< Mkpughe 11 >

1 Enyere m ihe ọtụtụ osisi achara e ji atụ ihe. Agwara m sị m, “Gaa tụọ ụlọnsọ ukwu Chineke, ma tụọkwa ebe ịchụ aja dị nʼụlọnsọ ahụ, gụọ ọnụọgụgụ ndị niile na-akpọ isiala nʼebe ahụ.
Ndinapatsidwa bango longa ndodo yoyezera ndipo ndinawuzidwa kuti, “Pita, kayeze Nyumba ya Mulungu ndi guwa lansembe, ndipo ukawerenge anthu opembedza mʼNyumbamo.
2 Ma atụkwala ogige nke dị na mpụta ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ewerela ya nye ndị mba ọzọ. Ha ga-azọtọkwa obodo nsọ ahụ ụkwụ iri ọnwa anọ na abụọ.
Koma bwalo lakunja ulisiye, usaliyeze chifukwa linaperekedwa kwa a mitundu ina. Iwo adzawupondereza mzinda woyerawo kwa miyezi 42.
3 Aga m enye mmadụ abụọ ndị ga-agbara m ama ike ka ha buo amụma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii, ha ga-eyi akwa mkpe.”
Ndipo ndidzapereka mphamvu kwa mboni zanga ziwiri, zitavala ziguduli, ndipo kwa masiku 1,260 zidzakhala zikulalikira.”
4 Ndị a bụ osisi oliv abụọ ahụ na ihe ịdọba oriọna abụọ ahụ, ndị na-eguzo nʼihu Onye nwe ụwa.
Mboni ziwirizo ndi mitengo iwiri ya olivi ndi zoyikapo nyale ziwiri zija zimene zili pamaso pa Ambuye wa dziko lapansi.
5 Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, ọkụ ga-esi ha nʼọnụ pụta rechapụ ndị iro ha. Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, a ga-egbu ya nʼụzọ dị otu a.
Ngati wina atafuna kuzipweteka mbonizo, moto umatuluka mʼkamwa mwawo ndikuwononga adani awo.
6 A ga-enyekwa ha ike imechi eluigwe ime ka mmiri ozuzo ọbụla ghara izo nʼụwa nʼime afọ atọ na ọkara ahụ ha ga-ebu amụma ha. A ga-enyekwa ha ike ime ka osimiri na mmiri nta niile ghọọ ọbara. Ha ga-enwekwa ike ime ka ụdị ọrịa dị iche iche bịakwasị ụwa niile nʼoge ọbụla ha chepụtara nʼobi ha.
Mbonizo zili ndi mphamvu yomanga mvula kuti isagwe pa nthawi imene akulalikirayo; ndipo zili ndi mphamvu yosanduliza madzi kukhala magazi ndi yokantha dziko lapansi ndi miliri ya mitundumitundu nthawi iliyonse imene zingafune.
7 Mgbe ha gbazuru ama ha, anụ ọhịa ahụ, nke na-esite nʼime olulu Abis ahụ ga-ebuso ha agha merie ha, gbukwaa ha. (Abyssos g12)
Tsono zikadzatsiriza umboni wawowo, chirombo chotuluka mʼChidzenje chakuya chija chidzachita nawo nkhondo nʼkuzigonjetsa mpaka kuzipha. (Abyssos g12)
8 Mgbe ha nwụchara, ozu ha ga-atọgbọrọ nʼokporoụzọ nke obodo ukwu ahụ nke a na-akpọ na mmụọ Sọdọm na Ijipt, ebe a kpọgburu Onyenwe ha nʼobe.
Mitembo yawo idzakhala ili gone pabwalo la mu mzinda waukulu umene mozimbayitsa umatchedwa Sodomu ndi Igupto, kumenenso Ambuye wawo anapachikidwako.
9 A gaghị ekwenyekwa ka onye ọbụla lie ozu ha. Ma ndị niile dị iche iche nʼụwa, nʼebo niile, na asụsụ niile, na mba niile ga-agba ozu ha gburugburu ụbọchị atọ na ọkara nʼebe a tọgbọrọ ha na-ele ha anya.
Kwa masiku atatu ndi theka, anthu ochokera ku mtundu uliwonse, fuko lililonse, chiyankhulo chilichonse ndi dziko lililonse, azidzayangʼanitsitsa mitembo yawoyo koma adzakana kuyikwirira.
10 Ndị niile bi nʼụwa ga-aṅụrị ọṅụ, nyerịta ibe ha onyinye dị iche iche, kpọọ oriri dị iche iche iji ṅụrịa ọṅụ nʼihi ogbugbu e gburu ndị amụma abụọ ahụ, ndị wetaara ha oke nhụju anya.
Anthu okhala pa dziko lapansi adzasangalala nazo zimenezi. Adzachita chikondwerero ndi kutumizirana mphatso, chifukwa aneneri awiri amenewa ankasautsa anthu okhala pa dziko lapansi.
11 Ma mgbe ụbọchị atọ na ọkara gafesịrị, Chineke ga-eme ka Mmụọ ya na-enye ndụ banyekwa nʼime ha, ha bilitere ọtọ, oke egwu jidere ndị niile hụrụ ha.
Koma patapita masiku atatu ndi theka aja, mpweya wopatsa moyo wochoka kwa Mulungu unalowa mwa aneneriwo, ndipo anayimirira, ndipo amene anawaona anachita mantha aakulu.
12 Ha nụrụ oke olu si nʼeluigwe daa na-asị, “rigotanụ nʼelu.” Ha siri nʼigwe ojii, rigoro nʼeluigwe ebe ndị iro ha ga-anọ na-ele ha anya.
Kenaka aneneri aja anamva mawu ofuwula ochokera kumwamba owawuza kuti, “Bwerani kuno.” Ndipo anapitadi kumwamba mu mtambo adani awo aja akuwaona.
13 Ma nʼotu oge ahụ, nʼotu awa ahụ, ala ọma jijiji dịkarịsịrị oke egwu mara nke mere ka otu akụkụ nʼime akụkụ iri nke obodo ahụ niile daa. Ndị nwụrụ nʼoge ala ọma jijiji a dịkwa puku mmadụ asaa. Ma ndị niile fọdụrụ sitere nʼoke egwu nye Chineke nke eluigwe otuto.
Nthawi yomweyo panachitika chivomerezi choopsa mwakuti chigawo chimodzi cha magawo khumi a mzinda chinagwa. Anthu 7,000 anaphedwa ndi chivomerezicho, ndipo opulumukawo anachita mantha kwambiri nayamba kutamanda Mulungu wakumwamba.
14 Ugbu a ahụhụ nke abụọ ahụ agafeela. Ma mgbe na-adịghị anya, ahụhụ nke atọ na-abịa.
Tsoka lachiwiri lapita; koma tsoka lachitatu likubwera posachedwapa.
15 Ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya, oke olu dị iche iche dara ike ike nʼeluigwe, na-asị, “Alaeze niile nke ụwa abụrụla alaeze Onyenwe anyị, na nke Kraịst ya. Ya onwe ya ga-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.” (aiōn g165)
Mngelo wachisanu ndi chiwiri anawomba lipenga lake, ndipo kumwamba kunamveka mawu ofuwula amene anati, “Ufumu wa dziko lapansi uli mʼmanja mwa Ambuye athu ndi Khristu wake uja, ndipo adzalamulira mpaka muyaya.” (aiōn g165)
16 Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ nọ nʼocheeze ndị ahụ dị nʼihu ocheeze Chineke dara nʼala kpọọ isiala nye Chineke,
Ndipo akuluakulu 24 aja okhala pa mipando yawo yaufumu pamaso pa Mulungu, anadzigwetsa chafufumimba napembedza Mulungu
17 na-asị, “Anyị na-enye gị otuto, gị Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-adị, na onye dịkwaarị, nʼihi na i werela oke ike gị niile nʼaka gị malitekwa ịchị ọchịchị.
Iwo anati, “Ife tikuyamika Inu Ambuye Mulungu Wamphamvuzonse, amene mulipo ndipo munalipo, chifukwa mwaonetsa mphamvu yanu yayikulu, ndipo mwayamba kulamulira.
18 Mba niile were oke iwe megide gị, ma ugbu a bụ oge gị iweso ha iwe dị ọkụ. Ugbu a bụ oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe na ịkwụghachi ndị ohu gị bụ ndị amụma ụgwọ ọrụ ha, na ndị nsọ na ndị gị niile, bụ ndị na-atụ egwu aha gị, bụ ndị dị nta na ndị dị ukwuu. Oge eruokwala mgbe ịla nʼiyi ndị na-emebi ụwa ga-adị.”
A mitundu ina anapsa mtima; koma yafika nthawi yoonetsa mkwiyo. Nthawi yakwana yoweruza anthu akufa, yopereka mphotho kwa atumiki anu, aneneri, anthu oyera mtima anu ndi amene amaopa dzina lanu, wamngʼono pamodzi ndi wamkulu yemwe. Yafika nthawi yowononga amene awononga dziko lapansi.”
19 Mgbe ahụ kwa, e meghere ụlọnsọ Chineke nke dị nʼeluigwe. A hụkwara igbe ọgbụgba ndụ nʼime ya. Nʼotu oge ahụ kwa, egbe eluigwe malitere ịgba, amụma gbukwara. Oke ifufe bidokwara ife. Oke ala ọma jijiji na akụmmiri igwe mere mkpọtụ nke ukwuu.
Pamenepo anatsekula Nyumba ya Mulungu kumwamba ndipo mʼkati mwake munaoneka Bokosi la Chipangano. Kenaka kunachita mphenzi, phokoso, mabingu, chivomerezi ndipo kunachita mkuntho wamatalala akuluakulu.

< Mkpughe 11 >