< Levitikọs 15 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
Yahwe alizungumza na Musa na Haruni, akisema,
2 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nwoke ọbụla ihe nsọpụta si nʼahụ ya na-asọpụta, bụ onye rụrụ arụ.
“Waambie watu wa Israeli, na sema kwao, 'Wakati mtu yeyote kisonono kimemwathiri mwili wake unatoa ugiligili, anakuwa najisi.
3 Onye ahụ rụrụ arụ mgbe ihe ahụ si ya nʼahụ na-asọpụta, rụọkwa arụ mgbe ihe ahụ kwụsịrị ịsọ. Otu a ka ihe ọsụsọ ahụ si eme ka onye ahụ rụọ arụ.
Unajisi wake unatokana na athari ya kisonono. Iwe mwili wake unatoa ugiligili au umekoma, huo ni unajisi.”
4 “‘Ihe ọbụla onye ahụ ji anọdụ ala, maọbụ nke o ji dinaa bụ ihe rụrụ arụ.
Kitanda chochote anachokilalia kitakuwa najisi, na kila kitu ambacho anakaa juu yake kitakuwa najisi.
5 Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya, na ahụ ya mmiri.
Yeyote anayegusa kitanda chake lazima afue nguo zake na aoge kwenye maji, na awe amenajisika mpaka jioni.
6 Onye ọbụla nọdụrụ ala nʼihe onye ahụ nọdụrụ ala nʼoge ahụ ọ bụ onye rụrụ arụ, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya, na ahụ ya mmiri.
Yeyote anayekaa katika kitu chochote ambacho mtu ambaye ameathiriwa na kisonono alikaa, mtu huyo lazima afue nguo zake na aoge katika maji, na atakuwa najisi mpaka jioni.
7 “‘Onye ọbụla metụrụ nwoke ahụ ihe si nʼahụ ya na-asọpụta aka ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri, bụrụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
Na yeyote anayegusa mwili wa ambaye ameathirika na kisonono lazima afue nguo zake na aoge katika maji, na awe najisi hadi jioni.
8 “‘Onye ọbụla dị ọcha nke onye ahụ bụsara ọnụ mmiri ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri.
Kama mtu ambaye anaona majimaji kama hayo kwa mtu fulani ambaye ametakasika, ndipo mtu huyo lazima afue nguo zake na aoge kwenye maji, na atakuwa najisi hata jioni.
9 “‘Ihe ọbụla onye ahụ ji anọkwasị nʼelu anụmanụ ọ na-agba ga-abụ ihe rụrụ arụ.
Tandiko lolote ambalo ambaye anamajimaji ya kisonono atalikalia litakuwa najisi.
10 Onye ọbụla ga-eburu, maọbụ metụ ihe ọbụla o ji nọdụ ala aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri.
Yeyote anayegusa kitu chochote kilichokuwa chini ya mtu huyo atakuwa najisi mpaka jioni, na yeyote anayebeba vitu hivyo lazima afue nguo zake na aoge katika maji; atanajisika mpaka jioni.
11 “‘Ọ bụrụ na nwoke ahụ rụrụ arụ ebughị ụzọ saa aka ya tupu o metụ mmadụ aka, onye ahụ o metụrụ aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya mmiri.
Ambaye anamajimaji kama hayo akimgusa kabla kwanza ya kuosha kwa maji safi mikono yake, mtu aliyeguswa lazima afue nguo zake na aoge katika maji, na atakuwa najisi mpaka jioni.
12 “‘A ga-etiwa ite aja ọbụla onye ahụ metụrụ aka, jiri mmiri ṅachaa ihe osisi ọbụla o metụrụ aka.
Chungu chochote cha udongo ambacho ambaye anamajimaji kama hayo akigusa lazima kivunjwe, na kila chombo cha mti lazima kioshwe na maji safi.
13 “‘Mgbe e mere ka onye ahụ bụrụ onye dị ọcha site nʼihe nsọpụta a, ọ ga-anọ ụbọchị asaa maka ịdị ọcha ya. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya nʼime mmiri na-asọ asọ tupu ọ bụrụ onye dị ọcha.
Wakati mwenye kisonono anapotakaswa katika kisonono chake, ndipo lazima ahesabu kwaajili yake siku saba kwaajili ya kutakasika kwake; ndipo afue nguo na aoshe mwili wake kwenye maji yatiririkayo. Ndipo atakuwa safi.
14 Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ bịa nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, were ha nye onye nchụaja.
Katika siku ya nane lazima achukue njiwa wawili au kinda mbili za njiwa na aje mbele za Yahwe pakuingilia kwenye hema ya mkutano; pale lazima atoe hao ndege kwa kuhani.
15 Onye nchụaja ga-eji ha chụọrọ ya aja nʼebe ahụ. Otu nʼime nnụnụ abụọ ahụ ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ maka aja nsure ọkụ. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri nwoke ahụ mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị nʼihi ihe ọsụsọ ahụ.
Lazima kuhani awatoe, moja kama sadaka ya dhambi na nyingine kama ya kuteketezwa, na kuhani lazima afanye upatanisho kwaajili yake mbele za Yahwe kwaajili ya kisonono chake.
16 “‘Nwoke ọbụla mkpụrụ nwa ya si ya nʼamụ pụọ, ga-asa ahụ ya nke ọma, bụrụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
Kama mtu yeyote ametokwa na shahawa, ndipo lazima aoge mwili wake wote katika maji; atanajisika mpaka jioni.
17 A ga-asacha ihe ọbụla mkpụrụ nwa ahụ metụrụ, maọbụ akwa maọbụ akpụkpọ anụ. Ha ga-abụ ihe rụrụ arụ ruo uhuruchi.
Kila vazi au ngozi ambayo juu yake kuna shahawa lazama paoshwe kwa maji; itakuwa najisi mpaka jioni.
18 Mgbe nwoke na nwanyị dinakọrọ, ma nwoke ahụ anyụpụta mkpụrụ nwa, ha abụọ ga-asa ahụ ha nke ọma, bụrụ ndị rụrụ arụ ruo uhuruchi.
Na kama mwanamke na mwanaume watalala pamoja na kunakutokwa kwa shahawa kwenda kwa mwanamke, lazima wote wawili waoge katika maji; watakuwa najisi mpaka jioni.
19 “‘Mgbe ọbara si nwanyị nʼahụ pụọ dịka o kwesiri nʼoge a kara aka nʼọnwa ọbụla, nwanyị ahụ ga-abụ onye rụrụ arụ ụbọchị asaa. Onye ọbụla metụrụ ya aka nʼoge a ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
Mwanamke anapokuwa kwenye hedhi, ataendelea kunajisika kwa siku saba, na yeyote anayemgusa atakuwa najisi mpaka jioni.
20 “‘Ihe ọbụla o dinara nʼelu ya nʼoge a, maọbụ ihe ọ nọkwasịrị nʼelu ya ga-arụ arụ.
Chochote anacholala juu yake wakati wa hedhi kitakuwa najisi; kila kitu ambacho anakalia kitakuwa pia najisi.
21 Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya aka, ga-asa uwe ya na ahụ ya. Ọ ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
Yeyote anayegusa kitanda chake lazima afue nguo zake na aoge kwa maji; mtu huyo atakuwa najisi mpaka jioni.
22 Onye metụrụ ihe o ji nọdụ ala aka ga-asa uwe ya na ahụ ya. Ọ ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
Yeyote anayegusa chochote ambacho amekikalia lazima afue nguo zake na aoge kwa maji; mtu huyo anakuwa najisi mpaka jioni.
23 Ọ bụrụkwa na ọ bụ ihe ndina ya, maọbụ ihe ọzọ nke o ji nọdụ ala, onye ọbụla metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
Iwe juu ya kitanda au kitu chochote juu ya popote atakapokaa, kama akikigusa, mtu huyo atakuwa najisi mpaka jioni.
24 “‘Nwoke dinakwuru nwanyị ọbara si nʼahụ ya na-apụta, ọ bụrụ na ọbara ahụ emetụ ya, ọ ga-abụ onye rụrụ arụ abalị asaa. Ihe ndina ọbụla o dinara nʼelu ya ga-abụ ihe rụrụ arụ.
Kama mwanaume yeyote akilala naye, na unajisi wa mwanamke ukamgusa, atakuwa amenajisika siku saba. Kila kitanda ambacho anakilalia mwanaume huyo kitanajisika.
25 “‘Ọ bụrụ na ọbara si nwanyị nʼahụ na-apụta agafee oge o kwesiri ịkwụsị maọbụ na ọ pụtara nʼoge ọ na-ekwesighị ịpụta, nwanyị ahụ ga-anọgide bụrụ onye rụrụ arụ ogologo ụbọchị ndị ahụ niile ọbara ahụ si ya nʼahụ na-apụta.
Kama mwanamke ametokwa damu kwa siku nyingi ambayo siyo kipindi cha hedhi yake, au ikitoka zaidi ya kipindi chake cha hedhi, wakati wote wa siku za kunajisika, atakuwa kama alikuwa kwenye siku zake za hedhi. Yeye ni najisi.
26 Ihe ọbụla o dinara nʼelu ya mgbe ọbara si ya nʼahụ na-apụta, maọbụ ihe ọbụla ọ nọdụrụ ala nʼelu ya, ga-abụ ihe rụrụ arụ, dịka mgbe ọbara nke oge a kara aka.
Kila kitanda anachokilalia wakati wote wa kutokwa damu itakuwa kwake sawa tu kama kitanda anacholalia wakati wa hedhi, na kila kitu ambacho anakalia kitakuwa najisi, kama tu unajisi wa hedhi yake.
27 Onye ọbụla metụrụ ihe ndina ya maọbụ ihe ọ nọdụrụ ala nʼelu ya aka, ga-arụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asakwa uwe ya na ahụ ya mmiri.
Na yeyote anayegusa kitu kati ya vitu hivyo atakuwa najisi; lazima yeye afue nguo zake na aoge mwenyewe kwenye maji, na atakuwa amenajisika mpaka jioni.
28 “‘Mgbe ọbara ahụ kwụsịrị, ọ ga-agụ ụbọchị asaa site nʼoge ọ kwụsịrị. Mgbe abalị asaa ahụ zuru, ọ ga-abụ onye dị ọcha.
Lakini kama mwanamke ametakasika katika kutokwa na damu, ndipo atahesabu kwaajili yake siku saba, baada ya hizo atakuwa safi.
29 Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, nye onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
Katika siku ya nane atachukua kwake njiwa wawili au kinda wawili wa njiwa na atawaleta kwa kuhani pakuingilia hema ya mkutano.
30 Onye nchụaja ahụ ga-eji otu chụọrọ ya aja mmehie, werekwa nke ọzọ chụọrọ ya aja nsure ọkụ. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi adịghị ọcha nke ihe ọsụsọ ya.
Huyo kuhani atatoa ndege mmoja kama sadaka ya dhambi na mwingine kama sadaka ya kuteketezwa, na atafanya upatanisho kwaajili ya huyo mbele ya Yahwe kwaajili unajisi wa mwanamke atokwaye damu.
31 “‘Unu ga-ekewapụ ụmụ Izrel site nʼihe ndị ahụ na-emerụ ha, ka ha ghara ịnwụ nʼọnọdụ adịghị ọcha ha nʼihi imerụ ụlọ nzute m, nke dị nʼetiti ha.’”
Hivi ndivyo lazima uwatenge watu wa Israeli katika unajisi wao, hivyo hawatakufa tokana na unajisi wao, kwa kuchafua hema langu, ambapo naishi kati yao.
32 Ndị a bụ usoro iwu gbasara ndị ikom ihe si nʼahụ ha na-asọpụta, na ndị ikom rụrụ arụ nʼihi mkpụrụ nwa si ha nʼahụ pụọ.
Huu ndio utaratibu kwa kila ambaye anakisonono, kwaajili kila mwanaume ambaye shahawa yake inatoka na inamfanya kuwa najisi,
33 Ọ bụkwa iwu dịrị nwanyị ọbara si nʼahụ ya pụọ nʼoge a kara aka, na nwoke maọbụ nwanyị ọbụla ihe si nʼahụ ya na-asọpụta, na nke dịrị nwoke ọbụla ya na nwanyị ga-edinakọ nʼoge nwanyị ahụ bụ onye rụrụ arụ.
kwaajili ya mwanamke ambaye yuko katika kipindi cha hedhi, kwaajili ya yeyote aliye na kisonono, awe mwanaume au mwanamke, na kwaajili ya yeyote anayelala na mwanamke najisi.

< Levitikọs 15 >