< Ilu 18 >
1 Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya, na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ.
Ozehlukanisayo udinga okuloyisekayo kwakhe; ufohlela inhlakanipho yonke.
2 Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ. Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya.
Isithutha kasithokozi ekuqedisiseni, kodwa ukuze inhliziyo yaso iziveze.
3 Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata, otu a kwa nkọcha na-eweta ihere.
Lapho okhohlakeleyo esiza, kuza lokudelela, njalo kanye lenhloni, ihlazo.
4 Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi, ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ.
Amazwi omlomo womuntu angamanzi azikileyo; umthombo wenhlakanipho uyisifula esigobhozayo.
5 Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ, si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi.
Kakulunganga ukwemukela ubuso bokhohlakeleyo, ukuphambula olungileyo kusahlulelo.
6 Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu, ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti.
Indebe zesithutha zingena enkanini, lomlomo waso ubiza imivimvinya.
7 Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu, egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya.
Umlomo wesithutha uyintshabalalo yaso, lendebe zaso zingumjibila womphefumulo waso.
8 Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
Amazwi onyeyayo anjengezibondlo ezehlela kokungaphakathi kwesisu.
9 Onye dị umengwụ nʼọrụ ya bụ nwanne nke onye mbibi.
Lolivila emsebenzini wakhe ungumfowabo womchithi.
10 Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike, ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
Ibizo leNkosi lingumphotshongo oqinileyo; olungileyo uzagijimela kuwo amiswe phezulu evikelekile.
11 Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.
Inotho yesinothi ingumuzi waso oqinileyo, lanjengomthangala ophakemeyo ekucabangeni kwaso.
12 Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga, ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ.
Mandulo kokubhujiswa inhliziyo yomuntu iyaziphakamisa, njalo mandulo kodumo kulokuthobeka.
13 Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị bụ enweghị uche na ihe ihere.
Ophendula indaba engakezwa, kuyibuwula kuye, lehlazo.
14 Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa, ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya?
Umoya womuntu uzasekela ukugula kwakhe, kodwa umoya owephukileyo, ngubani ongawuthwala?
15 Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma, nʼihi na ntị onye maara ihe na-achọpụta ya.
Inhliziyo yoqedisisayo izuza ulwazi, lendlebe yabahlakaniphileyo idinga ulwazi.
16 Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara, ọ na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu.
Isipho somuntu siyamvulela ngokubanzi, simkhokhelela phambi kwabakhulu.
17 Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara, tutu ruo mgbe mmadụ bịara bido ịjụ ya ajụjụ.
Ongowokuqala ecaleni lakhe ubonakala elungile, kodwa umakhelwane wakhe ufika amhlole.
18 Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọ dị nʼetiti mmadụ abụọ ndị olu ha na-ala elu.
Inkatho iqeda izingxabano, yehlukanise phakathi kwabalamandla.
19 Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa. Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie.
Umzalwane owoniweyo wedlula umuzi oqinileyo, lengxabano zinjengomgoqo wenqaba.
20 Site na mkpụrụ nke okwu ọnụ mmadụ mịpụtara ka afọ ga-eji ju ya. Sitekwa nʼihe owuwe ubi nke egbugbere ọnụ ha ka ha ga-eji rijuo afọ.
Isisu somuntu siyasuthiswa yizithelo zomlomo wakhe, uzasuthiswa yinzuzo yendebe zakhe.
21 Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka. Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya.
Ukufa lempilo kusesandleni solimi; labaluthandayo bazakudla isithelo salo.
22 Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe. Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.
Othole umfazi uthole okuhle, uzuze umusa eNkosini.
23 Onye ogbenye na-arịọ arịrịọ maka ebere; ma ọgaranya na-asa okwu ike ike.
Umyanga uyakhuluma ngokuncenga, kodwa isinothi siphendula izinto ezilukhuni.
24 Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya, ma ọ dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.
Umuntu wabangane abanengi uzachitheka, kodwa kulomngane onamathela kuleselamani.