< 2 Amakhosi 9 >

1 UElisha umprofethi wasebiza omunye wamadodana abaprofethi wathi kuye: Bopha ukhalo lwakho, uthathe lumfuma wamafutha esandleni sakho, uye eRamothi-Gileyadi.
Emesịa, Ịlaisha onye amụma, kpọrọ otu onye nʼime ụmụ ndị amụma sị ya, “Jikere, fanye ọnụ uwe mwụda gị nʼeriri ikere nʼukwu gị, werekwa karama mmanụ oliv a nʼaka gị, bịa ka ị gaa Ramọt Gilead.
2 Nxa ufika khona udinge lapho uJehu indodana kaJehoshafathi indodana kaNimshi, ungene, umsukumise phakathi kwabafowabo, umngenise ekamelweni elingaphakathi.
I jeruo ebe ahụ, jee hụ Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi anya. Mee ka o bilie site nʼetiti ndị ha na ya nọ. Mekwaa ka gị na ya naanị baa nʼime ụlọ.
3 Ubusuthatha umfuma wamafutha, uwathele ekhanda lakhe uthi: Itsho njalo iNkosi: Ngikugcobile ube yinkosi phezu kukaIsrayeli. Ubusuvula umnyango, ubaleke, ungaphuzi.
Were karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi gwa ya okwu sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ I mesịa, meghe ụzọ ọsịịsọ, sitekwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ.”
4 Lahamba-ke ijaha lelo, ijaha umprofethi, laya eRamothi-Gileyadi.
Nwokorobịa onye amụma ahụ gara Ramọt Gilead.
5 Ekufikeni kwalo, khangela, induna zebutho zazihlezi, lathi: Ngilombiko kuwe, nduna. UJehu wasesithi: Kubani phakathi kwethu sonke? Laselisithi: Kuwe, nduna.
Mgbe o jeruru, ọ hụrụ ebe ọchịagha ahụ nọdụrụ nʼala nʼetiti ndịisi agha ibe ya. O kwuru sị, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ọchịagha.” Jehu jụrụ, “Ọ bụ onye nʼime anyị ka ị chọrọ izi ozi?” Ọ zara, “Ọ bụ gị ọchịagha.”
6 Wasesukuma, wangena endlini; laselithela amafutha ekhanda lakhe, lathi kuye: Itsho njalo iNkosi, uNkulunkulu kaIsrayeli: Ngikugcobile ukuthi ube yinkosi phezu kwabantu beNkosi, phezu kukaIsrayeli.
Jehu biliri baa nʼime ụlọ. Nwokorobịa onye amụma ahụ wụkwasịrị ya mmanụ nʼisi, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Eteela m gị mmanụ ịbụ eze ndị nke Onyenwe anyị, bụ Izrel.
7 Njalo uzatshaya indlu kaAhabi inkosi yakho, ukuze ngiphindisele igazi lenceku zami abaprofethi, legazi lazo zonke inceku zeNkosi, esandleni sikaJezebeli.
Ị ga-ekpochapụ ezinaụlọ Ehab, nna gị ukwu, aga m esi otu a bọtara onwe m ọbọ, nʼihi ọbara ndị ohu m, bụ ndị amụma na ọbara ndị ozi Onyenwe anyị niile Jezebel wufuru.
8 Yonke-ke indlu kaAhabi izabhubha; njalo ngizaquma asuke kuAhabi ochamela emdulini, lovalelweyo lokhululekileyo koIsrayeli.
Ezinaụlọ Ehab ga-abụ ihe lara nʼiyi. Nʼala Izrel, m ga-esite nʼezinaụlọ Ehab bipụ ndị ikom niile, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya.
9 Njalo ngizakwenza indlu kaAhabi njengendlu kaJerobhowamu indodana kaNebati lanjengendlu kaBahasha indodana kaAhiya.
M ga-ala ụlọ Ehab nʼiyi, ka m si laa ezinaụlọ Jeroboam nwa Nebat nʼiyi, na dịka m si lakwaa ezinaụlọ Baasha, nwa Ahija nʼiyi.
10 Lezinja zizakudla uJezebeli esabelweni seJizereyeli, njalo kakuyikuba lomngcwabayo. Laselivula umnyango, labaleka.
Nkịta ga-erikwa anụ Jezebel nwunye Ehab na Jezril. Ọ dịkwaghị onye ga-eli ya.’” Mgbe o kwuchara okwu ndị a, onye amụma ahụ meghere ụzọ gbapụ ọsọ.
11 Kwathi uJehu esephumele encekwini zenkosi yakhe, omunye wathi kuye: Kulungile yini? Luzeleni loluhlanya kuwe? Wasesithi kuzo: Liyamazi lumuntu lenkulumo yakhe.
Jehu jekwuuru ndịisi agha ibe ya. Otu onye nʼime ha jụrụ ya sị, “Gịnị ka onye ara ahụ chọrọ bịa? Udo ọ dịkwa?” Jehu zara, “Unu maara onye ọ bụ, marakwa ụdị okwu ga-esi ya nʼọnụ pụta.”
12 Zasezisithi: Manga! Sitshele khathesi. Wasesithi: Ukhulume ukuthi lokuthi kimi esithi: Itsho njalo iNkosi: Ngikugcobile ube yinkosi phezu kukaIsrayeli.
Ha sịrị, “Ihe i kwuru abụghị eziokwu, gwa anyị ihe o kwuru.” Jehu sịrị, “Ihe ndị a ka ọ gwara m, ‘Otu a ka a Onyenwe anyị kwuru, Eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’”
13 Zaseziphangisa, zathatha, ngulowo lalowo isembatho sakhe, zazibeka ngaphansi kwakhe engqongeni yezikhwelo, zavuthela uphondo, zathi: UJehu uyinkosi!
Ngwangwa ha chịịrị uwe mgbokwasị ha niile doo ha nʼusoro nʼala ebe ahụ ka Jehu zọkwasị ha ụkwụ. Ha fụrụ opi ike tie mkpu sị, “Jehu bụ eze!”
14 Ngokunjalo uJehu indodana kaJehoshafathi indodana kaNimshi wamenzela ugobe uJoramu. (UJoramu wagcina-ke iRamothi-Gileyadi, yena loIsrayeli wonke, ngenxa kaHazayeli inkosi yeSiriya;
Otu a ka Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi, si gbaa izu megide Joram. (Nʼoge a, Joram na ndị Izrel niile na-eche Ramọt Gilead nche, nʼihi Hazael eze Aram.)
15 kodwa uJehoramu inkosi wayesebuyelele ukwelatshwa eJizereyeli ngamanxeba amaSiriya ayemtshaye wona ekulweni kwakhe loHazayeli inkosi yeSiriya.) UJehu wasesithi: Aluba kuyintando yenu, kakungaphumi ophunyukileyo emzini ukuyabika lokhu eJizereyeli.
Ma Joram bụ eze, laghachitere na Jezril ebe ọ nọ ka ahụ dị ya mma maka ahụ ndị Aram merụrụ ya mgbe ya na Hazael, eze Aram lụrụ agha. Ya mere, Jehu sịrị, “Ọ bụrụ na nke a bụ uche unu, ime m eze unu, unu ekwela ka onye ọbụla si nʼobodo a gbapụ, gaa Jezril kọọ akụkọ a.”
16 UJehu wasekhwela inqola, waya eJizereyeli, ngoba uJoramu wayelele khona, loAhaziya inkosi yakoJuda wayehle ukuthi abone uJoramu.
Mgbe ahụ, Jehu wụkwasịrị nʼelu ụgbọ agha ya gbaga Jezril, nʼihi na Joram nọ nʼebe ahụ na-ezu ike. Ma Ahazaya, bụ eze Juda gakwara ileta ya.
17 Umlindi wayemi-ke emphotshongweni eJizereyeli, wabona ixuku likaJehu, yena esiza, wathi: Ngibona ixuku. UJehoramu wathi: Thatha umgadi webhiza umthume ukubahlangabeza, athi: Yikuthula yini?
Mgbe onye nche nọ nʼụlọ elu Jezril hụrụ Jehu na ndị agha ya ka ha na-abịa, o tiri mkpu sị, “Lee, o nwere ndị agha na-abịa.” Joram eze Izrel nyere iwu sị, “Zipụ otu onye na-agba ịnyịnya ka ọ gaa zute ha jụọ ha sị, ‘Udo ọ dịkwa?’”
18 Wasehamba umgadi webhiza ukumhlangabeza, wathi: Itsho njalo inkosi: Yikuthula yini? UJehu wasesithi: Ulani lokuthula? Phendukela ngemva kwami. Umlindi wasebika esithi: Isithunywa sesifikile kibo, kodwa kasiphenduki.
Onye ọgbaịnyịnya ahụ nọkwasịrị nʼelu ya gbapụ izute Jehu, sị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’” Jehu zara, “Gịnị ka gị na udo nwekọrọ? Tụgharịa gaa soro m nʼazụ.” Onye nche ahụ ziri ozi sị, “Onyeozi ahụ ezutela ha, kama ọ naghị alọta.”
19 Yasithuma umgadi webhiza wesibili, wafika kibo wathi: Itsho njalo inkosi: Yikuthula yini? UJehu wasesithi: Ulani lokuthula? Phendukela ngemva kwami.
Eze zipụrụ onye ọgbaịnyịnya nke abụọ. Mgbe ọ bịakwutere ha ọ sịrị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’” Jehu zara, “Gịnị ka gị na udo nwekọrọ? Chigharịa soro m nʼazụ.”
20 Umlindi wasebika wathi: Usefikile kibo, kodwa kaphenduki. Lokutshayela kufanana lokutshayela kukaJehu indodana kaNimshi, ngoba utshayela okohlanya.
Onye ahụ nọ na-eche nche sịrị, “Ọ garuola ha nso, ma ọ dịghị alọghachitekwa azụ. Ma ọgbụgba ịnyịnya dịka ọ bụ Jehu nwa Nimshi, nʼihi na ọ na-agba ịnyịnya ya dịka onye na-ayị ara.”
21 UJehoramu wasesithi: Bophelani. Basebebophela inqola yakhe. UJehoramu inkosi yakoIsrayeli loAhaziya inkosi yakoJuda basebephuma, ngulowo lalowo enqoleni yakhe, baphuma ukuhlangabeza uJehu, bamthola esiqintini sikaNabothi umJizereyeli.
Joram nyere iwu sị, “Kwadooro m ụgbọ agha m.” Mgbe a kwadooro ya, Joram eze Izrel, na Ahazaya, eze Juda, pụtara nọkwasị nʼụgbọ agha, onye ọbụla na nke ya, pụọ ịga izute Jehu. Ha zutere ya nʼoke ala ubi Nebọt, onye Jezril.
22 Kwasekusithi uJehoramu ebona uJehu wathi: Yikuthula yini, Jehu? Wasesithi: Ukuthula bani, selokhu ukuwula kukaJezebeli unyoko lokuthakatha kwakhe kukunengi kangaka?
Mgbe Joram hụrụ Jehu, ọ jụrụ, “Ị bịara nʼudo? Udo ọ dịkwa, Jehu?” Jehu zara, “Olee otu udo ga-esi dịrị, ebe ọ bụ na ihe ọjọọ niile nke ikpere arụsị na mgbaasị nke Jezebel nne gị, jupụtara nʼebe niile.”
23 UJehoramu wasephendula izandla zakhe wabaleka, wathi kuAhaziya: Yinkohliso, Ahaziya!
Joram chigharịrị ụgbọ agha ya bido ịgba ọsọ. Mgbe ọ na-agba ọsọ, o tiri mkpu kpọkuo Ahazaya sị ya, “Ahazaya, Aghụghọ dị, ọgbaaghara dị!”
24 UJehu wasedonsisisa idandili, watshaya uJehoramu phakathi kweziphanga zakhe, lomtshoko waphuma enhliziyweni yakhe, wasekhothama enqoleni yakhe.
Jehu jiri ike ya niile dọtịa ụta o ji nʼaka ya gba ya Joram. Ọ gbatara Joram àkụ ahụ nʼazụ. Àkụ ahụ sikwa ya nʼobi pụta. Nke a mere ka Joram daa nʼime ụgbọala ya nwụọ.
25 Wasesithi kuBidikari induna yakhe: Mphakamise, umphosele esiqintini sensimu kaNabothi umJizereyeli; ngoba khumbula mina lawe sigade sobabili ngemva kukaAhabi uyise, iNkosi yamethesa lumthwalo:
Mgbe ahụ, Jehu sịrị Bidka, bụ onyeisi agha ya, “Bulie ya, tụba ya nʼubi Nebọt onye Jezril. Chetakwa na mụ na gị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya, anyị abụọ, na-eso nna ya Ehab, mgbe Onyenwe anyị kwuru okwu amụma a megide ya.
26 Ngibonile isibili izolo igazi likaNabothi legazi lamadodana akhe, itsho iNkosi, ngizaphindisela kuwe kulesisiqinti, itsho iNkosi. Ngakho-ke mphakamise umphosele kulesisiqinti, njengokwelizwi leNkosi.
‘Nʼezie, ahụrụ m ọbara Nebọt na ọbara ụmụ ya ndị ikom ụnyaahụ, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼihi ya, aghaghị m ime ka ị kwụghachi ụgwọ ọbara ha nʼala ubi a.’ Ugbu a, bulie ya tụba ya nʼala ubi a dị ka okwu Onyenwe anyị si dị.”
27 UAhaziya inkosi yakoJuda esebonile lokhu wabaleka, ngendlela yendlu yesivande. UJehu wasexotshana laye, wathi: Mtshayeni laye enqoleni, emqansweni weGuri elingaseIbileyamu. Wasebalekela eMegido, wafela khona.
Mgbe Ahazaya eze Juda, hụrụ ihe mere, ọ gbaara ọsọ na-agbago nʼụzọ Bet Hagan. Ma Jehu chụsoro ya, na-eti mkpu sị, “Gbukwuonụ ya.” Ha merụrụ ya ahụ ka ọ nọ nʼụgbọ agha ya, nʼụzọ ịga Gua, nso Ibleam, ọ gbara ọsọ ga Megido ebe ọ nọ nwụọ.
28 Inceku zakhe zasezimthwala zamusa eJerusalema, zamngcwaba engcwabeni lakhe kuboyise emzini kaDavida.
Ndị ohu ya ji ụgbọ agha bịa buru ozu ya bubata ya na Jerusalem, lie ya nʼebe e liri nna nna ya ha, nʼobodo Devid.
29 Ngomnyaka wetshumi lanye kaJoramu indodana kaAhabi, uAhaziya waba yinkosi phezu kukaJuda.
Nʼafọ iri na otu nke ọchịchị Joram nwa Ehab, ka Ahazaya malitere ịbụ eze Juda.
30 UJehu esefikile eJizereyeli, uJezebeli wakuzwa. Wasecomba amehlo akhe, wacecisa ikhanda lakhe, walunguza ngewindi.
Mgbe Jezebel nụrụ na Jehu abịaruola Jezril, ọ banyere nʼụlọ ya, tee uri nʼanya abụọ, dozie agịrị isi ya, pụta bịa nọdụ ala nʼakụkụ oghereikuku, site nʼebe ahụ na-elepụ anya nʼezi.
31 Lapho-ke uJehu engena esangweni, wasesithi: Yikuthula yini, Zimri, mbulali wenkosi yakho?
Mgbe Jehu batara nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze, Jezebel kpọkuru ya sị, “Ị bịara nʼudo, gị Zimri, gị onye gburu nna gị ukwu.”
32 Wasephakamisela ubuso bakhe ewindini, wathi: Ngubani ongakimi? Ngubani? Kwasekulunguza kuye abathenwa ababili, abathathu.
Jehu leliri anya elu lee anya na oghereikuku tie mkpu sị, “Onye dịnyeere m?” Onozi abụọ maọbụ atọ na-eje ozi nʼụlọeze lepụtara anya lee ya anya.
33 Wasesithi: Mphoseleni phansi. Basebemphosela phansi; lelinye legazi lakhe lachaphakela emdulini lemabhizeni; wasemnyathelela phansi.
Jehu nyere ha iwu sị ha, “Tụdanụ ya nʼala.” Ya mere, ha si nʼelu ebe ahụ tụda ya nʼala. Mgbe ọ daruru ala, ọbara ya fesasịrị nʼahụ mgbidi ụlọ na nʼahụ ịnyịnya ndị ji ụkwụ ha zọjaa ya.
34 Wasengena wadla wanatha, wathi: Ake libone lo umqalekiswakazi limngcwabe, ngoba uyindodakazi yenkosi.
Jehu banyere nọ nʼime ụlọeze rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ. Emesịa, o nyere iwu sị, “Leenụ nwanyị a a bụrụ ọnụ; burunu ya gaa lie ya, nʼihi na ọ bụ ada eze.”
35 Basebesiyamngcwaba, kodwa kabaficanga lutho olwakhe ngaphandle kokhakhayi lenyawo lempama zezandla.
Mgbe ha pụtara ili ya, ọ bụ naanị okpokoro isi ya na ọkpụkpụ ụkwụ ya abụọ, na aka ya abụọ ka ha hụrụ. Ha ahụkwaghị anụ ahụ ya.
36 Ngakho babuyela bamtshela; wasesithi: Leli yilizwi leNkosi eyalikhuluma ngesandla senceku yayo uElija umTishibi lisithi: Esiqintini seJizereyeli izinja zizakudla inyama kaJezebeli;
Ha laghachiri gwa Jehu ihe ha hụrụ. Ọ zara sị ha, “Nke a bụ okwu Onyenwe anyị, nke o kwuru site nʼọnụ ohu ya Ịlaịja onye Tishbe sị: ‘Nʼala ubi dị na Jezril ka nkịta ga-anọ rie anụ ahụ Jezebel.
37 lesidumbu sikaJezebeli sizakuba njengomquba ebusweni bomhlabathi esiqintini seJizereyeli, ukuze bangathi: Lo nguJezebeli.
Ozu Jezebel ga-adị ka unyi nʼala ubi dị na Jezril, ruo na mmadụ enweghị ike ikwupụta sị, Nke a bụ Jezebel.’”

< 2 Amakhosi 9 >