< Abụ Ọma 33 >
1 Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume; nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya.
Thokozani eNkosini, balungileyo. Ukudumisa kubafanele abaqotho.
2 Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị; werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu.
Dumisani iNkosi ngechacho, lihlabelele kuyo ngogubhu olulentambo ezilitshumi.
3 Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ; were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ.
Ihlabeleleni ingoma entsha, litshaye kuhle ngenhlokomo.
4 Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu; o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile.
Ngoba ilizwi leNkosi liqotho, lomsebenzi wayo wonke ngowobuqotho.
5 Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya; ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ.
Ithanda ukulunga lesahlulelo; umhlaba ugcwele umusa weNkosi.
6 Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile, jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile.
Ngelizwi leNkosi amazulu enziwa, lalo lonke ibutho lawo ngomoya womlomo wayo.
7 Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe, kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọakụ dị ukwuu.
Ibuthelela amanzi olwandle njengenqumbi, ifake inziki eziphaleni.
8 Ka ụwa niile tụọ Onyenwe anyị egwu; ka mmadụ niile bi nʼụwa sọpụrụ ya.
Umhlaba wonke kawuyesabe iNkosi, bonke abakhileyo bomhlaba kabathuthumele ngayo.
9 Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara; o nyere iwu, iwu ahụ guzokwara chịm.
Ngoba yona yakhuluma, kwaba khona; yona yalaya, kwema.
10 Onyenwe anyị na-emebi atụmatụ mba niile; ọ na-emebi ebumnobi ụmụ mmadụ.
INkosi ichitha icebo lezizwe, iphuthisa imicabango yabantu.
11 Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ebumnobi ya ruo ọgbọ niile.
Icebo leNkosi limi kuze kube nininini, imicabango yenhliziyo yayo ezizukulwaneni ngezizukulwana.
12 Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha; bụ ndị ọ họpụtara ka ha bụrụ ihe nketa ya.
Sibusisiwe isizwe esiNkulunkulu waso yiNkosi, abantu ebakhethileyo baba yilifa layo.
13 Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya. Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya.
INkosi iyakhangela phansi isemazulwini, ibone bonke abantwana babantu.
14 O sitere nʼebe obibi ya na-ele onye ọbụla bi nʼelu ụwa anya.
Isendaweni emisiweyo yokuhlala kwayo ikhangela bonke abakhileyo bomhlaba.
15 Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu; ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme.
Ibumba inhliziyo yabo bonke, inanzelele zonke izenzo zabo.
16 Ọnụọgụgụ ndị agha eze apụghị ịzọpụta ya; o nweghị onye agha ọbụla na-azọpụta onwe ya, site nʼịdị ukwuu nke ike ya.
Kayikho inkosi esindiswa yibunengi bebutho, iqhawe kalikhululwa ngamandla amakhulu.
17 Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha. Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha.
Ibhiza liyize ekunqobeni, njalo kalikhululi ngobukhulu bamandla alo.
18 Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche, ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ.
Khangela, ilihlo leNkosi liphezu kwabayesabayo, kwalabo abathembela emuseni wayo,
19 Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ. Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ.
ukukhulula umphefumulo wabo ekufeni, lokubaphilisa endlaleni.
20 Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị; ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị.
Umphefumulo wethu ulindela iNkosi; ilusizo lwethu lesihlangu sethu.
21 Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya; nʼihi na anyị tụkwasịrị aha nsọ ya obi.
Ngoba inhliziyo yethu izathokoza kuyo, ngoba sithembele ebizweni layo elingcwele.
22 O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị, dịka olileanya anyị dị na gị.
Umusa wakho, Nkosi, kawube phezu kwethu, njengokulindela kwethu kuwe.