< Ilu 11 >

1 Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu Onyenwe anyị ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ.
Isikali esikhohlisayo siyisinengiso eNkosini, kodwa ilitshe lokulinganisa elipheleleyo liyintokozo yayo.
2 Nganga bịa, nlelị a na-eso ya, ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe.
Nxa kufika ukuzigqaja, kufika lehlazo; kodwa kwabathobekileyo kukhona inhlakanipho.
3 Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha; ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi.
Ubuqotho babaqotho buzabaqondisa, kodwa ukuphambeka kwabaphambekayo kuzababhubhisa.
4 Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe; ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ.
Inotho kayisizi ngosuku lolaka, kodwa ukulunga kophula ekufeni.
5 Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi, ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha.
Ukulunga kwabaqotho kuzaqondisa indlela yakhe, kodwa okhohlakeleyo uzakuwa ngenkohlakalo yakhe.
6 Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya; ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha.
Ukulunga kwabaqotho kuzabophula, kodwa abaphambukayo bazathunjwa zinkanuko zabo.
7 Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi, ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi.
Nxa umuntu okhohlakeleyo esifa, ithemba lakhe lizabhubha, lethemba lolamandla liyabhubha.
8 Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha, ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya.
Olungileyo ukhululwa ekuhluphekeni, kodwa omubi ungena endaweni yakhe.
9 Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya. Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya.
Ngomlomo umzenzisi uchitha umakhelwane wakhe, kodwa ngolwazi abalungileyo bayakhululwa.
10 Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ, otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ.
Ngempumelelo yabalungileyo umuzi uyathokoza; lekubhubheni kwabakhohlakeleyo kulenjabulo.
11 A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu, ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume.
Ngesibusiso sabaqotho umuzi uyaphakanyiswa, kodwa ngomlomo wabakhohlakeleyo uyachitheka.
12 Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu; ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.
Oswela ingqondo udelela umakhelwane, kodwa umuntu oqedisisayo uyazithulela.
13 Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo, ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo.
Ohamba enyeya wembula imfihlakalo, kodwa othembekileyo ngomoya ufihla udaba.
14 Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada, ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri.
Lapho kungekho izeluleko abantu bayawa; kodwa ukukhululwa kusebunengini babeluleki.
15 Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ, ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.
Oba yisibambiso sowezizwe uzahlupheka ngokubi; kodwa ozonda ukutshaya izandla uvikelekile.
16 Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma, ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta.
Owesifazana olomusa ubamba udumo, labalamandla babamba inotho.
17 Onye nwere obiọma baara onwe ya uru, ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu.
Umuntu olomusa wenzela umphefumulo wakhe okuhle, kodwa olesihluku ukhathaza inyama yakhe.
18 Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ, ma onye na-agha ezi omume dịka mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ kwesiri ekwesi.
Okhohlakeleyo wenza umsebenzi wenkohliso, kodwa ohlanyela ukulunga ulomvuzo weqiniso.
19 Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ; ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-ahụ ọnwụ.
Njengoba ukulunga kungokwempilo, kunjalo ozingela okubi kungokokufa kwakhe.
20 Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya.
Abaphambeneyo ngenhliziyo bayisinengiso eNkosini, kodwa abaqotho ngendlela bayintokozo yayo.
21 Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ, ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta.
Isandla esandleni omubi kayikuyekelwa ukujeziswa, kodwa inzalo yabalungileyo izaphepha.
22 Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche, dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi.
Ulisongo legolide empumulweni yengulube owesifazana obukekayo ophambuka engqondweni.
23 Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ, ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ.
Isifiso sabalungileyo singokuhle kuphela; ithemba labakhohlakeleyo lulaka.
24 Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa, ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye.
Kukhona ohlakazayo, kube kanti okunengi kuyengezwa; logodla okwedlula okufaneleyo, kodwa kungokokuswela.
25 E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya; onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa.
Umphefumulo obusisayo uzakhuluphaliswa, lothelelayo uzathelelwa laye.
26 Ndị mmadụ na-abụ onye na-achịkọba mkpụrụ ọka na-ereghị ya ere ọnụ, ma ha na-ekpetara onye nke dị njikere ire nke ya ngọzị Chineke.
Ogodla amabele, abantu bazamqalekisa; kodwa isibusiso sizakuba phezu kwekhanda lothengisayo.
27 Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ihuọma, ma ihe ọjọọ na-abịakwasị onye na-achọ ya.
Odingisisa okuhle, udinga umusa; kodwa odinga okubi, kuzakuza kuye.
28 Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada, ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ.
Othemba inotho yakhe yena uzakuwa, kodwa abalungileyo bazahluma njengamahlamvu.
29 Onye na-ewetara ezinaụlọ ha nsogbu ga-eketa naanị ifufe, onye nzuzu ga-abụ ohu nke onye maara ihe.
Oletha inkathazo emzini wakhe uzakudla ilifa lomoya, lesithutha sizakuba yinceku yohlakaniphileyo ngenhliziyo.
30 Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ, onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe.
Isithelo solungileyo siyisihlahla sempilo, lozuza imiphefumulo uhlakaniphile.
31 Ọ bụrụ na a ga-akwụ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha nʼụwa a; a ga-esi aṅaa ghara ịkwụ ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie ụgwọ ọrụ.
Khangela, olungileyo uzavuzwa emhlabeni; kakhulu kangakanani omubi lesoni!

< Ilu 11 >