< Abụ Ọma 110 >

1 Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị ya: “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.”
Psalmus David. Dixit Dominus Domino meo: Sede a dextris meis: Donec ponam inimicos tuos, scabellum pedum tuorum.
2 Onyenwe anyị ga-eme ka ike ọchịchị gị site na Zayọn ruo ala ndị ọzọ; ị ga-achị nʼetiti ndị iro gị niile.
Virgam virtutis tuæ emittet Dominus ex Sion: dominare in medio inimicorum tuorum.
3 Nʼụbọchị ị ga-ebu agha, ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị. Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe, bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ.
Tecum principium in die virtutis tuæ in splendoribus sanctorum: ex utero ante luciferum genui te.
4 Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe uche ya: “Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, nʼusoro Melkizedek.”
Iuravit Dominus, et non pœnitebit eum: Tu es sacerdos in æternum secundum ordinem Melchisedech.
5 Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị. Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya.
Dominus a dextris tuis, confregit in die iræ suæ reges.
6 Ọ ga-ekpe mba niile ikpe, na-atụkọta ndị nwụrụ anwụ, ma gwepịa ndị na-achị achị nʼelu ụwa niile.
Iudicabit in nationibus, implebit ruinas: conquassabit capita in terra multorum.
7 Ọ ga-aṅụ mmiri site nʼiyi nta nke dị nʼakụkụ ụzọ; nʼihi nke a, ọ ga-eweli isi ya elu.
De torrente in via bibet: propterea exaltabit caput.

< Abụ Ọma 110 >