< Abụ Ọma 19 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke; mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya.
Kwa kiongozi wa muziki. Zaburi ya Daudi. Mbingu za tangaza utukufu wa Mungu, na mawingu hufanya kazi ya mikono yake ijulikane!
2 Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu, ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma.
Siku hadi siku hotuba hutokea; usiku hadi usiku hufunua maarifa.
3 Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu, ma a na-anụ ụda ha.
Hakuna hotuba wala misemo; sauti zao hazisikiki.
4 Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.
Bali maneno yao husambaa nje duniani kote, na hotuba zao hata mwisho wa dunia. Yeye ametengeneza hema kwa ajili ya jua kati yao.
5 Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta, dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi.
Jua liko kama mfano wa bwana harusi akitokea chumbani kwake na kama mtu shujaa ambaye hushangila pale anapokimbia mbio zake.
6 Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe, bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ. Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya.
Jua huchomoza kutokea upeo wa macho na likikatisha winguni kwenda jingine; hakuna chochote kinacho epuka joto lake.
7 Iwu Onyenwe anyị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.
Sheria ya Yahwe ni kamilifu, huokoa roho; ushuhuda wa Yahwe ni wa kuaminika, ukifanya hekima nyepesi.
8 Iwu Onyenwe anyị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè.
Maelekezo ya Yahwe ni ya hakika, yakiufanya moyo kuwa na furaha; amri ya Yahwe ni safi, ikileta mwanga kwenye macho yetu.
9 Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha, ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike, ha niile bụkwa ihe ziri ezi.
Hofu ya Yahwe ni safi, inadumu milele; amri za haki ya Yahwe ni za kweli na zote ni za hakika!
10 Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo, karịa ọlaedo a nụchara anụcha; ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.
Nazo zina thamani kuliko dhahabu, nazo ni tamu kuliko asali na matone ya asali kutoka sega la asali (sega la nyuki).
11 Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị; ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha.
Ndiyo, kupitia hizo mtumishi wako anaonywa; na katika kuziamini kuna thawabu.
12 Onye pụrụ ịghọta amaghị ama ya niile? Gbaghara m ihe niile zoro ezo nke adịghị ike m.
Ni nani ambaye aweza kuyatambua makosa yake yote mwenyewe? Unitakase makosa yaliyo fichika.
13 Chebe m, ka m ghara ilezi anya mehie megide gị. Ekwela ka ha na-achị achị na ndụ m. Mgbe ahụ ka m ga-abụ onye zuruoke, onye nwere onwe ya site nʼebe ihe ọjọọ niile nke mmehie dị.
Pia umuepushe mtumishi wako na dhambi za majivuno; usiziruhusu kunitawala. Ndipo nitakuwa mkamilifu, na mimi sitakuwa na hatia ya makosa mengi.
14 Kwere Onyenwe anyị, Onye mgbapụta m, na Oke nkume nchebe m, ka okwu ọnụ m niile, na echiche obi m niile, bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, na nke ị na-anabata.
Maneno ya midomo yangu na mawazo ya moyo wangu nayakubalike machoni pako, ewe Yahwe, mwamba wangu na mkombozi wangu.

< Abụ Ọma 19 >