< Ilu 28 >

1 Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha, ma ndị ezi omume na-enwe ntụkwasị obi dịka ọdụm.
The wicked flee when no man pursueth; but the righteous are secure as a young lion.
2 Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi, ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge.
For the transgression of a land many are the princes thereof; but by a man of understanding and knowledge established order shall long continue.
3 Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye, bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị.
A poor man that oppresseth the weak is like a sweeping rain which leaveth no food.
4 Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume, ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha.
They that forsake the law praise the wicked; but such as keep the law contend with them.
5 Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara, ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya.
Evil men understand not justice; but they that seek the LORD understand all things.
6 Ọ kaara gị mma ịbụ nwa ogbenye na onye eziokwu karịa na ị bụ ọgaranya na eze aghụghọ.
Better is the poor that walketh in his integrity, than he that is perverse in his ways, though he be rich.
7 Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru, ma nwa nke ya na ndị oke oriri bụ enyi na-emenye nna ya ihere.
A wise son observeth the teaching; but he that is a companion of gluttonous men shameth his father.
8 Onye na-eme ka akụ ya baa ụba site na ịnara ụma maọbụ ọmụrụnwa nʼaka onye ogbenye, na-ekpokọta ya nye onye ọzọ, onye na-emere ndị ogbenye ebere.
He that augmenteth his substance by interest and increase, gathereth it for him that is gracious to the poor.
9 Onye na-ewezuga ntị ya site nʼebe iwu m dị, ọ bụladị ekpere ha bụ ihe arụ.
He that turneth away his ear from hearing the law, even his prayer is an abomination.
10 Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ, ga-adaba nʼọnya ahụ ha onwe ha gbara, ma ndị na-enweghị ịta ụta ga-anata ezi ihe nketa.
Whoso causeth the upright to go astray in an evil way, he shall fall himself into his own pit; but the whole-hearted shall inherit good.
11 Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe, ma nʼezie, onye ogbenye nwere nghọta na-enyochapụta amaghị ihe nke onye ọgaranya.
The rich man is wise in his own eyes; but the poor that hath understanding searcheth him through.
12 Mgbe ihe na-agara ndị ezi omume nke ọma, onye ọbụla na-aṅụrị ọṅụ, ma onye ọbụla na-ezo onwe ya mgbe onye na-emebi iwu na-aga nʼihu.
When the righteous exult, there is great glory; but when the wicked rise, men must be sought for.
13 Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya. Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere.
He that covereth his transgressions shall not prosper; but whoso confesseth and forsaketh them shall obtain mercy.
14 Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ na-atụ egwu Chineke, ma onye na-enupu isi na-etinye onwe ya na nsogbu.
Happy is the man that feareth alway; but he that hardeneth his heart shall fall into evil.
15 Dịka ọdụm na-agbọ ụja maọbụ nne bịa na-achụ mmadụ otu a ka onye ọchịchị ọjọọ nke na-achị ndị na-enweghị ike dị.
As a roaring lion, and a ravenous bear; so is a wicked ruler over a poor people.
16 Ọ bụ naanị eze na-amaghị ihe ga-akpagbu ndị ya; ma eze ga-achị ogologo oge bụ eze kpọrọ iri ngarị asị.
The prince that lacketh understanding is also a great oppressor; but he that hateth covetousness shall prolong his days.
17 Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikpe ruo ala mmụọ. Ka onye ọbụla ghara inyere ya aka.
A man that is laden with the blood of any person shall hasten his steps unto the pit; none will support him.
18 Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe, ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu.
Whoso walketh uprightly shall be saved; but he that is perverse in his ways shall fall at once.
19 Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ.
He that tilleth his ground shall have plenty of bread; but he that followeth after vain things shall have poverty enough.
20 Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị, ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ.
A faithful man shall abound with blessings; but he that maketh haste to be rich shall not be unpunished.
21 Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya. Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri.
To have respect of persons is not good; for a man will transgress for a piece of bread.
22 Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya amaghị na ụkpa nọ na-eche ya.
He that hath an evil eye hasteneth after riches, and knoweth not that want shall come upon him.
23 Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ.
He that rebuketh a man shall in the end find more favour than he that flattereth with the tongue.
24 Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa, “Olee ihe ọjọọ dị na ya?” Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi.
Whoso robbeth his father or his mother, and saith: 'It is no transgression', the same is the companion of a destroyer.
25 Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu, ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu.
He that is of a greedy spirit stirreth up strife; but he that putteth his trust in the LORD shall be abundantly gratified.
26 Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu! Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha.
He that trusteth in his own heart is a fool; but whoso walketh wisely, he shall escape.
27 Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị. Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ.
He that giveth unto the poor shall not lack; but he that hideth his eyes shall have many a curse.
28 Mgbe ndị ajọ omume na-aga nʼihu, ndị ezi omume na-ezo onwe ha, ma mgbe ha nʼala nʼiyi, ndị ezi omume nʼaba ụba.
When the wicked rise, men hide themselves; but when they perish, the righteous increase.

< Ilu 28 >