< Job 40 >

1 Onyenwe anyị zara Job sị:
OLELO mai hoi o Iehova ia Ioba, i mai la,
2 “Onye ahụ na-arụso Onye pụrụ ime ihe niile ụka ọ pụrụ ịdọ ya aka na ntị? Ka onye ahụ na-ebo Chineke ebubo zaghachi ya.”
O ka mea hoopaapaa i ka Mea mana, e ao mai anei ia ia ia? O ka mea e ao mai i ke Akua, nana no e ekemu mai.
3 Mgbe ahụ, Job zaghachiri Onyenwe anyị sị:
Alaila, olelo aku o Ioba ia Iehova, i aku la,
4 “Abụ m onye na-erughị eru. Oleekwanụ ka m ga-esi zaghachi gị? Eji m aka m kpuchie ọnụ m.
Aia hoi, ua inoino wau; Heaha ka'u e ekemu aku ai ia oe? E kau aku au i kuu lima maluna o kuu waha.
5 Ekwuola m mbụ, ma enweghị m ọsịsa ọzọ kwuokwa ugboro abụọ, ma agaghị m ekwukwa ọzọ.”
Hookahi ka'u olelo ana, aka, aole au e ekemu hou; A elua hoi, aka, aole au e olelo hou aku.
6 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị:
Alaila olelo mai o Iehova ia Ioba mailoko mai o ka puahiohio, i mai la,
7 “Kwadoo onwe gị dịka dimkpa; enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị, achọkwara m ka i nye m ọsịsa.
E kakoo oe ano, me he kanaka la, i kou puhaka: E ninau aku au ia oe, a hoike mai oe ia'u.
8 “Ị ga-aga nʼihu ikwujọ ikpe ziri ezi m? Ị ga-aga nʼihu maa m ikpe ka ị si otu a bụrụ onye ikpe gaara?
E hoole anei hoi oe i ko'u pono? E hoahewa anei oe ia'u, i hoaponoia'i oe?
9 Ogwe aka gị ọ dị ike dịka nke Chineke? Olu gị ọ pụrụ ịda ụda dịka nke ya?
He lima anei kou e like me ko ke Akua? E hiki anei ia oe ke hoohekili me ka leo e like me kona?
10 Were ebube na ịdị ukwuu chọọ onwe gị mma, yikwasịkwa onwe gị nsọpụrụ na ugwu dịka uwe.
E hoonani oe ano ia oe iho me ka hanohano a me ko kiekie; E hoaalu hoi ia oe iho i ka nani a me ka mahalo.
11 Wụsa iwe gị dị ọkụ nʼebe ndị mpako niile nọ, weda ha nʼala,
E hookuu aku oe i kou huhu ikaika: A nana aku i ka mea kiekie a pau, a hoohaahaa ia ia.
12 lekwasịkwa ndị mpako niile anya mee ha ihe ihere, ma tiriekwa ndị na-emebi iwu ebe ha guzo.
E nana aku i ka mea haaheo a pau, a e hookulou ia ia; A e hehi iho ilalo i ka poe hewa ma ko lakou wahi.
13 Likọta ha niile nʼotu nʼaja, kpuchie ihu ha niile nʼala ili.
E hoonalo pu ia lakou iloko o ka lepo; E uhi i ko lakou maka i ka pouli.
14 Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-ekwenyere gị, na aka nri nwere ike ịzọpụta gị.
Alaila e hooia aku au ia oe, E hiki no i kou lima akau ke hoola ia oe iho.
15 “Lee enyi mmiri anya, bụ nke m kere dịka m si kee gị, ma ihe ọ na-eri bụ ahịhịa dịka ehi.
E nana ano i ka behemo, ka mea a'u i hana'i me oe; Ua ai no ia i ka weuweu e like me ka bipi.
16 Lee ike dị nʼukwu ya, leekwa ike dị nʼime afọ ya.
Aia hoi, ano, o kona ikaika ma kona puhaka, O kona mana hoi ma na wahi paa o kona opu.
17 Ọdụdụ ya ka ọ na-efegharị dịka osisi sida; akwara dị ya nʼahụ ka e jikọtara nke ọma.
Ua kunini no ia i kona huelo me he laau kedera la, O na olona o kona uha ua ulana pu ia.
18 Ọkpụkpụ ya niile dịka ogidi bronz nwere ụmị, ọkpụkpụ ụkwụ na aka ya dịka okporo igwe.
O kona mau iwi me na auka keleawe, O kona mau iwi, ua like me na auka hao.
19 Ya onwe ya bụ otu nʼime ọrụ aka mbụ nke Chineke, ma naanị onye kere ya nwere ike iji mma agha bịa ya nso.
Oia ke pookela o na hana a ke Akua! O ka mea nana ia i hana, haawi no ia i pahikaua nana.
20 Ugwu na-enye ya ihe ọ na-eri. Nʼebe ahụ kwa ka ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ na-anọ egwuri egwu.
Ua hoohua mai na mauna i ka ai nana, A malaila na holoholona a pau o ke kula i paani ai.
21 Ọ na-edina nʼokpuru ahịhịa na-eto nʼakụkụ mmiri, zookwa onwe ya nʼetiti ahịhịa riidi nʼapịtị.
Moe iho no ia malalo o na laau malu, Maloko o kahi nalo o ka ohe a me ke kiolepo.
22 Ahịhịa lotus na-eji ndo ya kpuchie ya, osisi pọpla nke dị nʼakụkụ mmiri gbara ya gburugburu.
Uhi iho la na laau malu ia ia me ko lakou malu; A puni mai ia ia na wilou o ke kahawai.
23 Ọ bụladị mgbe ebili mmiri na-ama, ọ dịghị atụ egwu; ọ na-anọ nwayọọ, nʼagbanyeghị na mmiri Jọdan na-asọpụta na-asọju ya nʼọnụ.
Aia hoi, huai mai ka muliwai, aole ia i holo aku, Noho malie no ia i ka wa i huai mai ai o Ioredane i kona waha.
24 Onye pụrụ ijide ya mgbe ọ na-ele anya, maọbụ were ọnya jide ya mapuo ya imi?
Imua o kona mau maka e hopu anei kekahi ia ia? A e hoopuka aku i kona ihu i ka lou?

< Job 40 >