< Abụ Ọma 42 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Maskil nke ụmụ Kora. Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele, otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke.
Kama ayala ayatamanivyo maji ya mto. ndivyo hivyo ninakiu yako, Mungu.
2 Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ. Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke?
Ninakiu yako Mungu, Mungu uliye hai, ni lini nitaonekana mbele zako?
3 Anya mmiri m aghọọlara m ihe oriri nʼehihie ma nʼabalị, mgbe ndị mmadụ na-asị m ogologo ụbọchị niile, “Olee ebe Chineke gị nọ?”
Machozi yangu yamekuwa ni chakula changu mchana na usiku, wakati maadui zangu siku zote wanasema, “Yuko wapi Mungu wako?”
4 Ihe ndị a ka m na-echeta mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m: ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga, mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi, na-aga nʼụlọ Chineke.
Mambo haya niayakumbuka ninapoumimina roho yangu: nilipoenda na umati wa watu na kuwaongoza kwenye nyumba ya Mungu kwa sauti ya shangwe na kusifu, ni wengi tulisherekea.
5 O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya, Onye nzọpụta m na Chineke m.
Roho yangu, kwa nini unainama? Kwa nini unahuzuni ndani yangu? Mtumaini Mungu, Kwa kuwa kwa mara nyingine nitamsifu yeye ambaye ni wokovu wangu.
6 Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m; ya mere, aga m echeta gị site nʼala Jọdan, na ebe dị elu nke Hemon, na sitekwa nʼugwu Miza.
Mungu wangu, roho yangu imeinama ndani yangu, kwa hiyo ninakukumbuka toka nchi ya Yordani, toka kwenye vilele vitatu vya mlima Hermoni, na toka mlima wa Mizari.
7 Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile; ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile ekpuchiela isi m.
Kina huita kina kwenye kelele za maporomoko ya maji yako; mawimbi na mafuriko yako yote yako juu yangu.
8 Nʼehihie, Onyenwe anyị na-awụkwasị m ịhụnanya ya, nʼabalị abụ ya dị m nʼobi, ekpere nye Chineke nke ndụ m.
Wakati wa mchana Yahwe ataamuru uaminifu wa agano lake; na usiku wimbo wake utakuwa nami, ombi kwa Mungu wa uhai wangu.
9 Ana m asị Chineke, oke nkume m, “Gịnị mere i ji chefuo m? Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ nʼihi mmegbu nke onye iro?”
Nami nitasema kwa Mungu wangu, mwamba wangu, “Kwa nini umenisahau? Kwa nini ninaenenda katika maombolezo kwa sababu ya ukandamizaji wa adui yangu?”
10 Ọkpụkpụ m na-agabiga oke ihe mgbu, mgbe ndị iro m ji m na-eme ihe ọchị, ogologo ụbọchị niile ha na-ajụ m, “Olee ebe Chineke gị nọ?”
Kama upanga mifupani pangu, maadui zangu wananikemea, siku zote wakiniambia, “Yuko wapi Mungu wako?”
11 O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ, Onye nzọpụta m na Chineke m.
Roho yangu, kwa nini umeinama chini? Kwa nini unahuzuni ndani yangu? Mtumaini Mungu kwa kuwa nitamsifu tena yeye aliye wokovu wangu na Mungu wangu.

< Abụ Ọma 42 >