< Ọnụọgụgụ 8 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Le Seigneur dit encore à Moïse:
2 “Gwa Erọn okwu sị ya, ‘Mgbe ọbụla ị mụnyere oriọna asaa nke iheọkụ, ị ga-edozi ha ka ìhè ha na-enwupụta naanị nʼihu iheọkụ ahụ.’”
Parle à Aaron, et dis-lui: Lorsque tu auras disposé en rang les lampes du chandelier, les sept lampes éclaireront.
3 Erọn mere otu a. O doziri oriọna ndị ahụ ka ha chee ihu nʼihe ịdọba oriọna, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Et ainsi fit Aaron; il alluma, sur une seule rangée, les lampes du chandelier, comme le Seigneur l'avait prescrit à Moïse.
4 Otu a ka esi mee ihe ịdọba oriọna ahụ. Ọ bụ naanị ọlaedo ka e ji kpụọ iheọkụ ahụ, site nʼụkwụ ya ruo nʼokooko niile e ji chọọ ya mma. A kpụrụ iheọkụ ahụ nʼusoro dịka oyiyi Onyenwe anyị gosiri Mosis si dị.
Voilà comme était fabriqué le chandelier: il était d'or inflexible, tige et lis, selon la forme que le Seigneur avait indiquée à Moïse; ainsi avait-il fait le chandelier.
5 Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
Et le Seigneur parla à Moïse, disant:
6 “Ugbu a, site nʼetiti ụmụ Izrel, kpọpụta ụmụ Livayị, doo ha iche, mee ha ka ha dịrị ọcha.
Prends les lévites parmi les fils d'Israël, et purifie-les.
7 Ime ka ha dị ọcha, lee ihe ị ga-eme. Fesa ha mmiri na-asachapụ mmehie. Hụkwa na ha kpụchapụrụ ajị niile dị ha nʼahụ, ma sachaa uwe ha. Si otu a mee ka ha bụrụ ndị dị ọcha.
Voilà comment tu feras cette purification: tu les aspergeras de l'eau de la purification; on passera le rasoir sur tout leur corps; ils laveront leurs vêtements, et ils seront purs.
8 Gwa ha ka ha weta nwa oke ehi na onyinye mkpụrụ ọka, bụ ụtụ ọka a gwara mmanụ. Ha ga-ewetakwa nwa oke ehi ọzọ; ka ọ bụrụ ihe ha ji achụ aja mmehie.
Ensuite, ils prendront un veau parmi les bœufs, avec de la fleur de farine pétrie dans l'huile, pour son oblation; tu prendras encore, parmi les bœufs, un veau d'un an pour le péché.
9 Emesịa, kpọbata ụmụ Livayị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Meekwa ka ọgbakọ ndị Izrel niile zukọọ nʼebe ahụ.
Et tu conduiras les lévites devant le tabernacle du témoignage. Là, après avoir rassemblé toute la synagogue des fils d'Israël,
10 Kpọpụta ndị Livayị nʼihu Onyenwe anyị, ma mee ka ndị Izrel niile bikwasị ha aka ha.
Tu présenteras les lévites devant le Seigneur, et les fils d'Israël imposeront leurs mains sur la tête des lévites;
11 Mgbe ahụ, Erọn ga-ewere ndị Livayị chee Onyenwe anyị nʼihu dịka onyinye mfufe ndị Izrel niile na-enye ya. Nʼụzọ dị otu a, ụmụ Livayị niile ga-abụ ndị jikere ijere Onyenwe anyị ozi.
Aaron les séparera des fils d'Israël, comme une offrande faite au Seigneur; et les lévites seront pour travailler aux œuvres du Seigneur.
12 “Emesịa, ndị Livayị ga-abịa bikwasị aka ha nʼisi oke ehi abụọ ndị ahụ jiri otu nʼime oke ehi abụọ ndị ahụ chụọ aja mmehie nye Onyenwe anyị, jiri nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ, maka ikpuchi mmehie ndị Livayị.
Ensuite, les lévites imposeront leurs mains sur les veaux, et tu sacrifieras l'un pour le péché, l'autre pour l'holocauste au Seigneur, afin que ce sacrifice leur soit propitiatoire.
13 Mgbe ahụ, mee ka ndị Livayị guzo nʼihu Erọn na ụmụ ndị ikom, werekwa ha nyefee Onyenwe anyị nʼaka dịka a ga-asị na ha bụ onyinye mfufe a na-enye Onyenwe anyị.
Tu placeras alors les lévites en présence du Seigneur, devant Aaron et ses fils, et tu les donneras au Seigneur comme offrande.
14 Otu a ka ị ga-esi doo ndị Livayị nsọ ime ka ha dịrị iche site nʼigwe ụmụ Izrel ndị ọzọ. Ọ bụ m nwe ndị Livayị.
Ainsi, tu sépareras les lévites des fils d'Israël, et ils seront à moi.
15 “Mgbe i dosiri ndị Livayị nsọ, cheekwa ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe, ha ga-abịa nʼime ụlọ nzute ahụ ije ozi dịrị ha.
Après cela, les lévites seront introduits pour travailler aux œuvres du tabernacle; c'est ainsi que tu les purifieras, et que tu en feras l'offrande devant le Seigneur, car ils sont l'offrande qui m'est due parmi les fils d'Israël,
16 Ha bụ nke m site nʼetiti ụmụ Izrel niile. Anarala m ha ka ha bụrụ nke m nʼọnọdụ ụmụ niile e bụ ụzọ mụọ, nwa nwoke nke nwanyị ọbụla nʼIzrel.
En échange de tous les premiers-nés des fils d'Israël; je les ai pris pour moi,
17 Nʼihi na nwa nwoke mbụ ọbụla a mụrụ nʼetiti ndị Izrel bụ nke m, ma mmadụ ma anụmanụ niile. Edoro m ha nsọ nye onwe m, site nʼabalị ụbọchị ahụ m tigbusiri ụmụ niile e bụ ụzọ mụọ nʼIjipt.
Parce que tout premier-né, parmi les fils d'Israël, m'appartient, depuis l'homme jusqu'aux bestiaux; le jour où j'ai frappé tout premier-né en Egypte, je me suis consacré les premiers-nés d'Israël;
18 Ewerela m ndị Livayị nʼọnọdụ ụmụ nwoke mbụ niile a mụrụ nʼIzrel.
Et j'ai pris les lévites en échange des premiers-nés d'Israël.
19 Site nʼetiti ndị Izrel niile, ewerela m ndị Livayị nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom dịka onyinye, ka ha rụọ ọrụ niile dị nʼime ụlọ nzute ahụ nʼọnọdụ ụmụ Izrel. Ka ha kpuchiere ha mmehie ha niile ka ihe otiti nke nrịa nrịa ghara ịbịakwasị ụmụ Izrel, mgbe ọbụla ha bịara nso ebe nsọ ahụ.”
Les lévites m'ayant été donnés en offrande, je les ai donnés moi-même à Aaron et à ses fils, afin qu'ils fassent les œuvres des fils d'Israël dans le tabernacle du témoignage, et qu'ils prient pour les fils d'Israël; et nul des fils d'Israël ne s'approchera des choses saintes.
20 Ya mere, Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel chere ụmụ Livayị nʼihu Onyenwe anyị, nʼusoro dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Moïse, avec Aaron et toute la synagogue des fils d'Israël, fit donc, au sujet des lévites, ce que le Seigneur lui avait prescrit; et ainsi les fils d'Israël firent pour les lévites.
21 Ndị Livayị niile doro onwe ha ọcha, sachakwaa uwe ha niile. Erọn chere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye aja mfufe, chụọrọ ha aja ikpuchi mmehie, ime ka ha dị ọcha.
Et les lévites se purifièrent; ils lavèrent leurs vêtements; après quoi, Moïse les donna à Aaron, comme offrande au Seigneur. Ce dernier pria pour eux, afin de les purifier.
22 Nʼikpeazụ, ndị Livayị bịara ije ozi ha nʼụlọ nzute nʼokpuru Erọn na ụmụ ya ndị ikom. Ha nyekwara ndị Livayị ọrụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Et, après cela, les lévites entrèrent pour faire leur service liturgique dans le tabernacle du témoignage, devant Aaron et ses fils, comme le Seigneur l'avait prescrit à Moïse; ainsi fit-on pour eux.
23 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Et le Seigneur parla à Moïse, disant:
24 “Iwu m ndị a metụtara ndị Livayị niile. Nwoke onye Livayị ọbụla ga-ebido ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute m mgbe ọ gbara iri afọ abụọ na ise.
Voici encore ce qui concerne les lévites: A vingt-cinq ans et au-dessus, ils entreront, pour leur ministère, dans le tabernacle du témoignage.
25 Ọ ga-akwụsịkwa ịrụ ọrụ nʼime ya mgbe ọ gbara iri afọ ise, mgbe oge ezumike ọrụ ya ga-amalite.
A cinquante ans, ils s'éloigneront du service saint; à cet âge, nul lévite n'y sera employé.
26 Ha nwere ike inyere ụmụnne ha aka nʼịrụ ọrụ ha nʼime ụlọ nzute, ma ha onwe ha agaghị arụ ọrụ ahụ. Otu a ka ị ga-esi dozie ọrụ ije ozi nke ndị Livayị.”
Son frère exercera le ministère dans le tabernacle du témoignage; lui- même ne fera plus rien. Tu règleras ainsi les fonctions des lévites.

< Ọnụọgụgụ 8 >