< Ọnụọgụgụ 10 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
The LORD spoke to Moses, saying,
2 “Kpụọ opi ọlaọcha abụọ, jiri ha na-akpọ mkpọkọta nzukọ ụmụ Izrel na ime ka ha mara mgbe mbuli ije nke ọmụma ụlọ ikwu ruru.
"Make two trumpets of silver. You shall make them of beaten work. You shall use them for the calling of the congregation, and for the journeying of the camps.
3 Mgbe a fụrụ opi abụọ ahụ, nzukọ Izrel niile ga-ezukọta nʼihu gị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
When they blow them, all the congregation shall gather themselves to you at the door of the Tent of Meeting.
4 Ma ọ bụrụ naanị otu opi ka a fụrụ, ọ bụ ndị ndu, ndịisi ikwu Izrel niile ga-ezukọta bịakwute gị.
But if they blow just one, then the leaders, the heads of the thousands of Israel, shall gather themselves to you.
5 Otu ụda opi ike ga-egosi na ebo Izrel niile mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebuli ije.
When you blow an alarm, the camps that lie on the east side shall go forward.
6 Opi ike ahụ daa ụda nke ugboro abụọ, ọ na-egosi na ndị mara ụlọ ikwu ha na ndịda ga-ebuli ije. Ịda ụda nke opi ike bụ ihe e ji amata na oge ibuli ije eruola.
When you blow an alarm the second time, the camps that lie on the south side shall go forward. They shall blow an alarm for their journeys.
7 Mgbe a ga-akpọkọta ndị Izrel niile a ga-egbu opi, kama ụda ya ga-adị iche.
But when the assembly is to be gathered together, you shall blow, but you shall not sound an alarm.
8 “Ọ bụ naanị ụmụ ndị ikom Erọn, ndị nchụaja ga-egbu opi ndị a. Nke a bụ iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile.
The sons of Aaron, the cohanim, shall blow the trumpets. This shall be to you for a statute forever throughout your generations.
9 Mgbe unu gara ibu agha nʼala unu imegide onye iro na-akpagbu unu, fụọnụ opi ike. Nke a ga-eme ka Onyenwe anyị Chineke unu cheta unu, ma napụta unu site nʼaka ndị iro unu.
When you go to war in your land against the adversary who oppresses you, then you shall sound an alarm with the trumpets. Then you will be remembered before the LORD your God, and you will be saved from your enemies.
10 Unu ga-egbukwa opi ndị a nʼoge aṅụrị, nʼoge mmemme unu a kara aka, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ niile. Gbukwaanụ opi mgbe unu na-achụ aja nsure ọkụ unu, na aja udo unu niile. Ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-echeta unu nʼihu Chineke unu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.”
"Also in the day of your gladness, and in your set feasts, and in the beginnings of your months, you shall blow the trumpets over your burnt offerings, and over the sacrifices of your peace offerings; and they shall be to you for a memorial before your God. I am the LORD your God."
11 Nʼụbọchị iri abụọ, nʼime ọnwa nke abụọ, nʼafọ nke abụọ, igwe ojii ahụ biliri site nʼelu ụlọ nzute nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
It happened in the second year, in the second month, on the twentieth day of the month, that the cloud was taken up from over the tabernacle of the testimony.
12 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel biliri ije site nʼọzara Saịnaị jegharịa site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu igwe ojii ahụ akwụsị nʼọzara Paran.
The children of Israel went forward according to their journeys out of the wilderness of Sinai; and the cloud abode in the wilderness of Paran.
13 Nke a bụ njem mbụ ha mere dịka Onyenwe anyị si nye Mosis iwu banyere ije ha.
They first went forward according to the commandment of the LORD by Moses.
14 Usuu ọmụma ụlọ ikwu nke ebo Juda buru ụzọ bulie ije a, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Nashọn, nwa Aminadab, bụ onyendu ha.
First, the standard of the camp of the people of Judah went forward according to their armies. Nahshon the son of Amminadab was over his army.
15 Netanel nwa Zua bụ onyendu usuu ebo Isaka.
Nethanel the son of Zuar was over the army of the tribe of the people of Issachar.
16 Eliab nwa Helọn bụ onyendu usuu ebo Zebụlọn
Eliab the son of Helon was over the army of the tribe of the people of Zebulun.
17 Mgbe ahụ, e wedara ụlọ nzute ahụ. Ụmụ Geshọn na Merari buru ya, bilikwaa ije ha.
The tabernacle was taken down; and the sons of Gershon and the sons of Merari, who bore the tabernacle, went forward.
18 Usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Ruben biliri ije, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Elizọ nwa Shedeua bụ onyendu ha.
The standard of the camp of Reuben went forward according to their armies. Elizur the son of Shedeur was over his army.
19 Shelumiel nwa Zurishadai bụ onyendu usuu ebo Simiọn.
Shelumiel the son of Zurishaddai was over the army of the tribe of the people of Simeon.
20 Eliasaf nwa Deuel bụ onyendu usuu ebo Gad.
Eliasaph the son of Reuel was over the army of the tribe of the people of Gad.
21 Mgbe ahụ, ụmụ Kohat ndị bu ihe nsọ ndị ahụ niile, biliri ije ha. Tutu ha erute, e guzobere ụlọ nzute ahụ nʼebe o kwesiri ịdị.
The Kohathites set forward, bearing the sanctuary. The others set up the tabernacle before they arrived.
22 Usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Ifrem biliri ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Elishama nwa Amihud bụ onyendu ha.
The standard of the camp of the people of Ephraim set forward according to their armies. Elishama the son of Ammihud was over his army.
23 Gamaliel nwa Pedazo bụ onyendu usuu ebo Manase.
Gamaliel the son of Pedahzur was over the army of the tribe of the people of Manasseh.
24 Abidan nwa Gidiọni bụ onyendu usuu ebo Benjamin.
Abidan the son of Gideoni was over the army of the tribe of the people of Benjamin.
25 Na ngwụsị usoro ahụ, usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Dan biliri ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai.
The standard of the camp of the people of Dan, which was the rearward of all the camps, set forward according to their armies. Ahiezer the son of Ammishaddai was over his army.
26 Pagịel nwa Okran bụ onyendu usuu ebo Asha.
Pagiel the son of Ochran was over the army of the tribe of the people of Asher.
27 Ahira nwa Enan bụ onyendu usuu ebo Naftalị.
Ahira the son of Enan was over the army of the tribe of the people of Naphtali.
28 Nke a bụ usoro usuu ụmụ Izrel si bilie ije ha.
Thus were the travels of the children of Israel according to their armies; and they went forward.
29 Mosis gwara Hobab nwa Reuel, nna nwunye ya onye Midia okwu sị, “Anyị ebiliela ije ịga ebe ahụ Onyenwe anyị gwara anyị sị, ‘Aga m enye unu.’ Bịa ka ị soro anyị. Anyị ga-emezi gị nke ọma nʼihi na Onyenwe anyị ekwela Izrel nkwa ọtụtụ ezi ihe.”
Moses said to Hobab, the son of Reuel the Midianite, Moses' brother-in-law, "We are journeying to the place of which the LORD said, 'I will give it to you.' Come with us, and we will treat you well; for the LORD has spoken good concerning Israel."
30 Ma ọ zara sị, “E e, agaghị m eso unu. Ana m alaghachi nʼala nke aka m ịlaghachikwuru ụmụnna m.”
He said to him, "I will not go; but I will depart to my own land, and to my relatives."
31 Ma Mosis zara sị ya, “Biko ahapụla anyị nʼihi na ị maara ebe anyị nwere ike kwụsị zuo ike nʼọzara. Ị ga-abụrụ anyị anya anyị ji ahụ ụzọ.
He said, "Do not leave us, please; because you know how we are to camp in the wilderness, and you can be our eyes.
32 Ọ bụrụ na i soro anyị, anyị ga-ekenye gị ihe ọma ọbụla Onyenwe anyị ga-enye anyị.”
And it shall be, if you go with us, that it shall be that whatever good the LORD does to us, we will do the same to you."
33 Ya mere ha sitere nʼugwu Onyenwe anyị bilie ije. Jeekwa ije abalị atọ. Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-aga ha nʼihu ụbọchị atọ ndị ahụ niile ịchọtara ha ebe ha ga-akwụsị zuo ike.
They set forward from the Mount of the LORD three days' journey. The ark of the covenant of the LORD went before them three days' journey, to seek out a resting place for them.
34 Igwe ojii Onyenwe anyị dị nʼelu ha nʼehihie mgbe ha si nʼọmụma ụlọ ikwu ha bilie ije.
The cloud of the LORD was over them by day, when they set forward from the camp.
35 Mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ ahụ biliri ije, Mosis na-ekwu sị, “Bilie O Onyenwe anyị, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị; ka ndị iro gị niile site nʼihu gị gbalaga.”
It happened, when the ark went forward, that Moses said, "Rise up, LORD, and let your enemies be scattered. Let those who hate you flee before you."
36 Ma mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ bịara ebe izuike, Mosis na-ekwukwa sị, “Lọghachi O Onyenwe anyị, bịakwute ọtụtụ mmadụ ndị a, bụ imerime puku ndị Izrel.”
When it rested, he said, "Return, LORD, to the ten thousands of the thousands of Israel."

< Ọnụọgụgụ 10 >