< Abụ Ọma 8 >

1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nʼusoro gittit. O Onyenwe anyị Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile! I meela ka ebube gị dị elu nʼime eluigwe.
Yahweh Bwana wetu, ni jinsi gani jina lako ni tukufu katika dunia yote, wewe ufunuaye utukufu wako juu mbinguni.
2 Site nʼotuto ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara, ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị, ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ.
Kutoka katika midomo ya watoto na vichanga umeumba sifa kwa sababu ya utukufu wako, ili kuwanyamazisha maadui wote na walipa kisasi wote.
3 Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe, hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ, mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando i tinyere nʼọnọdụ ha,
Ninapozitazama mbingu, ambazo vidole vyako vimeumba, mwezi na nyota, ambazo umeziweka kila mmoja katika nafasi yake,
4 gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta ha?
Binadamu ni nani hata umtazame, na watu hata uwajali wao?
5 I mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ, I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze.
Umewaumba chini kidogo kuliko viumbe vya mbinguni na umewazunguka na utukufu na heshima.
6 I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.
Umemfanya binadamu kutawala kazi ya mikono yako; umeviweka vitu vyote chini ya miguu yake:
7 Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi, na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile,
kondoo na ng'ombe wote, na hata wanyama wa porini,
8 na nnụnụ niile, na azụ niile, na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.
ndege wa angani, na samaki wa baharini, na vyote vipitavyo katika mikondo ya bahari.
9 O Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile.
Yahweh Bwana wetu, ni jinsi gani jina lako ni tukufu katika dunia yote!

< Abụ Ọma 8 >