< Job 9 >

1 Job zara sị:
UJobe wasephendula wathi:
2 “Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu. Ma mmadụ dị ndụ ọ ga-esi aṅaa gosi na ya bụ onye aka ya dị ọcha nʼihu Chineke?
Ngeqiniso ngiyazi ukuthi kunjalo. Kodwa umuntu angalunga njani kuNkulunkulu?
3 Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ, ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya?
Uba efisa ukuphikisana laye, kayikumphendula okukodwa phakathi kwenkulungwane.
4 Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara, onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ?
Uhlakaniphile enhliziyweni, uqinile emandleni: Ngubani oziqinisileyo wamelana laye waphumelela?
5 Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a, na-akwatụ ha nʼiwe ya.
Osusa izintaba njalo zingazi, ozigenqula entukuthelweni yakhe.
6 Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya, mee ka ogidi ya maa jijiji.
Onyikinya umhlaba awususe endaweni yawo, lensika zawo zizamazame.
7 Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha; ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye.
Olaya ilanga ukuthi lingaphumi, avalele inkanyezi ngophawu.
8 Naanị ya gbasara mbara eluigwe, ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri.
Owendlala amazulu eyedwa, anyathele phezu kwezingqonga zolwandle.
9 Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion na Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe.
Owenza iBhere, iziNja, lesiLimela, lamakamelo eningizimu.
10 Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta, ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta.
Owenza izinto ezinkulu ezingelakuhlolwa, lezimangalisayo ezingelakubalwa.
11 Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya, mgbe ọ na-agabiga, adịghị m amata na ọ bụ ya.
Khangela, uyedlula phansi kwami ngingamboni, edlulele phambili ngingamuzwa.
12 Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya? Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’
Khangela, uyahluthuna, ngubani ongamnqanda? Ngubani ongathi kuye: Wenzani?
13 Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi, ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya.
UNkulunkulu kayinqandi intukuthelo yakhe. Abasizi bakaRahabi bayakhothama phansi kwakhe.
14 “Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ, maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka?
Pho-ke, mina ngingamphendula ngithini, ngikhethe amazwi ami okuqondana laye?
15 Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu; kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere.
Ebengingeke ngamphendula loba bengilungile; ngizacela isihawu kumahluleli wami.
16 A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m, ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị.
Uba bengibizile, wangiphendula, bengingayikukholwa ukuthi ubekile indlebe elizwini lami.
17 Ọ ga-eji oke ifufe tirie m, meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya.
Ngoba uyangihlifiza ngesiphepho, andise amanxeba ami kungelasizatho.
18 Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi kama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m.
Kangivumeli ukukhokha umoya, kodwa engigcwalisa ngezinto ezibabayo.
19 Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu! Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya.
Uba kungamandla, khangela, ulamandla. Njalo uba kungesahlulelo, ngubani ozangibiza?
20 A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe; ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara.
Aluba ngilungile, umlomo wami uzangilahla; uba ngiphelele, uzakuthi ngonakele.
21 “Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghị ejighị m onwe m kpọrọ ihe; nʼezie ana m eleda ndụ m anya.
Ngiphelele, angikhathaleli umphefumulo wami, ngidelela impilo yami.
22 Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị, ‘Ọ na-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi.’
Kunye lokho, ngenxa yalokho ngithi: Uyabhubhisa olungileyo lomubi.
23 Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede, ọ na-achị enweghị olileanya nke ndị na-enweghị ihe ha mere ọchị.
Lapho isiswepu sibulala ngokujumayo, uzahleka ukudangala kwabangelacala.
24 Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu, ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya. Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya?
Umhlaba unikelwe esandleni somubi; wembesa ubuso babehluleli bawo. Uba kungenjalo, pho, ngubani?
25 “Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ; ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya.
Njalo insuku zami zilejubane kulesigijimi; ziyabaleka, kaziboni okuhle.
26 Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs, dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri.
Ziyedlula njengezikepe zomhlanga, njengokhozi olutheleka empangweni.
27 Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m, aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’
Uba ngisithi: Ngizakhohlwa ukusola kwami, ngitshiye ukunyukumala kwami, ngithokoze,
28 Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu nʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha.
ngiyesaba zonke insizi zami, ngiyazi ukuthi kawuyikungiphatha njengongelacala.
29 Ebe m bụrịị onye ikpe mara, nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu?
Ngilecala mina, pho, ngizatshikatshikelelani ize?
30 A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m werekwa soda saa aka m abụọ,
Uba ngizigezisa ngamanzi eliqhwa elikhithikileyo, ngihlambulule izandla zami ngesepa,
31 ị ga-enuba m nʼolulu apịtị nke pụrụ ime ka uwe m yi nʼahụ m kpọọ m asị.
khona uzangiphosela emgodini, besengisenyanywa yizigqoko zami.
32 “Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya, ka anyị abụọ kpọrịtaa onwe anyị ikpe nʼụlọikpe.
Ngoba kasuye umuntu njengami ukuze ngimphendule, ukuze siye ndawonye kusahlulelo.
33 A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị, onye ga-ebikwasị anyị abụọ aka ya,
Kakukho umqamuli phakathi kwethu ongabeka isandla sakhe phezu kwethu sobabili.
34 onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ, ka oke egwu ya gharakwa ịtụ m ọzọ.
Kasuse uswazi lwakhe kimi, njalo uvalo ngaye lungangethusi.
35 Mgbe ahụ ka m ga-ekwu okwu na-atụghị ya egwu; ma ka ọ dị ugbu a ọ dịghị ihe m nwere ike ime.
Bengingakhuluma ngingamesabi, kodwa anginjalo ngokwami.

< Job 9 >