< Job 30 >

1 “Ma ugbu a, ha na-akwa m emo bụ ndị bụ ụmụntakịrị nʼebe m nọ, bụ ndị nna ha na-etorughị ndị m na-ezipụ ka ha na nkịta na-eso atụrụ m nọkọta.
“Ama şimdi, yaşı benden küçük olanlar Benimle alay etmekte, Oysa babalarını sürümün köpeklerinin Yanına koymaya tenezzül etmezdim.
2 Uru gịnị ka ike aka ha ga-abara m, ebe ọ bụ na ha adịghịkwa ike?
Çünkü güçleri tükenmişti, Bileklerinin gücü ne işime yarardı?
3 Ha bụ ndị ike gwụrụ site nʼụkọ na agụụ, ha na-agagharị nʼala kpọrọ nkụ na-awagharịkwa nʼime ọzara nʼabalị.
Yoksulluktan, açlıktan bitkindiler, Akşam çölde, ıssız çorak yerlerde kök kemiriyorlardı.
4 Nʼala ọhịa ka ha na-atụrị ahịhịa nnu, mgbọrọgwụ osisi brum bụkwa nri ha.
Çalılıklarda karapazı topluyor, Retem kökü yiyorlardı.
5 A chụpụrụ ha site nʼetiti ndị mmadụ ibe ha, a na-etiso ha mkpu dịka ha bụ ndị ohi.
Toplumdan kovuluyorlardı, İnsanlar hırsızmışlar gibi onlara bağırıyordu.
6 A chụpụrụ ha ka ha gaa biri nʼala iyi mmiri na-adịghị. Ha bi nʼetiti ọgba nkume na ọnụ a tụrụ nʼime ala.
Korkunç vadilerde, yerdeki deliklerde, Kaya kovuklarında yaşıyorlardı.
7 Ha na-eme ụzụ nʼọhịa dịka ụmụ anụmanụ, na-ejikọta onwe ha nʼahịhịa toro nʼokpuru osisi.
Çalıların arasında anırır, Çalı altında birbirine sokulurlardı.
8 Ha bụ ndị e ledara anya, ndị na-enweghị aha, e sitere nʼala ahụ chụpụ ha.
Aptalların, adı sanı belirsiz insanların çocuklarıydılar, Ülkeden kovulmuşlardı.
9 “Ma ugbu a, abụrụla m ihe ụmụ okorobịa ji abụ abụ ịkwa emo; abụrụkwala m okwu ha ji anọpụrụ ụbọchị.
“Şimdiyse destan oldum dillerine, Ağızlarına doladılar beni.
10 Abụ m ihe ịsọ oyi nye ha, ha adịghị abịakwa m nso; ha anaghị egbu oge igbu m asọ mmiri nʼihu.
Benden tiksiniyor, uzak duruyorlar, Yüzüme tükürmekten çekinmiyorlar.
11 Ma ugbu a, ebe ọ bụ na Chineke atọpụla eriri ụta m ma kpagbuo m, o nwekwaghị ihe ha na-adịghị eme nʼihu m.
Tanrı ipimi çözüp beni alçalttığı için Dizginsiz davranmaya başladılar bana.
12 Nʼaka nri m mba ndị a na-ebuso m agha. Ha na-esiri ụkwụ m ọnya, ha na-ewuli mgbidi ha nọchibido m.
Sağımdaki ayak takımı üzerime yürüyor, Ayaklarımı kaydırıyor, Bana karşı rampalar kuruyorlar.
13 Ha na-etiwasị ụzọ m, ha kwadoro mmekpa ahụ m. ‘O nweghị onye ga-enyere ya aka,’ ka ha na-ekwu.
Yolumu kesiyor, Kimseden yardım görmeden Beni yok etmeye çalışıyorlar.
14 Ha na-abịakwasị m dịka ndị sitere ebe e tipuru mgbidi; nʼetiti mbibi ya ha na-enu onwe ha enute nʼebe m nọ.
Koca bir gedikten girer gibi ilerliyor, Yıkıntılar arasından üzerime yuvarlanıyorlar.
15 Oke egwu abịakwasịla m; ugwu m adịla ka ihe ifufe buuru, nchekwa m agabigala dịka igwe ojii.
Dehşet çöktü üzerime, Onurum rüzgara kapılmış gibi uçtu, Mutluluğum bulut gibi geçip gitti.
16 “Ugbu a, ndụ m ji nwayọọ nwayọọ na-agabiga; ụbọchị ahụhụ ejidela m.
“Şimdi tükeniyorum, Acı günler beni ele geçirdi.
17 Abalị na-esewasị ọkpụkpụ m, ihe mgbu m nke na-ata ata enweghị ezumike.
Geceleri kemiklerim sızlıyor, Beni kemiren acılar hiç durmuyor.
18 Nʼoke ike ya, Chineke na-adịrị m ka uwe; ọ na-ekechi m dịka olu uwe m.
Tanrı'nın şiddeti Üzerimdeki giysiye dönüştü, Gömleğimin yakası gibi beni sıkıyor.
19 Ọ na-atụba m nʼime apịtị, mee ka m ghọọ ntụ na aja.
Beni çamura fırlattı, Toza, küle döndüm.
20 “Chineke m, anam etiku gị ma ị dịghị aza m; anam eguzo ọtọ, ma naanị anya ka i lere m.
“Sana yakarıyorum, ama yanıt vermiyorsun, Ayağa kalktığımda gözünü bana dikiyorsun.
21 Ị na-emegide m na-enweghị obi ebere; i ji aka gị dị ike megide m.
Bana acımasız davranıyor, Bileğinin gücüyle beni eziyorsun.
22 Ị na-ejide m nʼike welie m elu chụba m nʼoke ifufe, ị na-eme ka m bụrụ onye na-akwụfegharị nʼoke ifufe nke mmiri.
Beni kaldırıp rüzgara bindiriyorsun, Fırtınanın içinde darma duman ediyorsun.
23 Amara m na ị ga-eweda m ruo ọnwụ; ruo nʼebe e debeere mmadụ niile dị ndụ.
Biliyorum, beni ölüme, Bütün canlıların toplanacağı yere götüreceksin.
24 “Nʼezie, ọ dịghị onye na-emegide onye e tidara nʼala; mgbe ọ na-eti mkpu nʼọnọdụ nhụju anya ya na-achọ enyemaka.
“Kuşkusuz düşenin dostu olmaz, Felakete uğrayıp yardım istediğinde.
25 Ọ bụ na m akwaghị akwa nʼihi ndị nọ na nsogbu; ọ bụ na mmụọ m erughị ụjụ nʼihi ndị ogbenye?
Sıkıntıya düşenler için ağlamaz mıydım? Yoksullar için üzülmez miydim?
26 Ma mgbe m lere anya ihe ọma, ihe ọjọọ bịara; mgbe m lere anya ìhè, mgbe ahụ ka ọchịchịrị bịara.
Ama ben iyilik beklerken kötülük geldi, Işık umarken karanlık geldi.
27 Obi m anaghị ezu ike nʼime m; ụbọchị ahụhụ na-ezute m.
İçim kaynıyor, rahatım yok, Önümde acı günler var.
28 Ana m agagharị na-eji nji ma ọ bụghị nʼihi oke anwụ. Eguzola m ọtọ nʼọgbakọ ndị mmadụ tikuo ha ka ha nyere m aka.
Yaslı yaslı dolaşıyorum, güneş yok, Topluluk içinde kalkıp feryat ediyorum.
29 Abụrụla m nwanne nkịta ọhịa; onye ya na ikwighịkwighị na-esogharị.
Çakallarla kardeş, Baykuşlarla arkadaş oldum.
30 Akpụkpọ ahụ m na-eji nji na-ekpe iwere; anụ ahụ m na-anụ ọkụ dịka ihe a kwanyere ọkụ.
Derim karardı, soyuluyor, Kemiklerim ateşten yanıyor.
31 Ụda ụbọ akwara m bụ ụda iru ụjụ; ụda ọja m bụkwa ụda iti mkpu akwa.
Lirimin sesi yas feryadına, Neyimin sesi ağlayanların sesine döndü.

< Job 30 >