< Abụ Ọma 54 >

1 Abụ Ọma Devid. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. Mgbe ndị Zif gara sị Sọl, “Devid ọ dịghị ezo nʼetiti anyị?” O Chineke, jiri aha gị zọpụta m; jirikwa ike gị kpepụta m.
다윗의 마스길, 영장으로 현악에 맞춘 노래, 십 인이 사울에게 이르러 말하기를 다윗이 우리 곳에 숨지 아니하였나이까 하던 때에 하나님이여 주의 이름으로 나를 구원하시고 주의 힘으로 나를 판단하소서
2 O Chineke, nụrụ ekpere m; gee ntị nʼokwu ọnụ m.
하나님이여 내 기도를 들으시며 내 입의 말에 귀를 기울이소서
3 Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha; ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m, ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. (Sela)
외인이 일어나 나를 치며 강포한 자가 내 생명을 수색하며 하나님을 자기 앞에 두지 아니하였음이니이다(셀라)
4 Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m; onyenwe m bụ onye na-agba m ume.
하나님은 나의 돕는 자시라 주께서 내 생명을 붙드는 자와 함께 하시나이다
5 Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m; nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi.
주께서 내 원수에게 악으로 갚으시리니 주의 성실하심으로 저희를 멸하소서
6 Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja; O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma.
내가 낙헌제로 주께 제사하리이다 여호와여 주의 이름에 감사하오리니 주의 이름이 선하심이니이다
7 Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile, ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya.
대저 주께서 모든 환난에서 나를 건지시고 내 원수가 보응받는 것을 나로 목도케 하셨나이다

< Abụ Ọma 54 >