< Abụ Ọma 80 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ” Abụ Ọma nke Asaf. Nụrụ olu anyị, O Onye ọzụzụ atụrụ nke Izrel, gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ. Gị onye na-anọdụ dịka eze, nʼetiti cherubim, nwupụta Ìhè
Kwa mwimbishaji. Mtindo wa “Yungiyungi za Agano.” Zaburi ya Asafu. Ee Mchungaji wa Israeli tusikie, wewe umwongozaye Yosefu kama kundi; wewe uketiye katika kiti cha enzi katikati ya makerubi, angaza
2 nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase. Kpọtee ịdị ike gị, bịa zọpụta anyị.
mbele ya Efraimu, Benyamini na Manase. Uamshe nguvu zako, uje utuokoe.
3 O Chineke, kpọghachi anyị azụ, mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
Ee Mungu, uturejeshe, utuangazie uso wako, ili tuweze kuokolewa.
4 O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ruo ole mgbe ka iwe gị ga-adị ọkụ megide ekpere ndị gị?
Ee Bwana Mungu Mwenye Nguvu Zote, hata lini hasira yako itawaka na kufoka moshi dhidi ya maombi ya watu wako?
5 I jirila anya mmiri dịka a ga-asị na ọ bụ achịcha zụọ ha nri; i meela ka ha ṅụọ anya mmiri nʼihe ọtụtụ.
Umewalisha kwa mkate wa machozi, umewafanya wanywe machozi bakuli tele.
6 I meela ka anyị bụrụ ihe na-eweta esemokwu nʼetiti ndị agbataobi anyị, ndị iro anyị na-achịkwa anyị ọchị.
Tumekuwa chanzo cha ugomvi kwa jirani zetu, na adui zetu wanatudhihaki.
7 O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọghachi anyị azụ, mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
Ee Mungu Mwenye Nguvu Zote, uturejeshe; utuangazie uso wako, nasi tuweze kuokolewa.
8 I sitere nʼala Ijipt wepụta osisi vaịnị; ị chụpụrụ mba ndị ọzọ, kụọ ya.
Ulileta mzabibu kutoka Misri, ukawafukuza mataifa, ukaupanda.
9 Ị sụchaara ya ala, mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile.
Uliandaa shamba kwa ajili yake, mizizi ikawa imara, ukajaza nchi.
10 Ndo ya kpuchiri ugwu niile, alaka ya gbasara kpuchie osisi sida ukwu sida.
Milima ilifunikwa kwa kivuli chake, matawi yake yakafunika mierezi mikubwa.
11 Ọ wasaala alaka ya ruo oke osimiri wasaakwa ume ya ruo osimiri.
Matawi yake yalienea mpaka Baharini, machipukizi yake mpaka kwenye Mto.
12 Gịnị mere i ji tiwasịa mgbidi ya niile si otu a mee ka ndị niile na-agafe ghọrọ mkpụrụ ya?
Mbona umebomoa kuta zake ili wote wapitao karibu wazichume zabibu zake?
13 Oke ezi si nʼoke ọhịa na-emebisi ya, ụmụ ahụhụ si nʼọhịa dị iche iche na-ejikwa ya emere ihe oriri.
Nguruwe mwitu wanauharibu na wanyama wa kondeni hujilisha humo.
14 Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ! Letakwa osisi vaịnị a,
Turudie, Ee Mungu Mwenye Nguvu Zote! Tazama chini kutoka mbinguni na uone! Linda mzabibu huu,
15 mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ, ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị.
mche ulioupanda kwa mkono wako wa kuume, mwana uliyemlea kwa ajili yako mwenyewe.
16 E gbutuola osisi vaịnị gị, e ji ọkụ repịa ya; mgbe ị bara mba, ndị gị na-ala nʼiyi.
Mzabibu wako umekatwa, umechomwa moto, unapowakemea, watu wako huangamia.
17 Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị, nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị.
Mkono wako na utulie juu ya mtu aliyeko mkono wako wa kuume, mwana wa mtu uliyemlea kwa ajili yako mwenyewe.
18 Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ; tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị.
Ndipo hatutakuacha tena, utuhuishe, nasi tutaliitia jina lako.
19 Kpọghachi anyị azụ, O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike zọpụta anyị.
Ee Bwana Mungu Mwenye Nguvu Zote, uturejeshe; utuangazie uso wako, ili tuweze kuokolewa.

< Abụ Ọma 80 >