< યોહનઃ 3 >

1 નિકદિમનામા યિહૂદીયાનામ્ અધિપતિઃ ફિરૂશી ક્ષણદાયાં
O nwere otu nwoke onyeisi ndị Juu nke so nʼotu ndị Farisii aha ya bụ Nikọdimọs.
2 યીશૌરભ્યર્ણમ્ આવ્રજ્ય વ્યાહાર્ષીત્, હે ગુરો ભવાન્ ઈશ્વરાદ્ આગત્ એક ઉપદેષ્ટા, એતદ્ અસ્માભિર્જ્ઞાયતે; યતો ભવતા યાન્યાશ્ચર્ય્યકર્મ્માણિ ક્રિયન્તે પરમેશ્વરસ્ય સાહાય્યં વિના કેનાપિ તત્તત્કર્મ્માણિ કર્ત્તું ન શક્યન્તે|
Ọ bịakwutere ya nʼabalị sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye ozizi sitere na Chineke, nʼihi na o nweghị onye ọbụla pụrụ ịrụ ọrụ ebube dị otu a ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.”
3 તદા યીશુરુત્તરં દત્તવાન્ તવાહં યથાર્થતરં વ્યાહરામિ પુનર્જન્મનિ ન સતિ કોપિ માનવ ઈશ્વરસ્ય રાજ્યં દ્રષ્ટું ન શક્નોતિ|
Jisọs zara sị ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke anya.”
4 તતો નિકદીમઃ પ્રત્યવોચત્ મનુજો વૃદ્ધો ભૂત્વા કથં જનિષ્યતે? સ કિં પુન ર્માતૃર્જઠરં પ્રવિશ્ય જનિતું શક્નોતિ?
Nikọdimọs sịrị ya, “Olee otu a ga-esi mụgharịa mmadụ mgbe o mere okenye? Ọ ga-aba nʼafọ nne ya nke ugboro abụọ?”
5 યીશુરવાદીદ્ યથાર્થતરમ્ અહં કથયામિ મનુજે તોયાત્મભ્યાં પુન ર્ન જાતે સ ઈશ્વરસ્ય રાજ્યં પ્રવેષ્ટું ન શક્નોતિ|
Ma Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, o nweghị ike ịba nʼalaeze Chineke.
6 માંસાદ્ યત્ જાયતે તન્ માંસમેવ તથાત્મનો યો જાયતે સ આત્મૈવ|
Ihe e si nʼanụ ahụ mụọ bụ anụ ahụ, ma ihe a mụrụ site na Mmụọ bụ mmụọ.
7 યુષ્માભિઃ પુન ર્જનિતવ્યં મમૈતસ્યાં કથાયામ્ આશ્ચર્યં મા મંસ્થાઃ|
Ya ejula gị anya na m sịrị gị, ‘Agaghị ịmụ unu ọzọ.’
8 સદાગતિર્યાં દિશમિચ્છતિ તસ્યામેવ દિશિ વાતિ, ત્વં તસ્ય સ્વનં શુણોષિ કિન્તુ સ કુત આયાતિ કુત્ર યાતિ વા કિમપિ ન જાનાસિ તદ્વાદ્ આત્મનઃ સકાશાત્ સર્વ્વેષાં મનુજાનાં જન્મ ભવતિ|
Ifufe na-efe nʼebe ọbụla masịrị ya. I nwere ike nụ ụzụ ya ma ịmataghị ebe o si abịa maọbụ ebe ọ na-aga. Otu a ka ọ dịkwara onye ọbụla a mụrụ site na Mmụọ.”
9 તદા નિકદીમઃ પૃષ્ટવાન્ એતત્ કથં ભવિતું શક્નોતિ?
Nikọdimọs zara sị ya, “Olee otu ihe ndị a ga-esi mee?”
10 યીશુઃ પ્રત્યક્તવાન્ ત્વમિસ્રાયેલો ગુરુર્ભૂત્વાપિ કિમેતાં કથાં ન વેત્સિ?
Jisọs zara sị ya, “Ị bụ onye ozizi ndị Izrel, ma ị ghọtaghị ihe ndị a?
11 તુભ્યં યથાર્થં કથયામિ, વયં યદ્ વિદ્મસ્તદ્ વચ્મઃ યંચ્ચ પશ્યામસ્તસ્યૈવ સાક્ષ્યં દદ્મઃ કિન્તુ યુષ્માભિરસ્માકં સાક્ષિત્વં ન ગૃહ્યતે|
Nʼezie, nʼezie agwa m unu. Anyị na-ekwu banyere ihe anyị maara, na-akọwapụtakwa ihe anyị hụrụ, ma unu onwe unu adịghị anabata akaebe anyị.
12 એતસ્ય સંસારસ્ય કથાયાં કથિતાયાં યદિ યૂયં ન વિશ્વસિથ તર્હિ સ્વર્ગીયાયાં કથાયાં કથં વિશ્વસિષ્યથ?
Ekwuola m banyere ihe dị nʼụwa ma unu ekweghị ya, oleekwanụ otu unu ga-esi kwere, ma ọ bụrụ na mụ agwa unu banyere ihe ndị dị nʼeluigwe?
13 યઃ સ્વર્ગેઽસ્તિ યં ચ સ્વર્ગાદ્ અવારોહત્ તં માનવતનયં વિના કોપિ સ્વર્ગં નારોહત્|
O nwebeghị onye ọbụla rigooro nʼeluigwe ewezuga Nwa nke Mmadụ bụ onye siri nʼeluigwe rịdata.
14 અપરઞ્ચ મૂસા યથા પ્રાન્તરે સર્પં પ્રોત્થાપિતવાન્ મનુષ્યપુત્રોઽપિ તથૈવોત્થાપિતવ્યઃ;
Dị ka Mosis weliri agwọ elu nʼime ọzara, otu a ka a ga-ewelikwa Nwa nke Mmadụ elu.
15 તસ્માદ્ યઃ કશ્ચિત્ તસ્મિન્ વિશ્વસિષ્યતિ સોઽવિનાશ્યઃ સન્ અનન્તાયુઃ પ્રાપ્સ્યતિ| (aiōnios g166)
Ka onye ọbụla kwere na ya nwee ndụ ebighị ebi.” (aiōnios g166)
16 ઈશ્વર ઇત્થં જગદદયત યત્ સ્વમદ્વિતીયં તનયં પ્રાદદાત્ તતો યઃ કશ્ચિત્ તસ્મિન્ વિશ્વસિષ્યતિ સોઽવિનાશ્યઃ સન્ અનન્તાયુઃ પ્રાપ્સ્યતિ| (aiōnios g166)
Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
17 ઈશ્વરો જગતો લોકાન્ દણ્ડયિતું સ્વપુત્રં ન પ્રેષ્ય તાન્ પરિત્રાતું પ્રેષિતવાન્|
Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa.
18 અતએવ યઃ કશ્ચિત્ તસ્મિન્ વિશ્વસિતિ સ દણ્ડાર્હો ન ભવતિ કિન્તુ યઃ કશ્ચિત્ તસ્મિન્ ન વિશ્વસિતિ સ ઇદાનીમેવ દણ્ડાર્હો ભવતિ, યતઃ સ ઈશ્વરસ્યાદ્વિતીયપુત્રસ્ય નામનિ પ્રત્યયં ન કરોતિ|
Ikpe amaghị onye ọbụla kwere na ya, ma onye ọbụla na-ekweghị aghọọlarị onye ikpe mara, nʼihi na o kweghị nʼaha Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.
19 જગતો મધ્યે જ્યોતિઃ પ્રાકાશત કિન્તુ મનુષ્યાણાં કર્મ્મણાં દૃષ્ટત્વાત્ તે જ્યોતિષોપિ તિમિરે પ્રીયન્તે એતદેવ દણ્ડસ્ય કારણાં ભવતિ|
Nke a bụ mkpebi ikpe ahụ; na Ìhè abịala nʼụwa, ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị nʼanya kama ìhè ahụ, nʼihi na ọrụ ha jọrọ njọ.
20 યઃ કુકર્મ્મ કરોતિ તસ્યાચારસ્ય દૃષ્ટત્વાત્ સ જ્યોતિરૄતીયિત્વા તન્નિકટં નાયાતિ;
Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwute ìhè ahụ, ka a ghara ime ka ọrụ ya pụta ìhè.
21 કિન્તુ યઃ સત્કર્મ્મ કરોતિ તસ્ય સર્વ્વાણિ કર્મ્માણીશ્વરેણ કૃતાનીતિ સથા પ્રકાશતે તદભિપ્રાયેણ સ જ્યોતિષઃ સન્નિધિમ્ આયાતિ|
Ma ndị na-ebi ndụ nʼeziokwu na-abịakwute ìhè ahụ, ka e nwee ike hụta ya nke ọma, na ihe niile ha na-eme sitere na ike Chineke.
22 તતઃ પરમ્ યીશુઃ શિષ્યૈઃ સાર્દ્ધં યિહૂદીયદેશં ગત્વા તત્ર સ્થિત્વા મજ્જયિતુમ્ આરભત|
Emesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime obodo Judịa, ebe ọ nọtụrụ nwa oge, meekwa baptizim.
23 તદા શાલમ્ નગરસ્ય સમીપસ્થાયિનિ ઐનન્ ગ્રામે બહુતરતોયસ્થિતેસ્તત્ર યોહન્ અમજ્જયત્ તથા ચ લોકા આગત્ય તેન મજ્જિતા અભવન્|
Nʼotu aka ahụ, Jọn nọkwa nʼọnụ mmiri Enọn dị nso na Salim na-eme baptizim nʼihi na mmiri buru ibu nʼebe ahụ, ndị mmadụ gakwara nʼihu na-abịakwute ya, ọ na-emekwa ha baptizim.
24 તદા યોહન્ કારાયાં ન બદ્ધઃ|
E tinyebeghị Jọn nʼụlọ mkpọrọ mgbe ahụ.
25 અપરઞ્ચ શાચકર્મ્મણિ યોહાનઃ શિષ્યૈઃ સહ યિહૂદીયલોકાનાં વિવાદે જાતે, તે યોહનઃ સંન્નિધિં ગત્વાકથયન્,
Nʼoge a, ịrụrịta ụka malitere nʼetiti ndị na-eso ụzọ Jọn na otu onye Juu banyere mmemme ịdị ọcha.
26 હે ગુરો યર્દ્દનનદ્યાઃ પારે ભવતા સાર્દ્ધં ય આસીત્ યસ્મિંશ્ચ ભવાન્ સાક્ષ્યં પ્રદદાત્ પશ્યતુ સોપિ મજ્જયતિ સર્વ્વે તસ્ય સમીપં યાન્તિ ચ|
Ha bịakwutere Jọn sị ya, “Onye ozizi, onye ahụ ị gbara ama banyere ya nọ nʼofe Jọdan na-eme baptizim, mmadụ niile na-agakwukwara ya.”
27 તદા યોહન્ પ્રત્યવોચદ્ ઈશ્વરેણ ન દત્તે કોપિ મનુજઃ કિમપિ પ્રાપ્તું ન શક્નોતિ|
Jọn zaghachiri sị, “Ihe mmadụ nwere ike ịnata bụ naanị ihe ahụ e nyere ya site nʼeluigwe.
28 અહં અભિષિક્તો ન ભવામિ કિન્તુ તદગ્રે પ્રેષિતોસ્મિ યામિમાં કથાં કથિતવાનાહં તત્ર યૂયં સર્વ્વે સાક્ષિણઃ સ્થ|
Unu onwe unu ga-agbara m akaebe na m sịrị, na abụghị m Kraịst ahụ, kama e zitere m ka m buru ụzọ bịa.
29 યો જનઃ કન્યાં લભતે સ એવ વરઃ કિન્તુ વરસ્ય સન્નિધૌ દણ્ડાયમાનં તસ્ય યન્મિત્રં તેન વરસ્ય શબ્દે શ્રુતેઽતીવાહ્લાદ્યતે મમાપિ તદ્વદ્ આનન્દસિદ્ધિર્જાતા|
Nwanyị a na-alụ ọhụrụ bụ nke di ya. Enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-eche ma na-egekwa ntị ịnụ olu ya, ọṅụ na-ejupụtakwa ya obi mgbe ọ nụrụ olu onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ. Ya mere, ọṅụ m e zuola oke ugbu a.
30 તેન ક્રમશો વર્દ્ધિતવ્યં કિન્તુ મયા હ્સિતવ્યં|
Ọ ghaghị ịdị elu, ma mụ onwe m aghaghị ịdịkwa ala.
31 ય ઊર્ધ્વાદાગચ્છત્ સ સર્વ્વેષાં મુખ્યો યશ્ચ સંસારાદ્ ઉદપદ્યત સ સાંસારિકઃ સંસારીયાં કથાઞ્ચ કથયતિ યસ્તુ સ્વર્ગાદાગચ્છત્ સ સર્વ્વેષાં મુખ્યઃ|
“Onye ahụ si nʼelu bịa dị elu karịa ihe niile, onye ahụ si nʼụwa bụkwa nke ụwa ma na-ekwukwa okwu dị ka onye si nʼụwa. Onye ahụ si nʼeluigwe dị elu karịa ihe niile.
32 સ યદપશ્યદશૃણોચ્ચ તસ્મિન્નેવ સાક્ષ્યં દદાતિ તથાપિ પ્રાયશઃ કશ્ચિત્ તસ્ય સાક્ષ્યં ન ગૃહ્લાતિ;
Ọ na-agba ama banyere ihe ọ hụrụ nakwa nke ọ nụrụ, ma o nweghị onye na-anabata ama ya.
33 કિન્તુ યો ગૃહ્લાતિ સ ઈશ્વરસ્ય સત્યવાદિત્વં મુદ્રાઙ્ગિતં કરોતિ|
Onye ọbụla nabatara akaebe ya ji nke a mere akara, na Chineke bụ eziokwu.
34 ઈશ્વરેણ યઃ પ્રેરિતઃ સએવ ઈશ્વરીયકથાં કથયતિ યત ઈશ્વર આત્માનં તસ્મૈ અપરિમિતમ્ અદદાત્|
Nʼihi na onye Chineke zitere na-ekwu okwu Chineke. Nʼihi na ọ na-enye Mmụọ ya nʼuju.
35 પિતા પુત્રે સ્નેહં કૃત્વા તસ્ય હસ્તે સર્વ્વાણિ સમર્પિતવાન્|
Nna hụrụ Ọkpara ya nʼanya, o tinyekwala ihe niile nʼaka ya.
36 યઃ કશ્ચિત્ પુત્રે વિશ્વસિતિ સ એવાનન્તમ્ પરમાયુઃ પ્રાપ્નોતિ કિન્તુ યઃ કશ્ચિત્ પુત્રે ન વિશ્વસિતિ સ પરમાયુષો દર્શનં ન પ્રાપ્નોતિ કિન્ત્વીશ્વરસ્ય કોપભાજનં ભૂત્વા તિષ્ઠતિ| (aiōnios g166)
Onye ọbụla kwere nʼỌkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi, ma onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ nʼihi na iwe Chineke ga-adịrị ya.” (aiōnios g166)

< યોહનઃ 3 >