< Joshua 20 >

1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya,
여호와께서 여호수아에게 일러 가라사대
2 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha họpụtara onwe unu obodo mgbaba dịka m gwara unu site nʼaka Mosis.
이스라엘 자손에게 고하여 이르라 내가 모세로 너희에게 말한 도피성을 택정하여
3 Ka obodo ndị a bụrụ ebe onye gburu mmadụ nʼọghọm na-amaghị ama ga-agbaga nʼihi izere ndụ ya site nʼaka onye ahụ ga-achọ ịbọrọ ọbọ ọchụ.
부지중 오살한 자를 그리로 도망하게 하라 이는 너희 중 피의 보수자를 피할 곳이니라
4 Mgbe onye gburu mmadụ ahụ na-amaghị ama gbabara nʼime otu obodo ndị a, ọ ga-eguzo nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ gwa ndị okenye obodo ahụ ihe niile mere. Ndị okenye ahụ ga-akpọbata ya nʼime obodo ahụ, nye ya ebe ọ ga-ebi nʼetiti ha.
그 성읍들의 하나에 도피하는 자는 그 성읍에 들어가는 문 어귀에 서서 그 성읍 장로들의 귀에 자기의 사고를 고할 것이요 그들은 그를 받아 성읍에 들여 한 곳을 주어 자기들 중에 거하게 하고
5 Ọ bụrụkwa na onye ikwu onye ahụ nwụrụ anwụ abịa ịbọrọ ọbọ ọchụ ahụ, ndị okenye obodo ahụ agaghị ekwe ka e gbuo onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama, nʼihi na onye ahụ akpachaghị anya mee ihe o mere.
피의 보수자가 그 뒤를 따라온다 할지라도 그들은 그 살인자를 그의 손에 내어주지 말지니 이는 본래 미워함이 없이 부지중에 그 이웃을 죽였음이라
6 Onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama ga-anọgide nʼobodo ahụ ruo mgbe ọ ga-akwụrụ nʼihu nzukọ maka ikpe ruokwa mgbe onyeisi nchụaja nọ nʼoge ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, o nwere ike laghachi nʼụlọ nke aka ya na nʼobodo ya bụ ebe o si gbapụ ọsọ.”
그 살인자가 회중의 앞에 서서 재판을 받기까지나 당시 대제사장의 죽기까지 그 성읍에 거하다가 그 후에 그 살인자가 본 성읍 곧 자기가 도망하여 나온 그 성읍의 자기 집으로 돌아갈지니라
7 Obodo ndị ha kewapụtara iche dịka obodo mgbaba bụ, Kedesh, nke dị nʼime Galili, nʼala ugwu ugwu ndị Naftalị; na Shekem, nke dị nʼala ugwu ugwu Ifrem na Kiriat Aba, nke a na-akpọkwa Hebrọn. Ọ dị nʼala ugwu ugwu Juda.
무리가 납달리의 산지 갈릴리 게데스와 에브라임 산지의 세겜과 유다 산지의 기럇 아르바 곧 헤브론을 구별하였고
8 Ha kewapụtara obodo atọ ọzọ nʼihi otu ihe ahụ, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan nʼofe Jeriko. Obodo atọ ndị a bụ, Beza, nke dị nʼọzara, nʼala larịị ahụ e nyere ebo Ruben, na Ramọt; nke dị nʼime Gilead bụ ala ebo Gad; na Golan, nʼime Bashan, nke e si nʼala ebo Manase wepụta.
또 여리고 동 요단 저편 르우벤 지파 중에서 평지 광야의 베셀과 갓 지파 중에서 길르앗라못과 므낫세 지파 중에서 바산 골란을 택하였으니
9 Obodo mgbaba ndị a a họpụtara bụ maka ndị ọbịa bi nʼetiti ụmụ Izrel, na maka ụmụ Izrel. Ọ bụ ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama ga-agbaga. Onye na-abọrọ ọbọ ọchụ agaghị egbukwa onye ahụ tupu e kpee ya ikpe nʼọgbakọ ndị Izrel.
이는 곧 이스라엘 모든 자손과 그들 중에 우거하는 객을 위하여 선정한 성읍들로서 누구든지 부지중 살인한 자로 그리로 도망하여 피의 보수자의 손에 죽지 않게 하기 위함이며 그는 회중 앞에 설 때까지 거기 있을것이니라

< Joshua 20 >