< Abụ Ọma 103 >
1 Abụ Ọma Devid. Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya.
Bonga iNkosi, mphefumulo wami, lakho konke okuphakathi kwami kubonge ibizo layo elingcwele.
2 Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; echefukwala mmeso ọma ya niile,
Busisa iNkosi, mphefumulo wami, ungakhohlwa zonke izinzuzo zayo,
3 ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile,
ethethelela zonke izono zakho, eyelapha zonke izifo zakho,
4 onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze,
ehlenga impilo yakho ekubhujisweni, ekwethwesa umqhele womusa lezihawu,
5 onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile, ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo.
esuthisa umlomo wakho ngokuhle, ukuze ubutsha bakho buvuswe njengobokhozi.
6 Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ezi omume, na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu.
INkosi iyabenzela ukulunga lezahlulelo bonke abacindezelweyo.
7 O mere ka Mosis mata ụzọ ya, mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche:
Yamazisa uMozisi indlela zayo, abantwana bakoIsrayeli izenzo zayo.
8 Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara. Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya.
INkosi ilesihawu lomusa, iyaphuza ukuthukuthela, njalo ivame ububele.
9 Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta;
Kayiyikuphikisana njalonjalo, kayiyikugcina intukuthelo kuze kube nininini.
10 ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị.
Kayisenzelanga njengokwezono zethu, kayisiphindiselanga njengokweziphambeko zethu.
11 Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ.
Ngoba njengokuphakama kwamazulu ngaphezu komhlaba, umkhulu umusa wayo kubo abayesabayo.
12 Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ, otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ.
Njengobukhatshana bempumalanga kuyo intshonalanga, ngokunjalo izisusele khatshana lathi iziphambeko zethu.
13 Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ, otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,
Njengoyise ehawukela abantwana, iNkosi iyabahawukela labo abayesabayo.
14 nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ aja.
Ngoba iyakwazi ukubunjwa kwethu, ikhumbula ukuthi siluthuli.
15 Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa, ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa,
Umuntu, insuku zakhe zinjengotshani; njengeluba leganga, ngokunjalo uyakhahlela.
16 ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa, adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya.
Ngoba umoya wedlula phezu kwakhe, njalo angabikho, lendawo yakhe ingabe isamazi.
17 Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya. Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha,
Kodwa umusa weNkosi usukela ephakadeni usiya ephakadeni phezu kwabayesabayo, lokulunga kwayo kuze kube sebantwaneni babantwana,
18 nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi.
kubo abagcina isivumelwano sayo, lakubo abakhumbula imithetho yayo ukuyenza.
19 Onyenwe anyị emeela ka ocheeze ya guzosie ike nʼeluigwe, alaeze ya na-achị ihe niile.
INkosi imisile isihlalo sayo sobukhosi emazulwini, lombuso wayo ubusa phezu kwakho konke.
20 Toonu Onyenwe anyị, unu ndị mmụọ ozi ya, unu ndị dị ike ndị na-eme ihe ọ chọrọ, na-erubere okwu ya isi.
Busisani iNkosi, lina zingilosi zayo, maqhawe alamandla, ezenza ilizwi layo, lilalela ilizwi lelizwi layo.
21 Toonu Onyenwe anyị unu usuu ndị agha ya niile; unu ndị na-ejere ya ozi, ndị na-eme uche ya.
Bongani iNkosi, lonke mabandla ayo, zikhonzi zayo, ezenza intando yayo.
22 Toonu Onyenwe anyị, ọrụ aka ya niile nʼebe ọbụla ọ na-achị. Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.
Bongani iNkosi, lonke misebenzi yayo, endaweni zonke zombuso wayo. Bonga iNkosi, mphefumulo wami.