< Abụ Ọma 137 >

1 Nʼakụkụ iyi niile Babilọn ka anyị nọdụrụ ala kwaa akwa mgbe anyị chetara Zayọn.
Emifuleni yeBhabhiloni sahlala phansi khona, yebo sakhala inyembezi, lapho sikhumbula iZiyoni.
2 Ọ bụ nʼosisi pọpla ka anyị kokwasịrị ụbọ akwara anyị niile.
Amachacho ethu sawaphanyeka eminyezaneni phakathi kwayo.
3 Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ, ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ; ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!”
Ngoba khonapho abasithumbayo basicela amazwi engoma, labasimotshayo bacela injabulo besithi: Sihlabeleleni enye yezingoma zeZiyoni.
4 Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị ebe anyị nọ nʼala ọzọ?
Singahlabela njani ingoma yeNkosi elizweni lemzini?
5 Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem, ka aka nri m chefuo ǹka ya.
Uba ngikukhohlwa, Jerusalema, isandla sami sokunene kasikhohlwe ubungcitshi.
6 Ọ bụrụ na m echezọọ gị, ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche banyere Jerusalem, oke ọṅụ m, ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m.
Ulimi lwami kalunamathele elwangeni lwami, uba ngingakukhumbuli, uba ngingaphakamisi iJerusalema phezu kwentokozo yami enkulu.
7 Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm mere nʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha. “Tikpọsịa ya,” ka ha tiri, “Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!”
Khumbula, Nkosi, ngabantwana bakoEdoma, ngosuku lweJerusalema, abathi: Dilizani, dilizani, kuze kube sesisekelweni sayo.
8 Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi, ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị nʼihi ihe i mere anyị,
Ndodakazi yeBhabhiloni, ozabhujiswa, ubusisiwe ozaphindisela kuwe isenzo osenze kithi.
9 onye ahụ ga-achịrị ụmụ gị ndị na-aṅụ ara tụpịa ha nʼelu nkume.
Ubusisiwe ozabamba asakaze abantwana bakho edwaleni.

< Abụ Ọma 137 >