< Abụ Ọma 74 >

1 Abụ maskil nke Asaf. Chineke, gịnị mere i ji jụ anyị ruo mgbe ebighị ebi? Gịnị mere iwe gị ji akwụ anwụrụ megide igwe atụrụ ndị ị na-azụ?
E KE Akua, o ke aha kau mea e mamao mau loa aku ai? No ke aha la e wela mai ai kou huhu i na hipa o kou aina?
2 Cheta mba ahụ nke ị zụtara na mgbe ochie, ebo ahụ bụ ihe nketa gị, ndị ị gbapụtara, nʼugwu Zayọn ebe i biri.
E hoomanao oe i kou ekalesia au i kuai kahiko loa ai, Ka ohana o kou hooilina au i kuai ai; O keia mauna Ziona kahi i noho ai oe.
3 Tụgharịa nzọ ụkwụ gị bịa na mbibi ebighị ebi ndị a. Ọ bụ onye iro wetara ịla nʼiyi a niile nʼụlọnsọ a.
E hoeu i kou wawae i ka neoneo mau ana; I na mea a pau a ka enemi i hana hewa ai iloko e kou wahi hoano.
4 Ndị iro gị gbọrọ ụja nʼebe i zutere anyị. Ha weliri ọkọlọtọ ha dịka ihe ịrịbama.
Ua uwo kou poe enemi iloko o na anaina; Ua kau lakou i ko lakou mau hae i hoailona.
5 Ha kpara agwa dịka ndị ikom ji anyụike ha ga-eji gbutuo ọtụtụ osisi dị nʼoke ọhịa.
Kaulana aku la ke kanaka, E like me kona hapai ana i na koi i na laau paapu.
6 Ha ji anyụike na egbugbu ha kụjisie ihe niile eji amachi ihe bụ nke egbunyere ihe.
Aka ano, ke wawahi nei lakou i kona mea i kalaiia, Me na koi a me na hamare.
7 Ha kpọkwara ụlọnsọ gị ọkụ, mee ya ka o repịa. Ha merụrụ ụlọ obibi ahụ a kpọkwasịrị aha gị.
Ua hoolei lakou i ke ahi iloko o kou wahi hoano, Ua hoohaumia lakou ilalo i ka lepo i ka halelewa o kou inoa.
8 Ha sịrị nʼobi ha, “Anyị ga-etipịa ha kpamkpam!” Ha kpọrọ ebe niile a na-anọ efe Chineke nʼala a ọkụ.
I iho la lakou ma ko lakou naau, E luku pu kakou ia lakou; Ua hoopau i ke ahi i na halehalawai a pau o ke Akua ma ka aina.
9 Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke. Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ.
Aole kakou i ike i ko kakou mau hoailona; Aole he kaula hou ae; Aohe mea iwaena o kakou i ike i ka loihi ana.
10 O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị? Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi?
E ke Akua, pehea ka loihi o ko ka enemi hoino ana mai? E hoino wale anei ka enemi i kou inoa i ka manawa pau ole?
11 Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị? Sepụta aka gị laa ha nʼiyi!
No ke aha la oe i hoihoi aku ai i kou lima, i kou lima akau? E unuhi ae ia mai loko ae o kou poli.
12 Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie. Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa.
No ka mea, o ke Akua ko'u Alii mai kinohi mai, E hana ana ma ke ola iwaena o ka honua.
13 Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ. Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ nʼime mmiri.
Hookaawale ae la oe i ke kai me kou ikaika: Wawahi iho la oe i na poo o na kerokodila ma na wai.
14 Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ a na-akpọ leviatan, mee ka ọ ghọọ nri nye ụmụ anụmanụ bi nʼọzara.
Ulupa iho la oe i na poo o ka leviatana, A haawi ia ia i ai na na kanaka o ka waonahele.
15 Ọ bụ gị mere ka isi iyi na mmiri iyi na-asọ. I mere ka osimiri na-eru eru mgbe niile taa.
Hookaawale ae la oe i ke kumuwai me ka muliwai: Hoomaloo iho la oe i na waikahe ikaika.
16 Ehihie na abalị bụ nke gị. I mere ka anyanwụ na ọnwa guzosie ike.
Nou no ke ao, nou no hoi ka po: Ua hoomakaukau oe i ka malamalama a me ka la.
17 Ọ bụ gị kewapụtara oke ala niile nke ụwa. Ọ bụ gị mere ka ọkọchị na udu mmiri dị.
Ua hoonohonoho oe i na palena a pau o ka honua; Ua hana hoi oe i ka hoilo a me ka makalii.
18 O Onyenwe anyị, cheta otu onye iro si chịa gị ọchị, na otu ndị nzuzu si kwaa aha gị emo.
E hoomanao oe i keia, ua hoino wale ka enemi, e Iehova, A ua kuamuamu wale na kanaka naaupo i kou inoa.
19 Ewerala ndụ nduru gị nyefee anụ ọhịa ọjọọ nʼaka. Echefukwala ndụ ndị gị a na-akpagbu ruo mgbe ebighị ebi.
Mai noho a haawi i ka uhane o kau manu nunu i ka poe ino: Mai hoopoina mau loa i ke anaina o kou poe ilihune.
20 Chetakwa ọgbụgba ndụ gị, nʼihi na ihe ike na-ejupụta ebe niile gbara ọchịchịrị nʼala a.
E manao mai oe i ka berita; No ka mea, ua paapu na wahi pouli o ka honua i na wahi e noho ai ka lalauwale.
21 Ekwela ka ndị a na-akpagbu gbaghachi azụ nʼihere; ka ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa too aha gị.
Mai noho a hoi hou ka poe i hooluhihewaia me ka hilahila; Aka, e hoolea aku i kou inoa ka poe ilihune a me ka haahaa.
22 O Chineke, bilie, kpechitara onwe gị ikpe. Chetakwa otu ndị nzuzu si kọọ gị ọnụ ogologo ụbọchị niile.
E ku iluna, e ko Akua, e hakaka i ko'u hakaka: E hoomanao i ko ke kanaka naaupo hoino wale ana ia oe i na la a pau.
23 Elepụla mkpọtụ nke ndị iro gị niile anya, olu mkpọtụ nke ndị iro gị na-aga nʼihu na-ala elu.
Mai hoopoina i ka leo o kou poe enemi: Ke mahuahua mai nei ka haunaele ana o ka poe ku e ia oe.

< Abụ Ọma 74 >