< Job 35 >

1 Mgbe ahụ, Elihu sịrị:
Moreover Elihu, responded and said: —
2 “Ị na-eche na nke a ziri ezi? Ị sịrị, ‘Na m ziri ezi ọ bụghị Chineke.’
This, dost thou think to be right? Thou hast said—My righteousness is more than GOD’S.
3 Nʼagbanyeghị ihe ndị a, ị na-ajụ ya si, ‘Uru gịnị ka ọ baara m, gịnị bụ uru m ma ọ bụrụ na emehieghị m?’
For thou dost say, How can one profit by thee? How can I benefit, more than by my sin?
4 “Ọ ga-amasị m ịzaghachi gị, zaghachikwa ndị enyi gị na ha nọ.
I, will answer thee plainly, and thy friends with thee.
5 Lelie anya na eluigwe ma hụkwa. Legide mbara igwe na igwe oji niile, nke dị anya karịa gị.
Look at the heavens and see, —and survey the skies—they are higher than thou.
6 Ọ bụrụ na i mehie, olee ụzọ nke a si metụta ya? Ọ bụrụ na mmehie gị bara ụba, gịnị ka nke a pụrụ ime ya?
If thou sinnest, what canst thou work against him? Or, if thy transgressions be multiplied, what canst thou do unto him?
7 Ọ bụrụ na ị bụ onye ezi omume, gịnị ka ị na-enye ya, maọbụ gịnị ka ọ na-anata site nʼaka gị?
If thou art righteous, what canst thou give unto him? Or what, at thy hand, can he accept?
8 Ajọ omume gị na-emetụta naanị mmadụ dịka gị, ma ezi omume gị na-emetụta naanị ụmụ ndị mmadụ.
Unto a man like thyself, might thy lawlessness [reach], and, unto a son of the earth-born, thy righteousness.
9 “Ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa nʼihi ịba ụba nke mmegbu, ha na-arịọ arịrịọ enyemaka site nʼaka ndị dị ike.
By reason of the multitude of oppressions, [men] make outcry, They cry for help, by reason of the arm of the mighty;
10 Ma ọ dịghị onye na-asị, ‘Olee ebe Chineke onye kere m nọ, onye na-enye abụ nʼime abalị,
But none saith—Where is GOD my maker, Who giveth songs in the night;
11 onye na-akụziri anyị ihe karịa ka ọ na-akụziri ụmụ anụ ọhịa nke ụwa, onye na-eme ka anyị bụrụ ndị maara ihe karịa ụmụ nnụnụ nke igwe?’
Who teacheth us more than the beasts of the earth, and, beyond the bird of the heavens, giveth us wisdom?
12 Ọ dịghị azaghachi mgbe ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa, nʼihi ịnya isi nke ndị ajọ omume.
There, [men] make outcry, and he answereth not, because of the arrogance of evil-doers.
13 Nʼezie, Chineke adịghị aṅa ntị nʼarịrịọ efu ha; Onye pụrụ ime ihe niile a dịghị elebara ya anya.
Howbeit, vanity, will GOD not hear, Yea, the Almighty, will not regard it.
14 Ma ya bụrụzie nke a ị na-ekwu, ọ ga-esi aṅaa gee ntị mgbe ị na-ekwu na ị dịghị ahụ ya anya, na i burula ikpe gị bịa nʼihu ya na ị ga-anọkwa na-eche ya!
How much less when thou sayest thou wilt not regard him! The cause, is before him, and thou must wait for him.
15 Ọzọ, nʼihi na iwe ya adịghị eweta ntaramahụhụ, nʼihi na ọ dịghị arịba ama ajọ omume ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta.
But, now, because it is not so, [thou sayest] —His anger hath punished, and yet hath he not at all known of transgression;
16 Ya mere, Job saghere ọnụ ya kwuo okwu dịka onye na-amaghị ihe; ka onye na-enweghị uche ọ na-ekwu okwu nkwukwasị efu.”
Thus, Job, vainly openeth his mouth, Without knowledge, he multiplieth words.

< Job 35 >