< Abụ Ọma 70 >

1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke Devid. Arịrịọ. O Chineke, gbata ọsọ bịa zọpụta m, O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.
[For the Chief Musician. By David. A reminder.] Hurry, God, to deliver me. Come quickly to help me, LORD.
2 Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara. Ka ndị ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m laghachi azụ nʼihere.
Let them be put to shame and confounded who seek my soul. Let those who desire my ruin be turned back in disgrace.
3 Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!” laghachi azụ nʼihi ihere ha.
Let them be turned back because of their shame who say to me, "Aha. Aha."
4 Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị, ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “Onyenwe anyị dị ukwuu.”
Let all those who seek you rejoice and be glad in you. Let those who love your salvation continually say, "Let God be exalted."
5 Ma mụ onwe m bụ ogbenye na onye nọ na mkpa; O Chineke, mee ngwangwa bịakwute m. Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; O Onyenwe anyị, anọla ọdụ ịbịa.
But I am poor and needy. Come to me quickly, God. You are my help and my deliverer. LORD, do not delay.

< Abụ Ọma 70 >