< Abụ Ọma 20 >
1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị; ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị.
Kwa mwimbishaji. Zaburi ya Daudi. Bwana na akujibu unapokuwa katika dhiki, jina la Mungu wa Yakobo na liwe kinga yako.
2 Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka, ma site na Zayọn kwagide gị.
Na akutumie msaada kutoka patakatifu na akupatie msaada kutoka Sayuni.
3 Ya chetakwa aja niile ị chụrụ, ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. (Sela)
Na azikumbuke dhabihu zako zote, na azikubali sadaka zako za kuteketezwa.
4 Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ, mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma.
Na akujalie haja ya moyo wako, na aifanikishe mipango yako yote.
5 Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri, buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile.
Tutashangilia kwa furaha utakaposhinda, tutainua bendera zetu kwa jina la Mungu wetu. Bwana na akupe haja zako zote.
6 Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ; ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya, zọpụta ma zakwaa ya.
Sasa nafahamu kuwa Bwana humwokoa mpakwa mafuta wake, humjibu kutoka mbingu yake takatifu kwa nguvu za wokovu wa mkono wake wa kuume.
7 Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha; ma anyị na-atụkwasị aha Onyenwe anyị, Chineke anyị, obi.
Wengine wanatumaini magari ya vita, na wengine farasi, bali sisi tutalitumainia jina la Bwana, Mungu wetu.
8 Ha na-egbu ikpere nʼala ma daa, ma anyị ga-ebili, kwụrụ chịm.
Wao wameshushwa chini na kuanguka, bali sisi tunainuka na kusimama imara.
9 O Onyenwe anyị, zọpụta eze! Zakwaa anyị mgbe anyị kpọkuru gị!
Ee Bwana, mwokoe mfalme! Tujibu tunapokuita!