< Jọn 17 >
1 Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o leliri anya nʼeluigwe sị, “Nna, oge ahụ a kara aka eruola, nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị nyekwa gị otuto.
耶稣讲完了这些话,就举目望天,说:“父啊,时候到了,求你让你的儿子获得荣耀,你的儿子就会让你获得荣耀,
2 I nyela ya ikike nʼebe mmadụ niile nọ, na ike inye ndị niile i nyere ya ndụ ebighị ebi. (aiōnios )
正如你把管理全人类的权力给了他,让他可以将永生赐给你所给予他的人。 (aiōnios )
3 Nke a bụkwa ndụ ebighị ebi ahụ. Ka ha mata na naanị gị bụ Chineke nʼezie, matakwa Jisọs Kraịst onye ahụ i zitere nʼụwa. (aiōnios )
知道你是独一的真上帝,并且认识你所派来的耶稣基督,这就是永生。 (aiōnios )
4 Enyere m gị otuto nʼụwa site nʼịrụzu ọrụ niile ị nyere m ka m rụọ.
现在我已在这世间给了你荣耀,完成了你交给我的任务。
5 Ma ugbu a, Nna, nye m otuto nʼihu gị, ụdị otuto ahụ m nwere nʼihu gị tupu e kee ụwa.
父啊,现在让我在你面前获得荣耀,就是在创世纪前我与你同享的荣耀。
6 “Emere m ka ndị ahụ i siri nʼụwa kponye m mara aha gị. Ha bụ ndị nke gị, i nyere m ha, ha debekwara okwu gị.
你从世上分别出来赐给我的人,我已经把你的身份显示给他们了。他们是你的,你把他们赐给了我,他们也遵守了你的道。
7 Ugbu a, ha amarala na ihe niile i nyere m si nʼaka gị bịa.
现在他们知道,你给我的,无论是什么,都是从你那里来,
8 Ma ugbu a, enyela m ha okwu ahụ i nyere m, ha nabatakwara ya, marakwa nʼeziokwu na-esi m nʼebe ị nọ bịa. Ha kwenyekwara na ọ bụ gị zitere m.
你赐给我的话,我已经给了他们,他们也领受了,确定知道我是从你那里来的,并且信你差了我来。
9 Ana m ekpere ha ekpere, ọ bụghị nʼihi ụwa ka m na-ekpe ekpere. Kama ana m ekpe ekpere banyere ndị ahụ i nyere m, nʼihi na ha bụkwa ndị nke gị.
我为他们祈祷,我不为世人祈祷,而是为你赐给我的人祈祷,因为他们是你的。
10 Ihe niile m nwere bụ nke gị, ihe niile i nwere bụkwa nke m. E sitere na ha mee ka otuto m pụta ìhè.
属于我的一切都属于你,你的一切也是我的,并且我因为他们获得了荣耀。
11 Ugbu a, anọghịkwa nʼime ụwa, ma ha ka nọ nʼime ụwa, ana m alaghachikwute gị. Ya mere, Nna dị nsọ, chebe ha nke ọma site nʼike nke aha gị, bụ aha nke ahụ i nyere m, ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu.
我要离开这世界了,他们却仍留在这里,我要到你那里去了。圣父啊,求你凭着赐给我的名,保护他们,让他们成为一体,就像我们一样。
12 Mgbe mụ na ha nọ nʼụwa, echebere m ha site nʼaha gị nke i nyere m. Echebekwara m ha, o nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha lara nʼiyi, karịakwa onye ahụ bụ nwa nke ịla nʼiyi, ka e mezuo ihe akwụkwọ nsọ kwuru.
我跟他们在一起的时候,因你赐给我的名,我看护他们,除了那‘迷失之子’以外,其他人都没有迷失,这就应验了经文上的话。
13 “Ma ugbu a, ana m alọghachikwute gị, ma ana m ekwu ihe ndị a nʼụwa ugbu a ka ha nwee nʼọṅụ m, nʼebe o zuruoke nʼime ha.
现在我到你那里去,我在世上说这些话,就是要他们充分分享我的欢喜。
14 Enyela m ha okwu gị. Ma nʼihi ya, ụwa akpọọla ha asị. Nʼihi na ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụghị onye nke ụwa.
我把你的道赐给他们,世人恨他们,因为他们不属于这世界,像我不属于这世界一样。
15 Ekpeghị m ekpere ka iwepụ ha nʼụwa, kama ka ịnapụta ha site nʼaka ajọ onye ahụ.
我不求你让他们离开这个世界,只求你保护他们远离恶人。
16 Ha onwe ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụkwaghị onye nke ụwa.
他们不属于这世界,像我不属于这世界一样。
17 Were eziokwu doo ha nsọ, okwu gị bụ eziokwu.
求你用真理让他们变得神圣,你的道就是真理。
18 Dị ka i siri zite m nʼụwa, otu a ka m na-ezipụkwa ha nʼụwa.
就像你派我到这世上来,我也将同样派他们到世界各地。
19 Ọ bụkwa nʼihi ha ka m jiri debe onwe m nsọ, ka ha onwe ha bụrụkwa ndị e doro nsọ nʼeziokwu.
我为他们奉献自己,让他们能够真正成为神圣之人。
20 “Ekpeghị m ekpere a nʼihi ndị a naanị. Kama ana m ekpekwa ekpere a nʼihi ndị niile ga-ekwere na mụ, site nʼokwu ha.
我不但为他们祈求,也为那些因他们传递的福音而信我的人求,
21 Ka ha niile bụrụ otu, Nna, dị ka ị nọ nʼime m mụ a nọrọ nʼime gị. Ka ha nọrọkwa nʼime anyị ka ụwa kwere na ọ bụ gị zitere m.
祈求他们都能合而为一,就像天父你与我同在,我与你同在。求他们也与我们同在,让世人相信是你派我前来。
22 Enyere m ha otuto nke i nyere m, ka ha bụrụ otu dị ka anyị onwe anyị si bụrụ otu;
你赐给我的荣耀,我已经赐给了他们,使他们合而为一,像我们合而为一。
23 Mụ onwe m nʼime ha, gị onwe gị nʼime m. Ka e mee ka ha bụrụ otu nʼụzọ zuruoke, ka ụwa matakwa na ọ bụ gị zitere m, na ị hụkwara ha nʼanya dị ka ị si hụ m nʼanya.
我与他们同在,你与我同在,使他们完完全全合而为一,让世人知道你派我前来,知道你爱他们,好像爱我一样。
24 “Nna, achọrọ m ka ndị niile i nyere m soro m nọrọ ebe m nọ. Ka ha hụ otuto m nke i nyere m nʼihi na ị hụrụ m nʼanya tupu atọọ ntọala nke ụwa.
父啊,我在哪里,希望你赐给我的那些人,也能到我所在的地方,让他们看见你赐给我的荣耀,因为在创立世界以前,你就已经爱我了。
25 “Nna onye ezi omume, ụwa amaghị gị. Ma amaara m gị. Ndị a matakwara na ọ bụ gị zitere m.
善良的天父啊,世人虽然不认识你,我却认识你,与我一起的这些人也知道你派我前来。
26 Emekwara m ka ha mara aha gị. Aga m agakwa nʼihu ime ka ha mara ya. Ka ịhụnanya ahụ i nwere nʼebe m nọ dịgide nʼime ha, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime ha.”
我已经把你的性格显示给他们,还要再显示,让他们也能拥有你对我的爱,我将与他们同在。”