< Job 19 >

1 Job zara sị:
Yobo azongisaki:
2 “Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ata m ahụhụ? Ruo ole mgbe ka unu ga-ewere okwu ọnụ unu zọpịa m?
« Kino tango nini bokotungisa ngai mpe kolembisa ngai na maloba na bino?
3 Ugboro iri ndị a ka unu kọcharala m, ihere adịghị eme unu na unu na-ebuso m agha?
Tala, botioli ngai mbala zomi, mpe bozali kobundisa ngai na soni te.
4 A sịkwarị na m bụ onye mmehie, ọ bụ naanị mụ onwe m ka ọ gbasara.
Soki ezali penza ya solo ete nabungi nzela, mbeba na ngai etali kaka ngai moko.
5 Ọ bụrụ na unu na-ebuli onwe unu elu karịa m, ma were ọnọdụ ịdị ala m megide m,
Soki mpe bolingi komimona likolo na ngai mpe kosalela pasi na ngai mpo na kotiola ngai,
6 mgbe ahụ, maranụ na Chineke emejọọla m, were ụgbụ ya tụọ m gburugburu.
wana boyeba ete Nzambe nde asali ngai mabe mpe azingeli ngai na monyama na Ye.
7 “Ọ bụ ezie na m na-eti mkpu akwa sị: ‘A na-emejọ m.’ Ma ọ dịghị ọsịsa m na-anata; ọ bụ ezie na m na-eti mkpu ka e nyere m aka ma ikpe ziri ezi adịghị.
Atako nagangi ete basali ngai mabe, nazali kozwa ata eyano moko te; ata soki nabeleli ete basunga ngai, moto oyo akokata likambo azali te.
8 Ọ nọchiela ụzọ m ka m ghara ịgafe; o jirila ọchịchịrị kpuchie ụzọ m.
Akangi nzela na ngai mpo ete nakoka koleka te, atondisi nzela na ngai nyonso na molili,
9 O yipụla m ugwu m, wepụkwa okpueze m kpu nʼisi.
alongoli ngai lokumu, mpe alongoli motole na moto na ngai,
10 Ọ na-eti m ihe otiti nʼakụkụ niile, ruo mgbe m gabigara; ọ na-ehopu olileanya m dịka osisi.
asasi-sasi ngai na bangambo nyonso kino nakomi pene ya kokufa, apikoli elikya na ngai ndenge bapikolaka nzete;
11 Iwe ya dị ọkụ megide m; ọ na-agụnyekwa m dịka onye iro ya.
kanda na Ye ezali kotumba ngai, mpe azali kotanga ngai na molongo ya banguna na Ye;
12 Ndị agha ya ji ike na-abịa; ha ewuola mgbidi were nnọchibido m ha agbaala ụlọ ikwu m gburugburu imegide m.
mampinga na Ye ezali kopusana na makasi penza, ezingeli ngai mpe ndako na ngai mpo na kosala ngai mabe.
13 “O meela ka ụmụnne m na ndị enyi m si nʼebe m nọ pụọ.
Akaboli ngai na bandeko na ngai, bongo bato oyo bayebi ngai bapesi ngai mokongo,
14 Ndị ikwu m anaghị etinyekwa uche nʼihe banyere m; ndị ezi enyi m niile echefuola m.
balingami na ngai balimwe, mpe baninga na ngai babosani ngai;
15 Ndị ọbịa nọ nʼụlọ m na ndị odibo m nwanyị na-agụ m dịka onye ala ọzọ; adị m ka onye mba ọzọ nʼebe ha nọ.
bato oyo nayambaki na ndako na ngai mpe basali na ngai ya basi, bango nyonso bakomi kotala ngai lokola mopaya, bakomi komona ngai lokola moto oyo batikala koyeba te.
16 Ana m akpọ odibo m oku ma ọ dịghị aza m, ọ bụladị mgbe m jiri ọnụ m rịọ ya.
Nazali kobenga mosali na ngai, kasi azali ata koyanola ngai te, atako monoko na ngai moko nde ezali kobondela ye.
17 Iku ume m abụrụla ihe nwunye m apụghị ịnagide; abụrụla m ihe arụ nye ụmụnne m.
Solo ya monoko na ngai ekomi kokimisa ata mwasi na ngai, bongo bandeko na ngai moko penza bayini ngai.
18 Ọ bụladị ụmụntakịrị nwoke na-akwa m emo; ha na-ejikwa m eme ihe ọchị mgbe ọbụla m pụtara.
Ata bilenge mibali ya mike bakomi koseka ngai; soki kaka nabimi, bakomi kosambwisa ngai.
19 Ndị ahụ m kpọrọ ndị enyi ọma m na-ele m anya dịka m bụ ihe arụ; ndị ahụ niile m hụrụ nʼanya echigharịakwala megide m
Balingami na ngai nyonso ya motema bayini ngai, bato oyo nazalaki kolinga babalukeli ngai;
20 Abụ m naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ; ihe m ji gbanarị ọnwụ adịghị ukwuu.
nakomi eloko pamba, natikali kaka poso ya nzoto mpe mikuwa, nazali kobika kaka na misuni ya minu na ngai.
21 “Meerenụ m ebere, ndị enyi m, meerenụ m ebere, nʼihi na aka Chineke na-emegide m.
Balingami na ngai, boyokela ngai mawa, nabondeli bino penza, boyokela ngai mawa, pamba te loboko ya Nzambe ebeti ngai.
22 Gịnị mere unu ji achụ m dịka Chineke si achụ m? Ọ ga-abụ na ahụhụ m ejubeghị unu afọ?
Mpo na nini bozali kolandela ngai boye, ndenge kaka Nzambe azali kolandela ngai? Botondi mosuni na ngai te?
23 “Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na e dekọrọ okwu m nʼakwụkwọ,
Ah, soki ata maloba na ngai ekomamaki, soki ekomamaki na buku!
24 na e ji mkpisi igwe dee ha, maọbụ kakwasị ha nʼelu mbadamba nkume ruo mgbe ebighị ebi.
Elingaki kokomama na ekomeli ya ebende, ya ebende oyo ya songe penza, mpo na kotobola makomi yango na mabanga mpo ete etikala wana mpo na libela.
25 Amara m na onye mgbapụta m na-adị ndụ, amakwaara m na ọ ga-eguzo nʼelu ụwa nʼoge ikpeazụ.
Ngai, nayebi na ngai malamu ete Mosikoli na ngai azali na bomoi, mpe, awa na mokili, akotelema ya suka mpo na kokata likambo na ngai.
26 Mgbe e mebisikwara akpụkpọ ahụ m, ma nʼanụ ahụ m aga m ahụ Chineke.
Sima na kobebisama ya poso ya nzoto na ngai, ngai, na nzoto na ngai, nakomona Nzambe.
27 Mụ onwe m ga-eji anya m abụọ hụ ya, mụ onwe m, ọ bụghị onye ọzọ. Lee ka obi m si anụ ọkụ nʼime m maka nke a!
Solo, nakomona Ye, miso na ngai moko ekomona Ye, ngai moko penza, moto mosusu te.
28 “Ọ bụrụ na unu asị, ‘Anyị ga-emegide ya nʼihi na nsogbu a si nʼaka ya,’
Bino oyo bozali koloba: ‹ Tokolanda ye ndenge nini? › Mpe bino bato oyo bomoni mabe kati na ngai,
29 unu onwe unu kwesiri ịtụ egwu mma agha; nʼihi na iwe ga-ebute ịta ahụhụ nke mma agha, mgbe ahụ, unu ga-ama na ikpe dị.”
bolenga bino moko liboso ya mopanga, pamba te mopanga ezali esalelo ya kanda mpo na masumu, mpe bokoyeba ete kosambisama ezali. »

< Job 19 >