< UGenesisi 49 >
1 UJakobe wasebiza amadodana akhe wathi: Buthanani ukuze ngilazise okuzalehlela ensukwini ezizayo.
Mgbe ahụ, Jekọb kpọkọtara ụmụ ya ndị ikom niile nʼotu sị ha, “Zukọọnụ ka m gwa unu ihe ga-adakwasị unu nʼụbọchị dị nʼihu.
2 Buthanani, lizwe madodana kaJakobe, limlalele uIsrayeli uyihlo.
“Zukọọnụ nụrụ, ụmụ ndị ikom Jekọb nụrụ okwu nna unu Izrel.
3 Rubeni, ulizibulo lami, amandla ami, lokuqala kokuqina kwami, ukuphelela kwesithunzi, lokuphelela kwamandla.
“Ruben, ọkpara m ka ị bụ, ume m, ihe ngosi mbụ nke ike m, onye nsọpụrụ kwesiri, onye mbụ nʼịdị ike.
4 Uphuphuma njengamanzi, kawuyikuba ngopheleleyo, ngoba ukhwele embhedeni kayihlo, wasuwona; wakhwela embhedeni wami.
Onye na-agbanwe agbanwe dịka mmiri dị nʼiyi, ị gaghị abụkwa onye mbụ, nʼihi na ị banyere nʼihe ndina nna gị, i dinara nʼihe ndina m, merụọ ya.
5 USimeyoni loLevi bayizelamani; inkemba zabo ziyizikhali zokuphanga.
“Simiọn na Livayị bụ ụmụnne. Mma agha ha bụ ngwa ihe ike.
6 Umphefumulo wami ungangeni emphakathini wabo wangasese, udumo lwami lungahlangani emhlanganweni wabo; ngoba ngolaka lwabo babulala umuntu, langokuzithokozisa baquma izinkabi umsipha.
Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha, ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha, nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha, bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche.
7 Kaluqalekiswe ulaka lwabo ngoba lulamandla, lentukuthelo yabo ngoba ilesihluku. Ngizabehlukanisa koJakobe, ngibahlakaze koIsrayeli.
Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ. Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke. Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ Jekọb Kpasaa ha nʼetiti ndị Izrel.
8 Juda, wena, abafowenu bazakudumisa; isandla sakho sizakuba sentanyeni yezitha zakho; amadodana kayihlo azakukhothamela.
“Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị. Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị. Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị.
9 UJuda ungumdlwane wesilwane; wenyukile empangweni, ndodana yami, uguqile, ulele njengesilwane, lanjengesilwane esisikazi; ngubani ozamsukumisa?
Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda, i si nʼịchụ nta lọta, nwa m. Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala, dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya?
10 Intonga yobukhosi kayiyikusuka kuJuda, lomnikumthetho phakathi kwenyawo zakhe, aze afike uShilo, njalo izizwe zizamlalela.
Mkpanaka eze agaghị esite nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya, maọbụ mkpanaka onyendu esi nʼagbata ụkwụ ya pụọ, tutuu ruo mgbe eze ahụ nwe ya ga-abịa, irube isi nke mba niile ga-abụ nke ya.
11 Ubophela ithole lakhe likababhemi evinini, lethole likababhemikazi wakhe evinini elihle. Uhlamba isigqoko sakhe ewayinini, lesembatho sakhe egazini lezithelo zevini.
Ọ ga-ekenye ịnyịnya ibu ya nʼosisi vaịnị, nʼalaka kachasị mma ka ọ ga-ekenye nwa ịnyịnya ibu ya. Ọ ga-asakwa uwe ya na mmanya. Uwe mwụda ya ka ọ ga-asụkwa nʼọbara mkpụrụ vaịnị.
12 Amehlo akhe azakuba nsundu ngewayini, lamazinyo akhe mhlophe ngochago.
Anya ya ga-acha uhie uhie karịa mmanya vaịnị. Eze ya ga-enwupụkwa ọcha karịa mmiri ara ehi.
13 UZebuluni uzahlala ethekwini lolwandle, abe litheku lemikhumbi, lomngcele wakhe uzakuba ngaseSidoni.
“Zebụlọn ga-ebi nʼakụkụ osimiri. Ọ ga-abụ ebe izuike nye ụgbọ mmiri. Oke ala ya ga-agbatịpụ ruo Saịdọn.
14 UIsakari ungubabhemi olamathambo alamandla, oqutha phakathi kwemithwalo emibili.
“Isaka dị ike dịka ịnyịnya ibu na-amakpu nʼetiti ọgba atụrụ.
15 Wathi ebona indawo yokuphumula ukuthi inhle, lelizwe ukuthi liyabukeka, wagobisa amahlombe akhe ukuze athwale, waba yinceku esibhalweni.
Mgbe ọ hụrụ otu ebe izuike ya si dị mma, hụ otu ala ya si maa mma, ọ ga-ehudata isi ya ibu ibu arụ; were onwe ya nye ịrụ ọrụ ike.
16 UDani uzakwahlulela abantu bakhe, njengesinye sezizwe zakoIsrayeli.
“Dan ga-eme ka ikpe ziri ezi rute ndị ya aka dịka otu nʼime ebo Izrel.
17 UDani uzakuba yinyoka endleleni, inhlangwana emkhondweni, eluma izithende zebhiza, ukuze umgadi walo awe nyovane.
Dan ga-adị ka agwọ dị nʼakụkụ okporoụzọ, dịka ajụala dị nʼụzọ ọhịa, nke na-ata ịnyịnya nʼikiri ụkwụ, si otu a mee ka onye na-agba ịnyịnya dalaa azụ.
18 Ngilindele usindiso lwakho, Nkosi.
“O Onyenwe anyị, ana m ele anya nnapụta gị.
19 UGadi, iviyo lizamhlasela, kodwa yena uzahlasela ezithendeni.
“Gad bụ onye usuu ndị o-ji-egbe-aga ga-abịakwasị, ma ọ ga-alụso ha ọgụ, chụọkwa ha ọsọ.
20 Kuvela kuAsheri, ukudla kwakhe kuzanona, uzaveza izibiliboco zenkosi.
“Asha ga-esi nʼubi ya wepụta nri gbara abụba, nke na-adị ndị eze mma.
21 UNafithali uyimpala ethukululiweyo, eveza amazwi amahle.
“Naftalị dịka nne ele a hapụrụ ahapụ, nke na-amụpụta ụmụ ele mara mma.
22 UJosefa ulugatsha oluthelayo, ugatsha oluthelayo emthonjeni, ingatsha zikhwela phezu komduli.
“Dịka osisi vaịnị a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke alaka ya na-awasa rigoro nʼelu mgbidi, na nke na-amị ezi mkpụrụ, otu a ka Josef dị.
23 Abatshoki basebemphatha kabuhlungu, bamtshoka, bamzonda.
Ndị na-agbata ụta sitere nʼobi ilu lụso ya agha, ha gbara ya àkụ site nʼịkpọ asị.
24 Kodwa idandili lakhe lahlala liqinile, lengalo zezandla zakhe zaqiniswa ngezandla zikaSomandla kaJakobe, okuvela khona umelusi, ilitshe likaIsrayeli,
Ma aka o ji jide ụta nke ya adaghị mba, ike agwụghị ogwe aka ya, nʼihi aka Onye dị ike nke Jekọb, nʼihi Onye ọzụzụ atụrụ, Oke Nkume Izrel,
25 ngoNkulunkulu kayihlo ozakusiza, langoSomandla ozakubusisa ngezibusiso zamazulu ezivela phezulu, izibusiso zokujula okulele phansi, izibusiso zamabele lesizalo,
nʼihi Chineke nna gị, onye na-enyere gị aka, nʼihi Onye pụrụ ime ihe niile, ka ọ gọzie gị, site na ngọzị nke eluigwe site nʼelu, ngọzị nke osimiri dị nʼokpuru ala, ngọzị nke ara na akpanwa.
26 izibusiso zikayihlo ziyedlula izibusiso zabokhokho bami, kuze kube sengqongeni zamaqaqa aphakade; zizakuba phezu kwekhanda likaJosefa, laphezu kwenkanda yalowo owehlukaniswe kubafowabo.
Ngọzị niile nke nna gị, dị ukwu karịa, ngọzị niile nke ugwu ukwu mgbe ochie, karịakwa ngọzị nke ugwu nta mgbe ochie, Ka ngọzị ndị a dị iche dịkwasị nʼisi Josef, dịkwasị nʼegedege ihu Josef, onye bụ onyendu nʼetiti ụmụnne ya.
27 UBhenjamini uyimpisi edabulayo; ekuseni izakudla ekujimbileyo, lakusihlwa izakwehlukanisa impango.
“Benjamin dịka nkịta ọhịa nke na-adọgbu anụ. Nʼụtụtụ, ọ na-eri anụ ọ dọgburu. Nʼanyasị ọ na-ekesakwa ihe o gbutere.”
28 Bonke labo bayizizwe ezilitshumi lambili zakoIsrayeli; futhi lokho yikho uyise akukhuluma kubo ebabusisa; ngulowo lalowo ngesibusiso sakhe wababusisa.
Ndị a bụ ebo iri na abụọ dị nʼIzrel. Ihe ndị a bụkwa ihe nna ha gwara ha mgbe ọ gọziri ha, nye onye ọbụla nʼime ha ngọzị nke ruuru ya.
29 Wasebalaya wathi kubo: Sengibuthelwa ebantwini bakithi; lingingcwabe labobaba obhalwini olusensimini kaEfroni umHethi,
Emesịa, o nyere ha ndụmọdụ sị ha, “Nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, aga m anwụ. Unu aghaghị ili m nʼebe e liri nna m ha, nʼala Kenan, nʼime ọgba ahụ dị nʼọhịa Efrọn, onye Het.
30 obhalwini olusensimini yeMakaphela eqondane leMamre, elizweni leKhanani, uAbrahama owaluthenga lensimu kuEfroni umHethi ibe yindawo yethu yokungcwabela.
Nʼime ọgba dị nʼọhịa Makipela, nke dị nso na Mamre, nʼala Kenan, ọhịa Ebraham zụtara site nʼaka Efrọn onye Het, maka ili ozu.
31 Lapho bangcwaba oAbrahama loSara umkakhe; lapho bangcwaba oIsaka loRebeka umkakhe; lalapho ngangcwaba uLeya,
Nʼebe ahụ ka e liri Ebraham na Sera nwunye ya. Nʼebe ahụ kwa ka e liri Aịzik na Ribeka nwunye ya. Nʼebe ahụ ka m liri Lịa.
32 insimu, lobhalu olukiyo, kwathengwa emadodaneni kaHethi.
Ebraham nna nna m zụrụ ala ahụ na ọgba dị nʼime ya site nʼaka ụmụ Het.”
33 Kwathi uJakobe eseqedile ukulaya amadodana akhe, waqoqela inyawo zakhe embhedeni, waphela, wabuthelwa ebantwini bakibo.
Mgbe Jekọb kwuchara okwu ndụmọdụ ikpeazụ ndị a nye ụmụ ya ndị ikom, ọ chịkọtara ụkwụ ya nʼelu akwa, kuo ume ikpeazụ. A chịkọtara ya na ndị ya.