< Abụ Ọma 19 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke; mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya.
다윗의 시, 영장으로 한 노래 하늘이 하나님의 영광을 선포하고 궁창이 그 손으로 하신 일을 나타내는도다
2 Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu, ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma.
날은 날에게 말하고 밤은 밤에게 지식을 전하니
3 Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu, ma a na-anụ ụda ha.
언어가 없고 들리는 소리도 없으나
4 Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.
그 소리가 온 땅에 통하고 그 말씀이 세계 끝까지 이르도다 하나님이 해를 위하여 하늘에 장막을 베푸셨도다
5 Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta, dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi.
해는 그 방에서 나오는 신랑과 같고 그 길을 달리기 기뻐하는 장사 같아서
6 Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe, bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ. Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya.
하늘 이 끝에서 나와서 하늘 저 끝까지 운행함이여 그 온기에서 피하여 숨은 자 없도다
7 Iwu Onyenwe anyị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.
여호와의 율법은 완전하여 영혼을 소성케 하고 여호와의 증거는 확실하여 우둔한 자로 지혜롭게 하며
8 Iwu Onyenwe anyị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè.
여호와의 교훈은 정직하여 마음을 기쁘게 하고 여호와의 계명은 순결하여 눈을 밝게 하도다
9 Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha, ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike, ha niile bụkwa ihe ziri ezi.
여호와를 경외하는 도는 정결하여 영원까지 이르고 여호와의 규례는 확실하여 다 의로우니
10 Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo, karịa ọlaedo a nụchara anụcha; ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.
금 곧 많은 정금보다 더 사모할 것이며 꿀과 송이꿀보다 더 달도다
11 Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị; ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha.
또 주의 종이 이로 경계를 받고 이를 지킴으로 상이 크니이다
12 Onye pụrụ ịghọta amaghị ama ya niile? Gbaghara m ihe niile zoro ezo nke adịghị ike m.
자기 허물을 능히 깨달을 자 누구리요 나를 숨은 허물에서 벗어나게 하소서
13 Chebe m, ka m ghara ilezi anya mehie megide gị. Ekwela ka ha na-achị achị na ndụ m. Mgbe ahụ ka m ga-abụ onye zuruoke, onye nwere onwe ya site nʼebe ihe ọjọọ niile nke mmehie dị.
또 주의 종으로 고범죄를 짓지 말게 하사 그 죄가 나를 주장치 못하게 하소서 그리하시면 내가 정직하여 큰 죄과에서 벗어나겠나이다
14 Kwere Onyenwe anyị, Onye mgbapụta m, na Oke nkume nchebe m, ka okwu ọnụ m niile, na echiche obi m niile, bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, na nke ị na-anabata.
나의 반석이시요 나의 구속자이신 여호와여 내 입의 말과 마음의 묵상이 주의 앞에 열납되기를 원하나이다

< Abụ Ọma 19 >