< Mkpughe 22 +

1 Mmụọ ozi ahụ gosiri m iyi ahụ e si ekute mmiri nke na-enye ndụ nke na-enwu dịka kristal. O sikwa nʼokpuru ocheeze Chineke na Nwa atụrụ ahụ na-asọpụta,
Ndipo mngeloyo anandionetsa mtsinje wamadzi amoyo, oyera ngati mwala wa krustalo ukutuluka ku mpando waufumu wa Mulungu ndi wa Mwana Wankhosa,
2 nʼetiti okporoụzọ ahụ dị nʼobodo ahụ. Nʼakụkụ aka nri na aka ekpe iyi ahụ, a ga-ahụ osisi ahụ na-enye ndụ. Osisi ndị a na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ dị iche iche. Ha na-amịpụta mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa ọbụla. Akwụkwọ osisi ahụ wapụtara bụ ọgwụ e ji agwọ mba niile.
Ukuyenda pakati pa msewu waukulu wa mu mzindawo. Mbali iliyonse ya mtsinjewo kunali mtengo wamoyo, utabala zipatso khumi ndi ziwiri. Kubereka zipatso mwezi uliwonse. Ndipo masamba a mtengowo ndi mankhwala wochiritsa anthu a mitundu ina.
3 A gaghị ahụ ihe ọbụla a bụrụ ọnụ nʼime obodo ahụ. Ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ ga-adị nʼobodo ahụ. Ndị ohu ya ga-efekwa ya ofufe.
Sipadzakhalanso temberero lililonse. Mpando waufumu wa Mulungu ndi wa Mwana Wankhosa udzakhala mu mzindawo, ndipo atumiki ake adzamutumikira.
4 Ha ga-ahụkwa ihu ya, a ga-edekwa aha ya nʼegedege ihu ha.
Iwo adzaona nkhope yake ndipo dzina lake lidzalembedwa pa mphumi zawo.
5 Abalị agaghị adịkwa ọzọ, ịmụnye oriọna agaghị adịkwa mkpa. Mkpa ìhè anwụ na-enye agaghị adịkwa nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ga-abụ ìhè ha, ha ga-achịkwa achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165)
Sipadzakhalanso usiku. Sadzafuna kuwala kwa nyale kapena kwa dzuwa pakuti Ambuye Mulungu adzakhala kuwala kwawo. Ndipo adzalamulira kwamuyaya. (aiōn g165)
6 Mmụọ ozi ahụ gwara m, “Okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu. Onyenwe anyị, bụ Chineke, onye na-enye ndị amụma Mmụọ ya ezitela mmụọ ozi ya igosi ụmụodibo ya ihe ndị ahụ ga-emezu nʼoge na-adịghị anya.
Mngeloyo anandiwuza kuti, “Mawu awa ndi okhulupirika ndi owona. Ambuye Mulungu wa mizimu ya aneneri anatumiza mngelo wake kudzaonetsa atumiki ake zinthu zimene ziyenera kuchitika posachedwapa.”
7 “Lee, ana m abịa ọsịịsọ. Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-edebe okwu amụma ndị a dị nʼakwụkwọ a.”
“Taonani, ndikubwera posachedwa! Wodala ndi amene asunga mawu oneneratu za kutsogolo a mʼbuku ili.”
8 Mụ onwe m bụ Jọn, hụrụ ihe ndị a niile, nụkwa ha. Mgbe m hụrụ ma nụchaa ihe ndị a niile, adara m nʼụkwụ mmụọ ozi a gosiri m ha ịkpọ isiala nye ya.
Ine Yohane, ndine amene ndinamva ndi kuona zinthu izi. Ndipo pamene ndinamva ndi kuona izi ndinagwa pansi kuti ndipembedze mngelo amene amandionetsa zimenezi.
9 Ma ọ sịrị m, “Emela ihe dị otu ahụ! Mụ onwe m bụkwa odibo Jisọs dịka gị onwe gị, na dịka ụmụnna gị ndị amụma, na dịka ndị ahụ niile na-edebe okwu niile e dere nʼakwụkwọ a. Kpọọrọ Chineke isiala.”
Koma mngeloyo anandiwuza kuti, “Usatero ayi! Ine ndine wotumikira monga iwe pamodzi ndi abale ako aneneri ndi onse amene amasunga mawu a mʼbuku pembedzani Mulungu.”
10 Ma ọ sịrị, “Akachila okwu amụma ndị a dị nʼakwụkwọ akara, nʼihi na oge adịla nso.
Kenaka anandiwuza kuti, “Usabise mawu onena zamʼtsogolo a mʼbuku ili chifukwa nthawi yayandikira.
11 Ka ndị niile na-eme ajọ omume gaa nʼihu na-eme ajọ omume, ka ndị na-adịghị ọcha gaa nʼihu bụrụ ndị na-adịghị ọcha, ka ndị na-eme ezi ihe gaa nʼihu na-eme ezi ihe, ka ndị dị nsọ gaa nʼihu bụrụ ndị dị nsọ.”
Wochita zoyipa apitirire kuchita zoyipazo; wochita zonyansa apitirire kuchita zonyansazo; wochita zabwino apitirire kuchita zabwinozo; ndipo woyera mtima apitirire kukhala woyera mtima.”
12 “Lee, ana m abịa ọsịịsọ! Ụgwọ ọrụ m ga-enye onye ọbụla dịka ọrụ ọ rụrụ si dị dịkwa m nʼaka.
“Taonani, ndikubwera posachedwa! Ndikubwera ndi mphotho zanga kuti ndidzapereke kwa aliyense malinga ndi zimene anachita.
13 Abụ m Alfa na Omega. Onye mbụ na Onye ikpeazụ, Mmalite na Ọgwụgwụ.
Ine ndine Alefa ndi Omega, Woyamba ndi Wotsiriza, Chiyambi ndi Chimaliziro ndine.
14 “Ngọzị na-adịrị ndị ahụ sara uwe ha mmiri, ka ha si otu a bụrụ ndị na-enweta oke na mkpụrụ si nʼosisi ahụ na-enye ndụ, ndị ga-enwe ike isite nʼọnụ ụzọ ama ahụ baa nʼime obodo ahụ.
“Odala amene achapa mikanjo yawo, kuti akhale ndi ufulu wopita ku mtengo wamoyo ndi kuti akalowe mʼzipata za mu mzindawo.
15 Nʼazụ obodo ka ndị ahụ bụ nkịta nọ, ha na ndị niile na-agba afa, na ndị niile na-akwa iko, na ndị niile na-egbu mmadụ, na ndị niile na-ekpere arụsị, na ndị niile hụrụ ụgha nʼanya ma na-emekwa ya.
Kunja kuli agalu, amatsenga, achiwerewere, akupha anthu, opembedza mafano ndi aliyense amene amakonda bodza ndi kulichita.
16 “Mụ onwe m, bụ Jisọs ezitela mmụọ ozi m ka ọ gbara unu ama a nye nzukọ m niile. Ọ bụ m bụ Mgbọrọgwụ na Mkpụrụ Devid. Abụkwa m Kpakpando ụtụtụ ahụ na-enwu enwu.”
“Ine Yesu, ndatuma mngelo wanga kuti achitire umboni uwu ku mipingo. Ine ndine Muzu ndi Chipatso cha Davide ndipo ndine Nthanda Yonyezimira.”
17 Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị, “Bịa!” Ka onye ọbụla nụrụ okwu a kwuo sị, “Bịa!” Onye akpịrị na-akpọ nkụ ya bịa, onye ọbụla chọrọ ya bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ na-akwụghị ụgwọ ọbụla.
Mzimu Woyera ndi mkwatibwi akuti, “Bwerani!” Ndipo amene akumva anena kuti Bwerani! Iye amene ali ndi ludzu abwere, ndipo aliyense amene afuna alandire mphatso yaulere ya madzi amoyo.
18 Ana m adọ onye ọbụla nụrụ okwu amụma dị nʼakwụkwọ a aka na ntị, sị, ọ bụrụ na onye ọbụla atụkwasị ihe ọbụla nʼelu ha, Chineke ga-atụkwasịrị onye ahụ ihe ntaramahụhụ ahụ niile e kwuru maka ha nʼakwụkwọ a.
Ndikuchenjeza aliyense amene akumva mawu onena zamʼtsogolo a mʼbukuli kuti, “Ngati wina awonjezerapo kalikonse, Mulungu adzamuwonjezera miliri imene yalembedwa mʼbuku ili.
19 Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ewepụ okwu ọbụla nʼakwụkwọ amụma a, Chineke ga-ewepụ oke o nwere nʼosisi ahụ na-enye ndụ, na oke o nwere nʼobodo nsọ ahụ, nke e kwuru okwu ha nʼakwụkwọ a.
Ndipo wina akachotsapo mawu onena zamʼtsogolo a mʼbuku ili, Mulungu adzachotsa gawo lake pa mtengo wamoyo ndi la mu mzinda woyera zimene zanenedwa mʼbuku ili.”
20 Onye ahụ gbara ama ihe ndị a niile na-asị, “Nʼezie, ana m abịa ọsịịsọ.” Amen. Bịa, Onyenwe anyị Jisọs.
Iye amene akuchitira umboni pa zinthu izi akuti, “Inde, Ine ndikubwera posachedwa.” Ameni. Bwerani Ambuye Yesu.
21 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere ndị nsọ niile. Amen.
Chisomo cha Ambuye Yesu chikhale ndi anthu onse. Ameni.

< Mkpughe 22 +