< Abụ Ọma 130 >

1 Abụ nrigo. O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa.
سرود درجات ای خداوند از عمقها نزد تو فریادبرآوردم.۱
2 Onyenwe anyị, nụrụ olu m. Ka ntị gị na-aṅakwa ntị nʼolu arịrịọ m, maka amara.
‌ای خداوند! آواز مرابشنو و گوشهای تو به آواز تضرع من ملتفت شود.۲
3 O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile, Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo?
‌ای یاه، اگر گناهان را به نظر آوری، کیست‌ای خداوند که به حضور تو بایستد؟۳
4 Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie dị; ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi.
لیکن مغفرت نزد توست تا از تو بترسند.۴
5 Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya, ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị.
منتظر خداوندهستم. جان من منتظر است و به کلام او امیدوارم.۵
6 Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ, e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ.
جان من منتظر خداوند است، زیاده از منتظران صبح؛ بلی زیاده از منتظران صبح.۶
7 Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide, nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa.
اسرائیل برای خداوند امیدوار باشند زیرا که رحمت نزدخداوند است و نزد اوست نجات فراوان.۷
8 Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrel site na mmehie ya niile.
و اواسرائیل را فدیه خواهد داد، از جمیع گناهان وی.۸

< Abụ Ọma 130 >