< Levitikọs 23 >
1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
INkosi yasikhuluma kuMozisi isithi:
2 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Ndị a bụ mmemme a kara aka nye Onyenwe anyị, nke unu ga-ekwusa dịka mkpọkọta dị nsọ.
Tshono ebantwaneni bakoIsrayeli uthi kubo: Imikhosi emisiweyo yeNkosi elizayimemezela ibe zinhlangano ezibiziweyo ezingcwele, le yimikhosi yami emisiweyo.
3 “‘Ụbọchị isii ka unu ga-eji rụọ ọrụ. Ma ụbọchị nke asaa, bụ ụbọchị izuike, ụbọchị mkpọkọta dị nsọ. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, nʼebe ọbụla unu bi. Ọ bụ ụbọchị izuike nye Onyenwe anyị.
Umsebenzi uzakwenziwa insuku eziyisithupha; kodwa usuku lwesikhombisa lulisabatha lokuphumula, inhlangano ebiziweyo engcwele; lingenzi lamsebenzi; lulisabatha eNkosini kuyo yonke imizi yenu.
4 “‘Ndị a bụ mmemme Onyenwe anyị a kara aka, mkpọkọta dị nsọ nke unu ga-ekwusa nʼoge a kara aka.
Le yimikhosi emisiweyo yeNkosi, inhlangano ezibiziweyo ezingcwele elizazimemezela ngesikhathi sazo esimisiweyo.
5 Nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa ahụ, nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ka Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị ga-adị.
Ngenyanga yokuqala ngolwetshumi lane lwenyanga kusihlwa kuliphasika leNkosi.
6 Mmemme achịcha na-ekoghị eko Onyenwe anyị ka unu ga-ebido nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa ahụ. Abalị asaa ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
Langosuku lwetshumi lanhlanu lwaleyonyanga kulomkhosi wesinkwa esingelamvubelo eNkosini; dlanini isinkwa esingelamvubelo insuku eziyisikhombisa.
7 Nʼụbọchị mbụ nke mmemme a, unu ga-enwe mkpọkọta dị nsọ, ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-arụ ọrụ ọbụla.
Ngosuku lokuqala lizakuba lenhlangano ebiziweyo engcwele; lingenzi lamsebenzi wezisebenzi.
8 Unu ga-eweta aja e sitere nʼọkụ chụọ nye Onyenwe anyị. Nʼụbọchị nke asaa nweenụ mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.’”
Kodwa lizanikela umnikelo owenzelwe iNkosi ngomlilo insuku eziyisikhombisa. Ngosuku lwesikhombisa kuzakuba khona inhlangano ebiziweyo engcwele; lingenzi lamsebenzi wezisebenzi.
9 Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya,
INkosi yasikhuluma kuMozisi isithi:
10 “Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala ahụ m na-aga inye unu, ghọta mkpụrụ ihe ubi nke mbụ unu, unu ga-ewetara onye nchụaja otu ukwu ọka site nʼọka unu ghọtara nʼubi unu.
Tshono ebantwaneni bakoIsrayeli uthi kubo: Lapho selifikile elizweni engilinika lona, livune isivuno salo, lethani isithungo sezithelo zokuqala zesivuno senu kumpristi,
11 Ọ ga-anara unu ukwu ọka ahụ fufee ya nʼihu Onyenwe anyị, ka a nabata ya. Ọ bụ nʼụbọchị ahụ ga-esote ụbọchị izuike ka onye nchụaja ga-efufe ya.
njalo azunguze isithungo phambi kweNkosi ukuze lemukeleke. Umpristi uzasizunguza ngosuku olulandela isabatha.
12 Nʼotu ụbọchị ahụ e fufere ukwu ọka ahụ, unu ga-ewere nwa ebule na-enweghị ntụpọ, nke gbara naanị otu afọ, chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.
Ngosuku elizunguza ngalo isithungo, nikelani iwundlu elingelasici elilomnyaka owodwa, libe ngumnikelo wokutshiswa eNkosini.
13 Aja mkpụrụ ọka ga-eso aja nsure ọkụ a. Ọ ga-eji iko ọka a kwọrọ nke ọma iri na abụọ a gwara mmanụ oliv, ka ọ bụrụ ihe e surere nʼọkụ na-esi ezi isi ọma nye Onyenwe anyị. A ga-enyekwa iko mmanya atọ dịka onyinye ihe ọṅụṅụ
Lomnikelo wawo wokudla uzakuba zingxenye ezimbili etshumini zempuphu ecolekileyo ixubene lamafutha, ube ngumnikelo owenzelwe iNkosi ngomlilo, kube luqhatshi olumnandi; lomnikelo wawo wokunathwayo uzakuba ngowewayini, ingxenye yesine yehini.
14 Unu agaghị eri achịcha, maọbụ ọka e ghere eghe, maọbụ ọka ọhụrụ tutu ruo mgbe unu buru ụzọ weta onyinye nye Chineke unu. Nʼebe ọbụla unu bi, ụkpụrụ a ga-adịgide ruo ọgbọ niile.
Njalo kaliyikudla isinkwa, lamabele akhanzingiweyo, lezikhwebu ezintsha, kuze kufike lona lolosuku, lize lilethe umnikelo kaNkulunkulu wenu. Kuyisimiso esilaphakade ezizukulwaneni zenu, kuyo yonke imizi yenu.
15 “‘Site nʼụbọchị ahụ sotere ụbọchị izuike, bụ ụbọchị ahụ unu wetara ukwu ọka nke onyinye mfufe, gụpụta izu asaa zuru ezu.
Njalo lizazibalela kusukela ngosuku olulandela isabatha, kusukela ngosuku elaletha ngalo isithungo somnikelo wokuzunguzwa; kuzakuba ngamasabatha ayisikhombisa apheleleyo,
16 Gụpụtakwa iri ụbọchị ise site nʼụbọchị izuike ahụ mezuru izu asaa ahụ ma wetara Onyenwe anyị onyinye ọka ọhụrụ.
kuze kufike usuku olulandela isabatha lesikhombisa libale insuku ezingamatshumi amahlanu; khona lizanikela umnikelo omutsha wokudla eNkosini.
17 Site nʼebe ọbụla unu bi, unu ga-ewetara Onyenwe anyị ogbe achịcha abụọ nke unu ji iko ọka a kwọrọ nke ọma iri na abụọ, nke e ji ihe na-eko achịcha mee, ya bụ yiist, dịka aja mfufe nke mkpụrụ mbụ nye Onyenwe anyị.
Lethani okuvela emizini yenu izinkwa ezimbili zokuzunguzwa; zizakuba zingxenye ezimbili etshumini zempuphu ecolekileyo; zizabhakwa lemvubelo; ziyizithelo zokuqala eNkosini.
18 Tinyere achịcha a, unu ga-eweta ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, na otu nwa oke ehi, na ebule abụọ. Ha ga-abụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ya na aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ, aja e sitere nʼọkụ chụọ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị.
Njalo lizanikela kanye lesinkwa amawundlu ayisikhombisa angelasici alomnyaka owodwa, lejongosi elilodwa ithole lenkomo, lenqama ezimbili; zizakuba ngumnikelo wokutshiswa eNkosini, kanye lomnikelo wazo wokudla leminikelo yazo yokunathwayo, umnikelo owenziwe ngomlilo, kube luqhatshi olumnandi eNkosini.
19 Unu ga-ejikwa otu mkpi chụọ aja mmehie. Werekwa ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja udo.
Lizalungisa njalo izinyane lembuzi elilodwa libe ngumnikelo wesono, lamawundlu amabili alomnyaka owodwa abe ngumhlatshelo weminikelo yokuthula.
20 Onye nchụaja ga-efufe ụmụ atụrụ abụọ ndị a, na achịcha ndị si na mkpụrụ mbụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ha bụ aja dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ọ bụkwa ndị nchụaja ga-ewere ha dịka nri ha.
Umpristi uzazizunguza-ke kanye lesinkwa sezithelo zokuqala zibe ngumnikelo wokuzunguzwa phambi kweNkosi, kanye lamawundlu amabili; zizakuba ngcwele eNkosini, zibe ngezompristi.
21 Nʼotu ụbọchị ahụ unu ga-akpọsakwa mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ. Nke a ga-abụ ụkpụrụ ga-adịgide ebighị ebi site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile, nʼebe ọbụla unu bi.
Lizamemezela ngalona lolosuku; kuzakuba yinhlangano ebiziweyo engcwele kini, lingenzi lamsebenzi wezisebenzi. Kuyisimiso esaphakade kuyo yonke imizi yenu ezizukulwaneni zenu.
22 “‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ niile nke ubi unu. Hapụrụnụ ha ụmụ ogbenye, na ndị ọbịa. Hapụkwara ha mkpụrụ ubi niile dara nʼala. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’”
Lalapho livuna isivuno selizwe lakini, ekuvuneni kwakho ungaqedi emngceleni wensimu yakho; futhi ungabuthi okuseleyo kwesivuno sakho; ukutshiyele umyanga lowemzini. NgiyiNkosi uNkulunkulu wenu.
23 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
INkosi yasikhuluma kuMozisi isithi:
24 “Gwa ụmụ Izrel sị, ‘Ụbọchị mbụ nke ọnwa nke asaa ga-abụ ụbọchị izuike, ụbọchị mkpọkọta dị nsọ nke a ga-eji opi na-ada oke ụda cheta.
Tshono ebantwaneni bakoIsrayeli uthi: Ngenyanga yesikhombisa ngolokuqala lwenyanga kuzakuba kini yikuphumula, isikhumbuzo sokutshaywa kwezimpondo, inhlangano ebiziweyo engcwele.
25 Unu arụla ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, kama unu ga-achụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.’”
Lingenzi lamsebenzi wezisebenzi; kodwa nikelani umnikelo owenzelwe iNkosi ngomlilo.
26 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
INkosi yasikhuluma kuMozisi isithi:
27 “Ụbọchị nke iri nke ọnwa asaa a bụ ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Ọ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ nye unu. Unu ga-ata onwe unu ahụhụ bịa wetara Onyenwe anyị onyinye site nʼọkụ.
Yebo, ngolwetshumi lwalinyanga yesikhombisa kuzakuba lusuku lwenhlawulo yokuthula; lizakuba lenhlangano ebiziweyo engcwele; lizathobisa imiphefumulo yenu, linikele umnikelo owenzelwe iNkosi ngomlilo.
28 Unu arụla ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ nʼihi na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịchụ aja mkpuchi mmehie unu nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu.
Langalona lolosuku lingenzi lamsebenzi, ngoba kulusuku lwenhlawulo yokuthula, ukulenzela lina inhlawulo yokuthula phambi kweNkosi uNkulunkulu wenu.
29 Onye ọbụla na-ejighị ụbọchị ahụ weda onwe ya nʼala ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.
Ngoba loba yiwuphi umphefumulo ongazithobiyo ngalona lolosuku uzaqunywa usuke ebantwini bakibo.
30 Aga m ebibikwa onye ọbụla rụrụ ọrụ nʼụbọchị ahụ.
Laloba yiwuphi umphefumulo owenza loba yiwuphi umsebenzi ngalona lolosuku ngizawubhubhisa lowomphefumulo usuke phakathi kwabantu bakibo.
31 Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla. Nʼebe ọbụla unu bi, ụkpụrụ a ga-adịgide nye unu niile site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Lingenzi lamsebenzi. Kuyisimiso esilaphakade ezizukulwaneni zenu kuyo yonke imizi yenu.
32 Ọ ga-abụ ụbọchị izuike zuruoke nye unu, unu ga-ewedakwa onwe unu nʼala. Nʼụbọchị nke itoolu nke ọnwa ahụ, site nʼuhuruchi ruo nʼuhuruchi nke na-esote ya, unu ga-edebe izuike unu.”
Lisabatha lokuphumula kini; lizathobisa imiphefumulo yenu; ngolwesificamunwemunye lwenyanga, ntambama, kusukela kusihlwa kuze kube kusihlwa, lizagcina isabatha lenu.
33 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
INkosi yasikhuluma kuMozisi isithi:
34 “Gwa ụmụ Izrel, ‘Nʼụbọchị nke iri na ise, nʼọnwa nke asaa, ka unu ga-amalite mmemme Ụlọ Ikwu Onyenwe anyị. A ga-eme ya ụbọchị asaa.
Tshono ebantwaneni bakoIsrayeli uthi: Ngosuku lwetshumi lanhlanu lwale inyanga yesikhombisa kuzakuba lomkhosi wamadumba insuku eziyisikhombisa eNkosini.
35 Nʼụbọchị nke mbụ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ nʼụbọchị ahụ.
Ngosuku lokuqala kuzakuba lenhlangano ebiziweyo engcwele; lingenzi lamsebenzi wezisebenzi.
36 Nʼụbọchị ọbụla nʼime ụbọchị asaa ndị a niile ka a ga-ewetara Onyenwe anyị onyinye site nʼọkụ. Nʼụbọchị nke asatọ ka mkpọkọta dị nsọ ga-adị. A ga-achụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nʼụbọchị a. Ọ bụ mkpokọta mmechi, nʼihi ya, a gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
Insuku eziyisikhombisa lizanikela umnikelo owenzelwe iNkosi ngomlilo. Ngosuku lwesificaminwembili kuzakuba lenhlangano ebiziweyo engcwele kini, linikele umnikelo owenzelwe iNkosi ngomlilo. Kungumhlangano onzulu, lingenzi lamsebenzi wezisebenzi.
37 (“‘Ndị a bụ mmemme a kara aka, mgbe a ga-ekwusa mkpọkọta dị nsọ maka iwetara Onyenwe anyị onyinye nri, ya bụ, onyinye aja nsure ọkụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na aja dị iche iche, na onyinye ihe ọṅụṅụ dịka e sị hazie na ọ ga na-adị kwa ụbọchị.
Le yimikhosi emisiweyo yeNkosi elizayimemezela ibe zinhlangano ezibiziweyo ezingcwele, ukunikela umnikelo owenzelwe iNkosi ngomlilo, umnikelo wokutshiswa, lomnikelo wokudla, umhlatshelo, leminikelo yokunathwayo, kube yilokho lalokho ngosuku lwakho,
38 Unu ga-enye onyinye ndị a, tinyere onyinye a na-enye Onyenwe anyị nʼụbọchị izuike, na tinyere onyinye ndị ọzọ unu na-enye na ihe ndị ọzọ unu kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu niile unu na-enye Onyenwe anyị.)
ngaphandle kwamasabatha eNkosi, langaphandle kwezipho zenu, langaphandle kwezithembiso zenu zonke, langaphandle kweminikelo yenu yonke yesihle, elayinikela eNkosini.
39 “‘Ya mere, malite nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa asaa, mgbe unu webatasịrị ihe ubi unu, meerenụ Onyenwe anyị mmemme ụbọchị asaa, ụbọchị nke mbụ, na ụbọchị nke asatọ ga-abụ ụbọchị izuike.
Kodwa ngosuku lwetshumi lanhlanu lwenyanga yesikhombisa, lapho selibuthile isivuno selizwe, gcinani umkhosi weNkosi insuku eziyisikhombisa. Ngosuku lokuqala kuzakuba lokuphumula langosuku lwesificaminwembili kuzakuba lokuphumula.
40 Nʼụbọchị nke mbụ, unu ga-ewere ụfọdụ mkpụrụ osisi dị mma nke si nʼosisi unu na-amị mkpụrụ, gbutekwa igu nkwụ, na alaka osisi nwere ahịhịa ndụ, na osisi pọpla, jiri ha mee mmemme obi ụtọ nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu ụbọchị asaa.
Langosuku lokuqala zithatheleni izithelo zezihlahla ezinhle, izingatsha zezihlahla zelala, lezingatsha zezihlahla ezilamahlamvu aminyeneyo, leminyezane yemifula, lithabe phambi kweNkosi uNkulunkulu wenu insuku eziyisikhombisa.
41 Mmemme ụbọchị asaa a ga-adị nye Onyenwe anyị nʼafọ niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ unu niile. Ọ bụkwa nʼọnwa nke asaa ka unu ga-eme mmemme a.
Lizawugcina ube ngumkhosi eNkosini insuku eziyisikhombisa ngomnyaka. Kuyisimiso esilaphakade ezizukulwaneni zenu; liwugubhe ngenyanga yesikhombisa.
42 Nʼoge mmemme a, ụmụ Izrel niile ga-ebi nʼụlọ e ji alaka osisi na ahịhịa wuo ụbọchị asaa. Ụmụ afọ Izrel niile ga-ebi nʼụlọ dị otu a.
Lizahlala emadumbeni insuku eziyisikhombisa; bonke abazalwa koIsrayeli bazahlala emadumbeni,
43 Nke a ga-echetara ọgbọ ụmụ Izrel niile na mgbe m kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, unu biri nʼụlọ e ji osisi na ahịhịa wuo nʼọzara. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’”
ukuze izizukulwana zenu zazi ukuthi ngabahlalisa abantwana bakoIsrayeli emadumbeni ekubakhupheni kwami elizweni leGibhithe. NgiyiNkosi uNkulunkulu wenu.
44 Mosis gwara ụmụ Izrel ihe gbasara mmemme niile a kara aka nye Onyenwe anyị.
Ngokunjalo uMozisi wabatshela abantwana bakoIsrayeli imikhosi emisiweyo yeNkosi.