< Psalmorum 113 >

1 alleluia laudate pueri Dominum laudate nomen Domini
Toonu Onyenwe anyị! Toonu Onyenwe anyị unu ndị ohu ya. Toonu aha Onyenwe anyị.
2 sit nomen Domini benedictum ex hoc nunc et usque in saeculum
Ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.
3 a solis ortu usque ad occasum laudabile nomen Domini
Site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda ya, aha Onyenwe anyị ga-abụ ihe a na-eto eto.
4 excelsus super omnes gentes Dominus super caelos gloria eius
Onyenwe anyị dị elu karịa mba niile, ebube ya dị elu karịa eluigwe.
5 quis sicut Dominus Deus noster qui in altis habitat
Onye dị ka Onyenwe anyị Chineke anyị, onye nọkwasịrị ocheeze nʼebe dị elu,
6 et humilia respicit in caelo et in terra
onye na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ụwa anya?
7 suscitans a terra inopem et de stercore erigens pauperem
Ọ na-esi nʼuzuzu bulie ogbenye elu sitekwa nʼebe ikpofu ahịhịa bulie onye nọ na mkpa elu;
8 ut conlocet eum cum principibus cum principibus populi sui
ọ na-eme ka ya na ụmụ eze ndị ikom nọkọọ, ọ na-eme ka o soro ndị a maara aha ha nʼetiti ụmụ mmadụ nọkọọ.
9 qui habitare facit sterilem in domo matrem filiorum laetantem
Ọ na-eme ka nwanyị aga biri nʼụlọ nke ya dịka nne mụrụ ọtụtụ ụmụ ọṅụ juru obi. Toonu Onyenwe anyị.

< Psalmorum 113 >