< Abụ nke Abụ 8 >
1 O, a sịkwarị na ị bụ nwanne m nwoke; nke otu nne mụrụ mụ na ya m gaara esutu gị ọnụ mgbe anyị zutere nʼokporoụzọ ma ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-eleda m anya.
Laiti ungelikuwa kwangu kama ndugu wa kiume, ambaye aliyanyonya matiti ya mama yangu! Kisha, kama ningekukuta huko nje, ningelikubusu, wala hakuna mtu yeyote angelinidharau.
2 Agaara m akpọrọ gị baa nʼụlọ nne m, ka ị nọdụ nʼebe ahụ, nʼụlọ onye ziri m ihe. Agaara m enye gị mmanya e tinyere ihe na-esi isi ụtọ, mmanya ụtọ nke pomegranet.
Ningelikuongoza na kukuleta katika nyumba ya mama yangu, yeye ambaye amenifundisha. Ningelikupa divai iliyokolezwa unywe, asali ya maua ya mikomamanga yangu.
3 Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, aka nri ya na-ejikụ m.
Mkono wake wa kushoto uko chini ya kichwa changu, na mkono wake wa kuume unanikumbatia.
4 Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi, unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta tupu ruo mgbe ọ masịrị ya.
Binti za Yerusalemu, ninawaagiza: msichochee wala kuamsha mapenzi hata yatakapotaka yenyewe.
5 Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa, onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya. Onye a hụrụ nʼanya Nʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị; nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị; nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị.
Ni nani huyu anayekuja kutoka nyikani akimwegemea mpenzi wake? Mpendwa Nilikuamsha chini ya mtofaa, huko mama yako alipotunga mimba yako, huko yeye alipata utungu akakuzaa.
6 Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi, dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ, ekworo ya dịkwa ike dịka ala mmụọ. Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere, dịka ọkụ nke dị ukwu. (Sheol )
Nitie kama muhuri moyoni mwako, kama muhuri kwenye mkono wako; kwa maana upendo una nguvu kama mauti, wivu wake ni mkatili kama kuzimu. Unachoma kama mwali wa moto, kama mwali mkubwa wa moto wa Bwana hasa. (Sheol )
7 Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya, osimiri niile enwekwaghị ike iri ya. Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya, a ga-eleda ya anya nke ukwuu.
Maji mengi hayawezi kuuzimisha upendo, mito haiwezi kuugharikisha. Kama mtu angelitoa mali yote ya nyumbani mwake kwa ajili ya upendo, angelidharauliwa kabisa.
8 Anyị nwekwara otu nwanne nwanyị nta ma ọ kpụbeghị ara. Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwanyị, nʼụbọchị a ga-abịa ịlụ ya?
Tunaye dada mdogo, matiti yake hayajakua bado. Tutafanya nini kwa ajili ya dada yetu wakati atakapokuja kuposwa?
9 Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi, anyị ga-ewukwasị ụlọ elu ọlaọcha nʼelu ya; ma ọ bụrụ na ọ bụ ọnụ ụzọ, anyị ga-eji ibo e ji osisi sida wuo mechie ya, ichebe ya.
Kama yeye ni ukuta, tutajenga minara ya fedha juu yake. Na kama yeye ni mlango, tutamzungushia mbao za mierezi.
10 Abụ m mgbidi, ara m abụọ guzokwa dịka ụlọ elu. Otu a ka m siri dị nʼanya ya dịka onye na-ewetara ya afọ ojuju.
Mimi ni ukuta, nayo matiti yangu ni kama minara. Ndivyo ambavyo nimekuwa machoni pake kama yule anayeleta utoshelevu.
11 Solomọn nwere ubi vaịnị na Baal-Hamon, o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta. Onye ọbụla nʼime ha ga-eweta puku shekel ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta.
Solomoni alikuwa na shamba la mizabibu huko Baal-Hamoni; alikodisha shamba lake la mizabibu kwa wapangaji. Kila mmoja angeleta kwa ajili ya matunda yake shekeli 1,000 za fedha.
12 Ma ubi vaịnị m bụ nke aka m. Ana m enye ya onye m chọrọ inye. Puku ọlaọcha bụ nke Solomọn, ndị ọrụ ubi ga-enwetakwa narị ọlaọcha abụọ.
Lakini shamba langu la mizabibu ambalo ni langu mwenyewe ni langu kutoa; hizo shekeli 1,000 ni kwa ajili yako, ee Solomoni, na shekeli mia mbili ni kwa ajili ya wale wanaotunza matunda yake.
13 Gị onye bi nʼubi a gbara ogige, gị na ndị enyi gị, kwere ka m nụ olu gị.
Wewe ukaaye bustanini pamoja na marafiki mliohudhuria, hebu nisikie sauti yako!
14 Soro m ka anyị pụọ, onye m hụrụ nʼanya, bịakwute m dịka mgbada, maọbụ dịka nwa ele na-awụgharị nʼelu ugwu ebe ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ jupụtara.
Njoo, mpenzi wangu, uwe kama swala au kama ayala kijana juu ya milima iliyojaa vikolezo.