbeta ya mwisho. Kwa kuwa tarumbeta italia, na wafu watafufuliwa na hali ya kutoharibika, na tutabadilishwa.
Nʼotu mgbe, nʼotu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ike ikpeazụ. Nʼihi na opi ga-ada, a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilite na-ereghị ure. A ga-agbanwekwa anyị.
53 Kwani huu wa kuharibika lazima uvae wa kutoharibika, na huu wa kufa lazima uvae wa kutokufa.
Nʼihi na a ghaghị ịgbanwe anụ ahụ anyị a nke na-anwụ anwụ, nyekwa anyị ahụ nke na-agaghị anwụ ọzọ.
54 Lakini wakati huu wa kuharibika ukivikwa wa kutokuharibika, na huu wa kufa ukivaa wa kutokufa, ndipo utakuja msemo ambao umeandikwa, “Kifo kimemezwa katika ushindi.”
Mgbe ahụ nke a pụrụ ire ure ga-eyikwasị ereghị ure, nke a pụrụ ịnwụ anwụ ga-eyikwasị anwụghị anwụ. Mgbe ahụ, okwu ahụ e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-emezu, okwu ahụ sịrị, “Elomiela ọnwụ, meriekwa ike ya niile.”
55 “Kifo, ushindi wako uko wapi? Kifo, uko wapi uchungu wako?” (Hadēs g86)
“Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe ụfụ gị dị?” (Hadēs g86)
56 Uchungu wa kifo ni dhambi, na nguvu ya dhambi ni sheria.
Nʼihi na ihe ahụ ọnwụ ji agbata mmadụ bụ mmehie, ma ihe na-enye mmehie ike bụ iwu.
57 Lakini shukurani kwa Mungu, atupaye sisi ushindi kupitia Bwana wetu Yesu Kristo!
Ka ekele dịrị Chineke onye na-enye anyị mmeri site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
58 Kwa hiyo, wapendwa kaka na dada zangu, iweni imara na msitikisike. Daima itendeni kazi ya Bwana, kwa sababu mnajua kuwa kazi yenu katika Bwana siyo bure.
Ya mere, ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya, kwụsienụ ike, bụrụnụ akwaa akwụrụ. Nọgidenụ nʼọrụ Onyenwe anyị mgbe niile, ebe unu maara na ọrụ unu na-arụ nʼime Onyenwe anyị abụghị ihe efu.

< 1 Wakorintho 15 >