< Zekaraya 10 >

1 Rịọọnụ Onyenwe anyị mmiri ozuzo nʼoge mmiri ozuzo nke ikpeazụ, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-ezite oke amụma mmiri. Ọ bụ ya na-enye ụmụ mmadụ mmiri ozuzo, na-enyekwa mmadụ niile ihe ọkụkụ nke ubi.
Kumbirai kuna Jehovha mvura yomunakamwe; Jehovha ndiye anogadzira makore edutu. Anonayisa mvura kuvanhu, uye anopa zvirimwa zveminda kuno mumwe nomumwe.
2 Arụsị niile na-ekwu okwu aghụghọ, ndị na-agba aja nʼahụ ọhụ bụ ụgha, ndị ha na-arọ nrọ, na-akọwakwa nrọ ụgha, okwu nkasiobi nke ihe na-adịghị nʼime ya ka ha na-enye. Ya mere, ndị mmadụ na-akpagharị dịka atụrụ a na-akpagbu ha nʼihi enweghị onye ọzụzụ atụrụ.
Zvifananidzo zvinotaura zvounyengeri, vavuki vanoona zviratidzo zvenhema; vanotaura zviroto zvenhema, vanopa varaidzo pasina. Nokudaro vanhu vanodzungaira samakwai anomanikidzwa nokuda kwokushayiwa mufudzi.
3 “Iwe m na-ere ọkụ megide ndị ọzụzụ atụrụ, aga m atakwa ndị ndu niile ahụhụ; nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-elekọta igwe anụ ụlọ ya, ya bụ ndị Juda, ọ ga-eme ka ha dịrị ka ịnyịnya dị ebube nʼagha.
“Kutsamwa kwangu kunomukira vafudzi, uye ndicharova vatungamiri, nokuti Jehovha Wamasimba Ose achava nehanya namakwai ake, imba yaJudha, uye achavaita sebhiza rinodadisa pakurwa.
4 A ga-esi na Juda nweta nkume bụ ide ji ụlọ, a ga-esi na ha nweta ǹtu ụlọ ikwu, a ga-esi na ha nweta ụta a kwadoro maka agha, sitekwa na ha nweta ndị ndu dị iche iche.
Muna Judha muchabva ibwe rapakona, kubva maari mbambo yetende, kubva maari uta hwehondo, kubva maari vatungamiri vose.
5 Ha niile ga-ejikọta onwe ha ọnụ, dịka ndị bụ dike nʼagha, ha ga-azọda ndị iro ha nʼapịtị nke okporoụzọ niile. Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere ha, ha ga-alụgbukwa ndị iro niile na-agba ịnyịnya.
Pamwe chete vachava savarume voumhare vanotsika migwagwa ina matope pakurwa. Nokuti Jehovha anavo, vacharwa vachakunda vatasvi vamabhiza.
6 “Aga m eme ka ụlọ Juda dị ike, zọpụtakwa ụlọ Josef. Aga m eme ka ha lọghachita, nʼihi na aga m egosi ha obi ebere. Ha ga-adị ka ndị m na-ajụghị mgbe ọbụla, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha, aga m azakwa arịrịọ ha.
“Ndichasimbisa imba yaJudha uye ndichaponesa imba yaJosefa. Ndichavadzosa nokuti ndinovanzwira tsitsi. Vachava savanhu vandakanga ndisina kuramba, nokuti ndini Jehovha Mwari wavo uye ndichavapindura.
7 Ndị Ifrem ga-aghọ ndị dị ike nʼagha, ha ga-enwe ọṅụ dịka ndị na-aṅụ mmanya. Ụmụ ha ga-ahụ ya ṅụrịakwa ọṅụ, ha ga-ejikwa obi ha niile ṅụrịa ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
VaEfuremu vachava semhare, uye mwoyo yavo ichafara sevakabatwa newaini. Vana vavo vachazviona uye vachapembera; Mwoyo yavo ichafara muna Jehovha.
8 Mgbe ahụ, aga m akpọ ha oku, chịkọtaa ha. Nʼezie, aga m agbapụta ha, ha ga-adịkwa ukwuu dịka ha dị na mbụ.
Ndichaninira kwavari ndigovaunganidza. Zvirokwazvo ndichavadzikinura, vachava vakawanda sakare.
9 A sịkwarị na m chụsara ha nʼetiti ndị dị iche iche, ma ha ga-echeta m site nʼala niile ahụ dị anya. Ha na ụmụ ha ga-adịkwa ndụ; ha ga-alọtakwa.
Kunyange ndikavaparadzira pakati pamarudzi, kunyange zvakadaro vachandirangarira vari kunyika dziri kure. Ivo navana vavo vachararama, uye vachadzoka.
10 Aga m esi nʼala Ijipt kpọlata ha, sitekwa nʼAsịrịa chịkọtaa ha. Aga m akpọta ha na Gilead na Lebanọn. Ha agaghị enwekwa ebe ga-ezuru ha niile.
Ndichavauyisa kubva kuIjipiti uye ndichavaunganidza kubva kuAsiria. Ndichavauyisa kuGireadhi nokuRebhanoni, uye hakungazovi nenzvimbo yavanokwana.
11 Ha ga-esi nʼosimiri nsogbu gafee. A ga-emekwa ka mmali elu nke osimiri dajụọ. Ebe obibi niile nke osimiri Naịl ga-atakọrọkwa. A ga-egbuda mpako niile nke Asịrịa, wezugakwa mkpara ọchịchị nke ndị Ijipt.
Vachapfuura napagungwa rokutambudzika; mafungu egungwa achaderedzwa uye pakadzika pose muna Nairi pachapwa. Kuzvikudza kweAsiria kuchaparadzwa uye tsvimbo youshe yeIjipiti ichabviswa.
12 Aga m eme ka ha dị ike nʼime Onyenwe anyị, ọ bụkwa nʼaha ya ka ha ga na-ejegharị nʼudo.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Ndichavasimbisa muna Jehovha uye muzita rake vachafamba,” ndizvo zvinotaura Jehovha.

< Zekaraya 10 >