< Omubuulizi 2 >
1 Nayogera munda yange nti, “Jjangu kaakano ngezese okusanyuka. Weesanyuse.” Naye laba, na kino kyali butaliimu.
Echere m nʼime obi m sị, Ugbu a, aga m eji ihe na-enye obi aṅụrị nwaa gị site otu a chọpụta ihe dị mma, ma nke a bụkwa ihe efu.
2 Nagamba nti, “Okuseka busirusiru. Era okusanyuka kugasa ki?”
“Ọchị,” ka m sịrị na “ọ bụ ihe nzuzu. Ikpori ndụ, uru gịnị ka ọ bara?”
3 Nanoonyereza n’omutima gwange, bwe nnaasanyusa omubiri gwange n’omwenge, nga nkyagoberera okunoonya amagezi. Nayagala okulaba abantu kyebasaanira okukola wansi w’enjuba mu nnaku ez’obulamu bwabwe entono.
Echere m nʼobi ụtọ m ga-esite nʼịṅụ mmanya. Agbasokwara m ụzọ ibi ndụ nzuzu ma obi m nọ nnọọ na-edu m site nʼamamihe. Olileanya m bụ na m ga-esi otu a chọta ụzọ kachasị mma ndị mmadụ nwere ike iji bie mkpụmkpụ ndụ ha nʼụwa.
4 Natandikawo emirimu egy’amaanyi: ne neezimbira amayumba ne neesimbira ennimiro ez’emizabbibu.
Arụpụtara m ọtụtụ ihe dị iche iche, ewuru m ụlọ nye onwe m ma nweekwa ubi vaịnị.
5 Ne neerimira ennimiro, ne neekolera n’ebifo ebigazi, ne nsimbamu buli ngeri ya miti egy’ebibala.
Ewuru m ubi a gbara ogige ebe izuike, ma kụọkwa osisi na-amị mkpụrụ dị iche iche nʼime ha,
6 Ne neesimira ebidiba omuva amazzi ag’okufukirira ebibira by’emiti emito.
wuore onwe m ọdọ mmiri ebe a ga-esi na-agba ubi m niile mmiri.
7 Neefunira abaddu abasajja n’abakazi, era nalina abaddu abaazaalirwa mu nnyumba yange. Ne mbeera n’amagana g’ente n’ebisibo by’endiga okusinga bonna abansooka okubeera mu Yerusaalemi.
Agbatara m ndị ohu nwoke na nwanyị, nweekwa ndị ohu ọzọ a mụrụ nʼụlọ m. Enwekwara m ọtụtụ igwe ehi na anụ ụlọ karịa eze niile ndị bu m ụzọ chịa na Jerusalem.
8 Ne neekuŋŋaanyiza ffeeza ne zaabu ebyavanga mu misolo, egyampebwanga bakabaka n’egyavanga mu bwakabaka bwabwe. Neefunira abayimbi abasajja n’abakazi, ne nfuna n’ebintu byonna ebisanyusa omuntu, ne neefunira n’abakazi.
Achịkọtara m ọlaọcha na ọlaedo nye onwe m, na akụnụba nke ọtụtụ ndị eze na-achị ala ha na-atụtara m. E nwetakwara m nye onwe m ndị ikom na ndị inyom ndị na-abụ abụ. Enwekwara ndị iko nwanyị nʼebe ọ bara ụba. Ihe ụtọ niile ndị na-amasị obi nwa mmadụ.
9 Ne nfuuka mukulu ne nsukkirira bonna abansooka mu Yerusaalemi. Mu ebyo byonna nasigala siweebuuse mu magezi.
E, aghọrọ m onye dị ukwuu karịa eze niile ndị burula m ụzọ chịa na Jerusalem. Ma nʼime ihe ndị a niile, anya doro m, ihe niile ka m ji amamihe tulee.
10 Na buli amaaso gange kye gaayagala okulaba sa kigamma, omutima gwange ne ngusanyusa mu buli kimu. Omutima gwange gwasanyukira bye nakola byonna, era eyo y’empeera yange olw’okutegana kwange kwonna.
Ihe ọbụla m chọrọ, ka m na-ewere; egbochighị m onwe m aṅụrị ọbụla. Obi m ṅụrịrị ọṅụ site nʼọrụ niile, nke a bụkwa oke m ketara na ndọgbu niile m dọgburu onwe m.
11 Awo bwe nalowooza byonna emikono gyange bye gyakola, n’okutegana kwonna nga nkola, laba, byonna bwali butaliimu na kugoberera mpewo, tewaali na kimu kye nagobolola wansi w’enjuba.
Mgbe m tulere ihe banyere ihe ndị a niile m tinyetụrụ aka, otu m si dọgbuo onwe m nʼọrụ banyere ha, mkpebi m bụ na ha niile bụ ihe efu, dịka ịchọ ijide ifufe. Nʼezie, ihe niile bụ ihe efu, ha abakwaghị uru.
12 Awo ne nkyuka ne ndowooza ku magezi, ne ku ddalu ne ku busirusiru, kubanga oyo aliddirira kabaka mu bigere alibaako ki ky’akola, okuggyako ekyo kabaka ky’akoze?
Atụgharịrị m bido ịmụ ihe banyere amamihe, na ịyị ara na nzuzu. Olee ihe ọzọ nke onye ga-anọchi anya eze ga-eme, karịa ihe ndị ahụ e merela na mbụ?
13 Awo ne ndaba amagezi nga gasinga obusirusiru, n’ekitangaala nga kisinga ekizikiza.
Achọpụtara m na amamihe dị mma karịa nzuzu, dịka ìhè si dị mma karịa ọchịchịrị.
14 Omugezi amaaso ge gali mu mutwe gwe, naye atalina magezi atambulira mu kizikiza. Kyokka ne ntegeera nga bombi akabi kabatuukako.
Nʼihi na onye maara ihe na-ahụ ụzọ ma isi kpuru onye nzuzu. Ma achọpụtakwara m na otu ihe ndaba na-adabara onye amamihe na onye nzuzu.
15 Ne ndyoka njogera mu mutima gwange nti, “Ekyo ekigwa ku musirusiru nange kirintuukako. Kale lwaki mbeera omugezi?” Era na kino ne nkizuula nga butaliimu.
Agwara m onwe m okwu sị, “Dịka onye nzuzu ga-anwụ, otu ahụ kwa ka m ga-anwụ. Gịnị bụ uru amamihe m niile bara?” Ekwuru m nʼobi m sị, “Ihe a bụkwa ihe efu.
16 Kubanga ku mugezi ne ku musirusiru tewaliwo ajjukirwa lubeerera; mu nnaku ezirijja bombi baliba beerabirwa dda. Okufaanana ng’omusirusiru n’omugezi naye alifa.
Nʼihi na onye maara ihe na onye nzuzu bụ ndị a na-agaghị echeta ihe banyere ogologo oge dị nʼihu. Nʼụbọchị ndị na-abịa nʼihu, a gaghị echeta ha. Onye amamihe na onye nzuzu aghaghị ịnwụ.”
17 Awo ne nkyawa obulamu kubanga buli ekikolebwa wansi w’enjuba kindeetera buyinike. Byonna butaliimu na kugoberera mpewo.
Ya mere, akpọrọ m ịdị ndụ asị, nʼihi na ọrụ a na-arụ nʼokpuru anyanwụ wutere m. Ihe efu ka ọ bụ; ọ dị ka ịchụgharị ifufe.
18 Nakyawa okutegana kwange kwonna kwe nateganamu wansi w’enjuba, kubanga byonna ndi wakubirekera oyo alinzirira mu bigere.
Ihe niile m gbalịrị ịrụpụta ka m kpọrọ asị, nʼihi na amaara m na emesịa, aga m ahapụrụ ha onye ọzọ na-abịa nʼazụ m.
19 Kale ani amanyi obanga aliba musajja mugezi oba musirusiru? Kyokka ye y’aliba mukama w’ebyo byonna bye nateganira nga nkozesa amagezi gange wansi w’enjuba; era na kino nakyo butaliimu.
Onye maara ma ọ ga-abụ onye maara ihe ma ọ ga-abụkwanụ onye nzuzu? Ma ihe niile m ji amamihe ǹka m na ike m rụpụta nʼokpuru anyanwụ ga-abụ nke ya! Ihe a bụ ihe efu.
20 Awo ne nterebuka olw’okutegana kwange kwonna wansi w’enjuba.
Ya mere, o wutere m nʼobi na m dọgburu onwe m nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ.
21 Kubanga oluusi omuntu ategana ng’akozesa amagezi ge n’okumanya awamu n’obukalabakalaba bwe, naye byonna ateekwa okubirekera oyo atabiteganiranga nako. Na kino nakyo butaliimu na kabi keereere.
Nʼihi na mmadụ nwere ike jiri amamihe, na ihe ọmụma na ǹka dọgbuo onwe ya nʼọrụ, emesịa, ha ahapụrụ onye na-enweghị mgbe ọ rụrụ ọrụ ọbụla ihe ndị ahụ niile. Nke a bụkwa ihe efu, na oke ihe ndakwasị.
22 Omuntu afuna ki mu kutegana kwe kwonna n’okukaluubirirwa mu ebyo by’ateganamu wansi w’enjuba?
Gịnị bụ uru mmadụ na-enweta na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ?
23 Kubanga ennaku ze zonna n’okutegana kwe bijjula bulumi; era ne mu kiro omutima gwe teguwummula; na kino nakyo butaliimu.
Nʼihi nʼụbọchị ha niile jupụtara naanị nʼihe mgbu na iru ụjụ, ọ bụladị nʼabalị, obi ha anaghị ezu ike. Ihe ndị a bụkwa ihe efu.
24 Tewali kisingira muntu kulya na kunywa na kusanyukira mu ebyo by’akola. Na kino nkiraba, kiva mu mukono gwa Katonda,
Nʼihi ya, ekpebiri m na ọ dịghị ihe ọzọ ga-abara mmadụ uru karịakwa naanị ịnọdụ ala rie nri, ṅụọkwa ihe ma chọta ojuju afọ nʼọrụ ya. Achọpụtakwara m na ọ bụladị nke a si nʼaka Chineke.
25 kubanga awatali ye, ani ayinza okulya oba asobola okusanyuka?
Ọ dịghị onye pụrụ iri maọbụ ṅụọ ma o siteghị na Chineke?
26 Kubanga omuntu asanyusa Katonda, Katonda amuwa amagezi n’okumanya n’essanyu; naye omwonoonyi Katonda amuwa omulimu gw’okukuŋŋaanyiza oyo asanyusa Katonda. Na kino nakyo butaliimu na kugoberera mpewo.
Nʼihi na ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ, ka Chineke na-enye amamihe na ihe ọmụma, na ọṅụ; ma ọ na-enye onye mmehie ọrụ ịkpakọta na ịchịkọba akụnụba nke ọ ga-enyefe nʼaka onye ahụ ihe ya dị Chineke mma. Nke a bụkwa ihe efu; ịchụso ifufe.