< Juel 3 >

1 “Nʼihi na, lee, nʼụbọchị ahụ, nʼoge ahụ, mgbe m ga-eweghachi akụnụba nke Juda na Jerusalem,
"For, look, in those days, and in that time, when I restore the fortunes of Judah and Jerusalem,
2 na m ga-achịkọta mba niile nke ụwa, mee ka ha zukọọ na Ndagwurugwu Jehoshafat. Nʼebe ahụ, ka mụ onwe m ga-ama ha ikpe, nʼihi ihe ha mere ihe nketa m, na ndị nke m Izrel. Nʼihi na ha chụsasịrị ndị m nʼetiti mba niile, kee ala m nʼetiti onwe ha.
I will gather all nations, and will bring them down into the Valley of Jehoshaphat; and I will execute judgment on them there for my people, and for my heritage, Israel, whom they have scattered among the nations. They have divided my land,
3 Ha fere nza nʼihi ndị m, were ụmụ m ndị nwoke gbanwere ụmụ akwụna. Ha rere ụmụ m ndị nwanyị nʼihi mmanya, nʼihi inweta mmanya ha ga-aṅụ.
and have cast lots for my people, and have given a boy for a prostitute, and sold a girl for wine, that they may drink.
4 “Ọ bụ gịnị ka unu nwere megide m, unu Taịa na Saịdọn, na unu obodo ahụ niile dị gburugburu ala ndị Filistia? O nwere ihe m mere nke unu na-akwụghachi m ụgwọ ya? Ọ bụrụ nʼezie na unu na-akwụghachi m ụgwọ, mụ onwe m ga-eji ọsọ kwụghachi unu ihe ọjọọ niile unu mere.
"Yes, and what are you to me, Tyre, and Sidon, and all the regions of Philistia? Will you repay me? And if you repay me, I will swiftly and speedily return your repayment on your own head.
5 Nʼihi na unu weere ọlaọcha m na ọlaedo m, burukwa ihe dị oke ọnụahịa niile m nwere, bulaa ha nʼụlọnsọ chi unu.
Because you have taken my silver and my gold, and have carried my finest treasures into your temples,
6 Unu refuru ndị Juda na ndị Jerusalem, resi ha ndị Griik, si otu a wega ha nʼebe dị anya site nʼala ha.
and have sold the people of Judah and the people of Jerusalem to the people of the Greeks, that you may remove them far from their border.
7 “Lee, aga m esi nʼebe ahụ unu refuru ha kpọlite ha. Aga m emekwa ka ihe ndị ahụ niile unu mere bịaghachi unu nʼisi.
Look, I will stir them up out of the place where you have sold them, and will return your repayment on your own head;
8 Aga m ewere ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị resi ha ndị Juda, ndị ga-eresi ha ndị Sheba, bụ mba tere anya.” Onyenwe anyị ekwuola ya.
and I will sell your sons and your daughters into the hands of the people of Judah, and they will sell them to the men of Sheba, to a faraway nation, for the LORD has spoken it."
9 Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile: Jikerenụ agha! Kpọteenụ ndị dike nʼagha. Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha.
Proclaim this among the nations: "Prepare for war. Stir up the mighty men. Let all the warriors draw near. Let them come up.
10 Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha, kpụgharịakwanụ mma ịkwa osisi unu ka ha ghọọ ùbe. Ka onye na-adịghị ike kwuo sị, “Adị m ike!”
Beat your plowshares into swords, and your pruning hooks into spears. Let the weak say, 'I am strong.'
11 Chịkọta onwe unu ọsịịsọ, bịa, unu mba niile, nọ nʼebe niile. Zukọtaanụ nʼebe ahụ. Kpọdata ndị agha gị dị ike Onyenwe anyị!
Hurry and come, all you surrounding nations, and gather yourselves together." Cause your mighty ones to come down there, LORD.
12 “Ka akpọlitekwa mba niile, mee ka ha niile bịaruo na Ndagwurugwu Jehoshafat, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka m ga-anọ kpee mba nọ nʼakụkụ niile ikpe.
"Let the nations arouse themselves, and come up to the Valley of Jehoshaphat; for there will I sit to judge all the surrounding nations.
13 Tinye mma iwe ihe ubi, nʼihi na mkpụrụ ubi achaala. Bịa zọchaa mkpụrụ vaịnị, nʼihi nʼebe ịzọcha mmanya ejula, ebe ịnara mmanya gị niile ejubigakwala oke, nʼihi na ajọ omume ha dị ukwuu.”
Put in the sickle; for the harvest is ripe. Come, tread, for the winepress is full, the vats overflow, for their wickedness is great."
14 Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ! Ha jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe ahụ! Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso, na ndagwurugwu mkpebi nhọrọ ahụ.
Multitudes, multitudes in the valley of decision. For the day of the LORD is near, in the valley of decision.
15 Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji, kpakpando agakwaghị enye ìhè.
The sun and the moon are darkened, and the stars withdraw their shining.
16 Onyenwe anyị ga-ebigbọ na Zayọn, olu ya ga-ada nʼime Jerusalem. Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji. Onyenwe anyị ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba. Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike.
The LORD will roar from Zion, and thunder from Jerusalem; and the heavens and the earth will shake; but the LORD will be a refuge to his people, and a stronghold to the children of Israel.
17 “Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu bi na Zayọn, nʼugwu m dị nsọ. Jerusalem ga-abụ ebe dị nsọ. Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ.
"So you will know that I am the LORD your God, who dwells in Zion, my holy mountain. Then Jerusalem will be holy, and no strangers will pass through her any more.
18 “Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị, mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile; mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru. Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị sọpụta dee Ndagwurugwu Shitim.
It will happen in that day, that the mountains will drop down sweet wine, the hills will flow with milk, all the brooks of Judah will flow with waters, and a fountain will come forth from the house of the LORD, and will water the Valley of Shittim.
19 Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu, Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi ihe ike ha mere ndị Juda, bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha.
Egypt will be a desolation, and Edom will be a desolate wilderness, for the violence done to the people of Judah, because they have shed innocent blood in their land.
20 Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. A ga-ebikwa na Jerusalem nʼọgbọ niile.
But Judah will be inhabited forever, and Jerusalem from generation to generation.
21 Aga m ahapụ ịbọ ọbọ ọbara ha? Mba, agaghị m agụnye onye ikpe maara dịka onye ikpe na-amaghị.
And I will pardon their bloodguilt, which I have not pardoned, for the LORD dwells in Zion."

< Juel 3 >