< Matiu 5 >

1 Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya,
Awo Yesu bwe yalaba ng’ebibiina byeyongera obungi, n’alinnya ku lusozi, abayigirizwa be ne bajja gy’ali,
2 o bido ikuziri ha ihe. Ọ sịrị:
n’abayigiriza ng’agamba nti:
3 “Ngọzị na-adịrị ndị bụ ogbenye nʼime mmụọ, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.
“Balina omukisa abaavu mu mwoyo, kubanga abo Obwakabaka obw’omu ggulu bwe bwabwe.
4 Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ, nʼihi na a ga-akasị ha obi.
Balina omukisa abali mu nnaku, kubanga abo balisanyusibwa.
5 Ngọzị na-adịrị ndị dị nwayọọ nʼobi, nʼihi na ha ga-eketa ụwa.
Balina omukisa abeetoowaze, kubanga abo balisikira ensi.
6 Ngọzị na-adịrị ndị agụụ ezi omume na-agụ, nʼihi na ndị ahụ ka afọ ga-eju.
Balina omukisa abalumwa enjala olw’obutuukirivu kubanga abo balikkusibwa.
7 Ngọzị na-adịrị ndị na-eme obi ebere, nʼihi na ha ka a ga-emere ebere.
Balina omukisa ab’ekisa, kubanga abo balikwatirwa ekisa.
8 Ngọzị na-adịrị ndị dị ọcha nʼobi, nʼihi na ha ga-ahụ Chineke anya.
Balina omukisa abalina omutima omulongoofu, kubanga abo baliraba Katonda.
9 Ngọzị na-adịrị ndị na-eme ka udo dị nʼetiti mmadụ na ibe ya, nʼihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke.
Balina omukisa abatabaganya, kubanga abo baliyitibwa baana ba Katonda.
10 Ngọzị na-adịrị ndị a na-emegbu nʼihi ezi omume, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.
Balina omukisa abayigganyizibwa olw’obutuukirivu, kubanga abo obwakabaka obw’omu ggulu bwe bwabwe.”
11 “Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu, na-emegbu unu, ma na-ekwukwa okwu ọjọọ na ụgha niile dị iche iche megide unu nʼihi m.
“Mulina omukisa mmwe, bwe banaabavumanga, ne babayigganya, ne baboogerako ebibi ebya buli ngeri, ne babawaayiriza, nga babalanga nze.
12 Ṅụrịanụ ọnụ, nwekwanụ obi ụtọ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na nʼụzọ dị otu a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ.
Musanyuke era mujaguze kubanga empeera yammwe nnene mu ggulu, ne bannabbi ab’edda bwe baayigganyizibwa bwe batyo.”
13 “Unu bụ nnu nke ụwa, ma ọ bụrụ na nnu adịghị atọkwa ụtọ, a ga-eji gịnị mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ọ bakwaghị uru ọbụla, ma ọ bụghị naanị itufu ya, ka ndị mmadụ zọọ ya ụkwụ.
“Mmwe muli munnyo gwa nsi. Naye kale bwe guggwaamu obuka, guliba munnyo nate? Olwo gukasukibwa ebweru ne gulinnyirirwa n’ebigere, nga tegukyalina mugaso gwonna.
14 “Unu bụ ihe nke ụwa. Unu dị ka obodo e wuru nʼelu ugwu nke a na-apụghị izo ezo.
“Mmwe muli musana gwa nsi. Ekibuga tekikwekebwa ku lusozi.
15 Ndị mmadụ adịghị amụnye oriọna dọnye ya nʼokpuru igbe, kama a na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba oriọna, ka o nye ndị niile nọ nʼụlọ ahụ ìhè.
Era omuntu takoleeza ttabaaza ate n’agisaanikirako ekibbo, wabula agiteeka ku kikondo n’emulisiza bonna abali mu nju.
16 Ya mere, kwerenụ ka ìhè unu nwuo nye mmadụ niile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu nke bi nʼeluigwe.
Kale nammwe ebikolwa byammwe ebirungi byakirenga abantu bonna, babirabenga, bagulumize Kitammwe ali mu ggulu.
17 “Unu echela na m bịara ịkagbu iwu Mosis, maọbụ ozizi ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha.
“Temulowooza nti Najja okuggyawo amateeka ga Musa oba ebya bannabbi. Sajja okubiggyawo wabula okubituukiriza.
18 Nʼezie, agwa m unu, na tutu eluigwe na ụwa agabiga, ọ dịghị otu mkpụrụ edemede ọbụla dị nta, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, nke a ga-esi nʼIwu a wepụ ruo mgbe ha niile ga emezu.
Ddala ddala mbagamba nti Eggulu n’ensi biyinza okuggwaawo, naye ennukuta emu wadde akatonnyeze akamu mu mateeka tebirivaawo okutuusa byonna lwe birituukirira.
19 Nʼihi ya, onye ọbụla nke ga-emebi otu nʼime iwu ndị a, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, ma kuziekwara ndị ọzọ ime otu ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi ụmụ mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu ndị ahụ nʼonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nʼalaeze eluigwe.
Noolwekyo oyo amenya etteeka erisembayo obutono, n’ayigiriza n’abalala okukola bwe batyo, y’alisembayo mu bwakabaka obw’omu ggulu.
20 Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu akarịghị ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị ịba nʼalaeze eluigwe ma ọlị.
Naye mbalabula nti Okuggyako ng’obutuukirivu bwammwe businga obw’Abafalisaayo n’obw’abawandiisi, temuliyingira mu bwakabaka bwa mu ggulu.”
21 “Unu nụrụ na-agwara ndị mmadụ nʼoge gara aga, sị, ‘Onye egbula mmadụ, onye ọbụla gburu mmadụ a ga-ekpe ya ikpe.’
“Mwawulira ab’edda bwe baagambibwa nti, ‘Tottanga, na buli anattanga, anaawozesebwa.’
22 Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘Raka,’ ya bụ Onye iberiibe, ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya, ‘Onye nzuzu,’na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna g1067)
Naye mbagamba nti Buli alisunguwalira muganda we aliwozesebwa. Na buli anaagambanga muganda we nti, ‘Laka,’ anaatwalibwa mu lukiiko lw’abakulembeze b’Abayudaaya n’awozesebwa. Na buli anaagambanga nti, ‘Musirusiru,’ asaanidde okusuulibwa mu muliro ogwa ggeyeena. (Geenna g1067)
23 “Ya mere, ọ bụrụ na ị gaa inye onyinye gị nʼebe ịchụ aja, ma cheta nʼebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị nʼudo,
“Bw’obanga oli mu maaso ga Katonda, ng’omuleetedde ekirabo eky’okuwaayo nga ssaddaaka, n’ojjukira nga waliwo gw’olinako ensonga,
24 hapụ onyinye gị nʼebe ịchụ aja, laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu mere udo, laghachi bịa nye onyinye gị.
ekirabo kyo sooka okireke awo oddeyo omale okumwetondera mutegeeragane, olyoke okomewo oweeyo ekirabo kyo eri Katonda.
25 “Mee ọsịịsọ ka gị na onye kpọ gị eje ụlọ ikpe kpezie, mgbe ọ na-eburubeghị ikpe gị na ya jee nʼaka ọkaikpe, onye ga-enyefe gị nʼaka ndị nche, ma eleghị anya etinye gị nʼụlọ mkpọrọ.
“Tegeeragananga mangu n’oyo akuwawaabira nga mukyali mu kkubo aleme kukutwala wa mulamuzi, n’omulamuzi okukuwaayo eri omuserikale, n’omuserikale okukuteeka mu kkomera.
26 Nʼezie, agwa m gị, ị gaghị e si nʼebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụghachiri kobo niile i ji.
Nkutegeeza nti Olibeera omwo okutuusa lw’olimalayo byonna by’obanjibwa.”
27 “Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Akwala iko.’
“Mwawulira bwe kyagambibwa nti, ‘Toyendanga!’
28 Ma asị m unu, onye ọbụla lere nwanyị anya site na-agụụ ịkwa iko emeelarị mmehie ịkwa iko nʼime obi ya megide nwanyị ahụ.
Naye mbagamba nti Buli muntu atunuulira omukazi n’amwegomba aba amaze okumwendako mu mutima gwe.
29 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na anya aka nri gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị baa nʼalaeze karịa na i ji ahụ zuruoke baa nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna g1067)
Noolwekyo obanga eriiso Lyo erya ddyo likuleetera okwesittala, liggyeemu olisuule wala. Kubanga kirungi okugenda mu ggulu ng’ebitundu byo ebimu tobirina okusinga okugenda nabyo byonna mu ggeyeena. (Geenna g1067)
30 Ọ bụrụ na aka nri gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị ma baa nʼalaeze eluigwe, karịa na i ji ahụ zuruoke ma baa nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna g1067)
Era obanga omukono gwo ogwa ddyo gukukozesa ebibi, kirungi okugutemako ogusuule wala. Okugenda mu ggulu ng’ekitundu ky’omubiri gwo ekimu tokirina kisinga okugenda mu ggeyeena n’ebitundu by’omubiri gwo byonna. (Geenna g1067)
31 “E kwukwara sị, ‘Onye ọbụla chọrọ ịgbara nwunye ya alụkwaghị m, ga-ebu ụzọ dee akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya.’
Kyagambibwa nti, ‘Buli anaagobanga mukazi we, anaawanga omukazi oyo ebbaluwa ey’okumugoba.’
32 Ma asị m unu, onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, ma ọ bụghị nʼihi ịkwa iko, ọ na-etinye nwanyị ahụ nʼọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.
Naye mbagamba nti Buli anaagobanga mukazi we wabula olw’obwenzi anaabanga amwenzesezza, n’oyo anaawasanga omukazi gwe bagobye anaabanga ayenze.”
33 “Ọzọkwa, unu nụrụ na a gwara ndị mmadụ nʼoge gara aga sị, ‘Aṅụla iyi ụgha, kama mezuo ihe niile unu ṅụrụ nʼiyi nye Onyenwe anyị.’
“Mwawulira bwe kyagambibwa ab’edda nti, ‘Buli kye weeyamanga eri Mukama okituukirizanga.’
34 Ma asị m unu aṅụla iyi ọbụla. Ejikwala eluigwe aṅụ iyi nʼihi na eluigwe bụ ebe ocheeze Chineke dị.
Naye mbagamba nti: Temulayiranga n’akatono! Temulayiranga ggulu, kubanga ye ntebe y’obwakabaka bwa Katonda.
35 Ejikwala ụwa aṅụ iyi nʼihi na ụwa bụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya. Ejikwala Jerusalem aṅụ iyi nʼihi na ọ bụ obodo Eze ukwu ahụ.
Temulayiranga nsi, kubanga y’entebe y’ebigere bye. Temulayiranga Yerusaalemi, kubanga ky’ekibuga kya Kabaka omukulu.
36 Ejikwala isi gị aṅụ iyi nʼihi na ị pụghị ime ka otu agịrị isi gị dị ọcha maọbụ dị oji.
Era tolayiranga mutwe gwo, kubanga toyinza na kufuula luviiri lwo olumu okuba olweru oba oluddugavu.
37 Aṅụla iyi ọbụla. Kama ka okwu unu bụrụ ‘E’ maọbụ ‘Ee’; ihe ọbụla gafere nke a sitere nʼaka ajọ onye ahụ.
Naye muddangamu buzzi nti, ‘Weewaawo.’ Oba nti, ‘Si weewaawo’. Kubanga bw’ogezaako okukakasa ebigambo byo n’okulayira kiraga nti waliwo ekitali kituufu.”
38 “Unu anụla na e kwuru sị, ‘Ọ bụ anya ka a kụkpọrọ, anya nʼọnọdụ anya. Ọ bụrụkwa otu eze ka e tipụrụ, eze nʼọnọdụ eze.’
“Mwawulira nga kyagambibwa nti, ‘Omuntu bw’anaggyangamu eriiso lya munne n’erirye linaggibwangamu. Oba omuntu bw’anaaggyangamu erinnyo lya munne, n’erirye banaalikuulangamu.’
39 Ma ana m asị unu eguzogidela onye bụ ajọ onye. Kama ọ bụrụ na mmadụ amaa gị ụra na ntị aka nri, tụgharịara ya ntị nke ọzọ.
Naye mbagamba nti, Temuwakananga na mubi, naye omuntu bw’akukubanga oluyi ku ttama erya ddyo omukyusizanga n’ettama eryokubiri.
40 Ọ bụrụ na mmadụ agbaa gị akwụkwọ nʼụlọikpe, ka ọ nara gị uwe ime gị, nyekwa ya uwe nke elu gị.
Omuntu bw’ayagalanga okuwoza naawe atwale essaati yo, omulekeranga n’ekkooti yo.
41 Ọ bụrụ na mmadụ esite nʼike chọọ ka i soro ya gaa puku nzọ ụkwụ atọ, soro ya gaa puku nzọ ụkwụ isii.
N’oyo akuwalirizanga okumwetikkirako omugugu gwe kilomita emu, omutwalirangako n’eyokubiri.
42 Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. Achụghachikwala ndị na-abịa ka i binye ha ego.
Akusaba omuwanga, n’oyo ayagala okukwewolako tomukubanga mabega.”
43 “Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya, ma kpọkwanụ ndị iro unu asị.’
“Mwawulira ab’edda bwe baagambibwa nti, ‘Yagalanga muliraanwa wo, naye okyawenga mulabe wo.’
44 Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nʼanya, kpekwaaranụ ndị na-esogbu unu ekpere.
Naye nze mbagamba nti, Mwagalenga abalabe bammwe! Musabirenga ababayigganya!
45 Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke Nna unu bi nʼeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọrọ ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.
Bwe mulikola bwe mutyo muliba baana ba Kitammwe ali mu ggulu. Kubanga omusana gwe agwakiza abalungi n’ababi, era n’enkuba agitonnyeza ab’amazima n’abatali ba mazima.
46 Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu? Ọ bụladị ndị ọna ụtụ na-emekwa otu a.
Bwe mwagala ababaagala bokka, mufunamu ki? N’abawooza bwe bakola bwe batyo.
47 Ọ bụrụkwa na unu na-ekele naanị ndị enyi unu ekele, ọ dịghị ihe ọbụla dị iche nʼebe unu na ndị ọzọ nọ. Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke na-emekwa otu ahụ.
Era bwe munaalamusanga baganda bammwe bokka, munaaba mulina njawulo ki n’abalala? Kubanga ne bannamawanga bwe bakola bwe batyo.
48 Ya mere, unu kwesiri izuoke nʼịrụ ọrụ ọma, dịka Nna unu bi nʼeluigwe si zukwaa oke.
Naye mmwe kibagwanira okubeeranga abatuukirivu nga Kitammwe ali mu ggulu bw’ali Omutuukirivu.”

< Matiu 5 >