< Abụ Ọma 99 >

1 Onyenwe anyị bụ eze, ka mba niile maa jijiji! O wuru ocheeze ya nʼetiti cherubim, ka elu ụwa maa jijiji.
Yahwe anatawala; mataifa na yatetemeke. Ameketi juu ya makerubi; nchi inatetemeka.
2 Onyenwe anyị dị ukwuu nʼime Zayọn; ọ bụ onye e buliri elu karịa mba niile dị iche iche.
Yahwe ni mkuu katika Sayuni; naye ametukuka juu ya mataifa yote.
3 Ka ha too aha gị nke dị ukwuu, dịkwa oke egwu, ọ dị nsọ.
Nao walisifu jina lako kuu na lenye kutisha; yeye ni mtakatifu.
4 Eze bụ onye dị ike, ọ hụrụ ikpe ziri ezi nʼanya, i meela ka ihe ziri ezi guzosie ike; nʼime Jekọb ka i mere ihe ziri ezi na ihe dị mma.
Mfalme ana nguvu, naye hupenda haki. Wewe umeimarisha haki; umetenda haki na hukumu katika Yakobo.
5 Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu, feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya; ọ dị nsọ.
Msifuni Yahwe Mungu wetu na sujuduni miguuni pake. Yeye ni mtakatifu.
6 Mosis na Erọn so nʼetiti ndị nchụaja ya, Samuel sokwa nʼetiti ndị kpọkuru aha ya; ha kpọkuru Onyenwe anyị ọ zakwara ha.
Musa na Haruni walikuwa miongoni mwa makuhani wake, na Samweli alikuwa miongoni mwa wale walio muomba Yeye. Walimuomba Yahwe, naye akawajibu.
7 Ọ gwara ha okwu site nʼogidi igwe ojii. Ha debere ụkpụrụ ya na iwu niile o nyere ha.
Alizungumza nao toka nguzo ya wingu. Walizishika amri zake takatifu na sheria ambazo aliwapatia.
8 O Onyenwe anyị, Chineke anyị, ị zara ha; ị bụụrụ Izrel Chineke onye na-agbaghara mmehie, nʼagbanyeghị na ị tara ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.
Wewe uliwajibu, Yahwe Mungu wetu. Ulikuwa kwao Mungu mwenye kusamehe, lakini uliye adhibu matendo yao ya dhambi.
9 Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu; na-efe ya ofufe nʼelu ugwu ya dị nsọ, nʼihi na onye dị nsọ ka Onyenwe anyị Chineke anyị bụ.
Msifuni Yahwe Mungu wetu, na mwabuduni kwenye mlima wake mtakatifu, maana Yahwe Mungu wetu ni Mtakatifu.

< Abụ Ọma 99 >