< Abụ Ọma 66 >

1 Abụ dịrị onyeisi abụ. Otu Abụ. Abụ Ọma. Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke!
聖歌隊の指揮者によってうたわせた歌、さんび 全地よ、神にむかって喜び呼ばわれ。
2 Bụọ abụ banyere ebube aha ya; meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube!
そのみ名の栄光を歌え。栄えあるさんびをささげよ。
3 Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu! Ike gị dị nnọọ ukwu, ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ.
神に告げよ。「あなたのもろもろのみわざは恐るべきかな。大いなるみ力によって、あなたの敵はみ前に屈服し、
4 Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị; ha na-abụku gị abụ otuto, ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” (Sela)
全地はあなたを拝み、あなたをほめうたい、み名をほめうたうであろう」と。 (セラ)
5 Bịa lee ihe Chineke mere, ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ!
来て、神のみわざを見よ。人の子らにむかってなされることは恐るべきかな。
6 O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ, ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee; bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya.
神は海を変えて、かわいた地とされた。人々は徒歩で川を渡った。その所でわれらは神を喜んだ。
7 Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya, anya ya na-elekwa mba niile, ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. (Sela)
神は大能をもって、とこしえに統べ治め、その目はもろもろの国民を監視される。そむく者はみずからを高くしてはならない。 (セラ)
8 Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile, kwere ka a nụ ụda otuto ya;
もろもろの民よ、われらの神をほめよ。神をほめたたえる声を聞えさせよ。
9 O chebela ndụ anyị, ma mee ka ụkwụ anyị ghara ịmịchapụ.
神はわれらを生きながらえさせ、われらの足のすべるのをゆるされない。
10 Nʼihi na ọ bụ gị, O Chineke, nwara anyị; ị nụchara anyị dịka ọlaọcha.
神よ、あなたはわれらを試み、しろがねを練るように、われらを練られた。
11 Ị kpọbatara anyị nʼụlọ mkpọrọ, ma bokwasị ibu dị arọ nʼazụ anyị.
あなたはわれらを網にひきいれ、われらの腰に重き荷を置き、
12 I kwere ka ndị mmadụ rịa anyị elu; anyị esitela nʼime ọkụ na nʼime mmiri gafee. Ị kpọbatala anyị ebe anyị nwezuru ihe niile.
人々にわれらの頭の上を乗り越えさせられた。われらは火の中、水の中を通った。しかしあなたはわれらを広い所に導き出された。
13 Aga m e ji aja nsure ọkụ bata nʼime ụlọnsọ ukwu gị, imezu nkwa m kwere gị
わたしは燔祭をもってあなたの家に行き、わたしの誓いをあなたに果します。
14 nʼihi na nke a bụ ihe m ji ọnụ m kwuo, ọ bụkwa nke a ka egbugbere ọnụ m kwupụtara na m ga-eme nʼoge nsogbu m.
これはわたしが悩みにあったとき、わたしのくちびるの言い出したもの、わたしの口が約束したものです。
15 Aga m eji anụ ndị gbara abụba chụọrọ gị aja, ya na aja onyinye nke ọtụtụ ebule; Aga m achụkwa aja onyinye nke ọtụtụ oke ehi na mkpi. (Sela)
わたしは肥えたものの燔祭を雄羊のいけにえの煙と共にあなたにささげ、雄牛と雄やぎとをささげます。 (セラ)
16 Bịanụ nụrụ, unu niile na-atụ egwu Chineke; ka m kọọrọ unu ihe o meere m.
すべて神を恐れる者よ、来て聞け。神がわたしのためになされたことを告げよう。
17 Eji m ọnụ m kpọkuo ya; otuto ya dị m nʼire.
わたしは声をあげて神に呼ばわり、わが舌をもって神をあがめた。
18 Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m, Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị;
もしわたしが心に不義をいだいていたならば、主はお聞きにならないであろう。
19 ma Chineke gere ntị nʼezie, nụrụkwa olu arịrịọ m.
しかし、まことに神はお聞きになり、わが祈の声にみこころをとめられた。
20 Otuto dịrị Chineke, onye na-ajụghị ekpere m maọbụ ghara izi m ịhụnanya ya!
神はほむべきかな。神はわが祈をしりぞけず、そのいつくしみをわたしから取り去られなかった。

< Abụ Ọma 66 >