< Abụ Ọma 24 >
1 Abụ Ọma Devid. Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị; ụwa na ndị niile bi nʼime ya.
NO Iehova ka honua a me kona mea e piha ai; O ke ao nei, a me ka poe e noho ana maloko ona.
2 Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile, o mekwara ka o guzosie ike.
No ka mea, nana no ia i hookumu maluna iho o na kai, A i hoopaa hoi maluna iho o na wai.
3 Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị? Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya?
Owai la ka mea e pii i ka mauna o Iehova? Owai la hoi ke ku ma kona wahi hoano?
4 Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha, onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị, maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ.
O ka mea lima paumaele ole a me ka naau maemae; O ka mea i paulele ole kona uhane i ka mea lapuwale; Aole hoi i hoohiki i ke Akua me ka wahahee:
5 Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị, natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha.
Oia ka mea e hoomaikaiia mai e Iehova, A e hooponoia mai hoi e kona Akua e ola'i.
6 Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya, bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. (Sela)
Oia ka hanauna o ka poe i imi ia ia, I huli hoi i kou alo, e ke Akua o Iakoba. (Sila)
7 Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, meenụ ka isi unu bụrụ ihe e welitere, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka eze ebube nwee ike ịbata.
E hapai ae, e na pani, i ko oukou mau poo; E hookiekieia'e hoi oukou, e na ipuka mau loa; A e komo no hoi ke Alii nani.
8 Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dimkpa na dike. Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dike nʼagha.
Owai la ia Alii nani? O Iehova ka ikaika a me ka mana; O Iehova ka mea mana i ke kaua.
9 Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, buliekwanụ ha elu, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka Eze ebube nwee ike ịbatakwa.
E hapai ae, e na pani, i ko oukou mau poo, E hookiekieia'e oukou, e na ipuka mau loa; A e komo no hoi ke Alii nani.
10 Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ya bụ Eze ebube! (Sela)
Owai la ia Alii nani? O Iehova Sabaota, oia ke Alii nani. (Sila)