< Abụ Ọma 123 >

1 Abụ nrigo. Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị, gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe.
Nakuinulia macho yangu, wewe uketiye mbinguni.
2 Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya, na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje, otu a ka anyị si na-elekwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị anya, ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere.
Tazama, kama vile macho ya watumishi watazamapo kwenye mkono wa Bwana wao, na kama macho ya mjakazi yatazamapo mkono wa bibi yake, ndivyo hivyo macho yetu yanamtazama Yahwe mpaka atakapo tuhurumia.
3 Meere anyị ebere, O Onyenwe anyị, meere anyị ebere, nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha.
Ee Yahwe, utuhurumie, kwa maana tunadhalilishwa sana.
4 Nʼihi na nnagide anyị na-anagide ịchị ọchị ndị nganga, na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.
Tumeshibishwa mzaha wa wenye kiburi na dharau ya wenye majivuno.

< Abụ Ọma 123 >