< Job 17 >
1 Mmụọ m tiwara etiwa, ụbọchị m niile dị mkpụmkpụ, ili na-echere ịnabata m.
My spirit is broken, my days are cut short, the grave is ready for me.
2 Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu; anya m na-elekwasịkwa mkpasu iwe ha.
Yet truly those that mock are with me, and on their offendings must my eye rest.
3 “Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ. Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe?
And thou, [Creator!] attend, I pray thee, be my surety with thyself: who else is there that would strike hands with me?
4 I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta; ya mere, i gaghị ekwe ka ha nwee mmeri.
For thou hast concealed their heart against intelligence: therefore art thou not exalted [through them].
5 Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya, anya ụmụ ya ga-ada mba.
Every one of them speaketh deceptively to his friends: may also the eyes of his children fail.
6 “Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla, meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu.
And he hath placed me here as a by-word unto nations; and I become openly as a place of abomination.
7 Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ; ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ.
Therefore is my eye dim from vexation, and my limbs are all of them like a shadow.
8 Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a; ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume.
Upright men must be astonished at this, and the innocent must arouse himself against the hypocrite.
9 Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha, ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike.
Yet will the righteous hold firmly on to his way; and he that is clean of hands will acquire additional strength.
10 “Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ! Agaghị m achọta onye maara ihe nʼetiti unu.
But all of you, do only return, and come but [to me]: and yet I shall not find among you one wise man.
11 Ụbọchị m niile agafeela, atụmatụ m abụrụla ihe lara nʼiyi. Ma ọchịchọ nke obi m
My days are past, my resolves are broken off, [even the thoughts]—the possessions of my heart.
12 na-edo abalị nʼọnọdụ ehihie; nʼihu ọchịchịrị ka ìhè dị nso.
These would change the night into day, the light as near in the presence of darkness.—
13 Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili, ọ bụrụ na m agbasaa ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị, (Sheol )
When I hope for the nether world as my house; in the darkness have I spread my couch; (Sheol )
14 a sikwa na m asị ire ure, ‘Nna m ka ị bụ,’ maọbụ sị ikpuru ‘Nne m’ maọbụ ‘Nwanne m nwanyị,’
When I call to corruption, Thou art my father: Thou art my mother, and my sister, to the worms.
15 ebeekwa ka olileanya m dị? Onye pụrụ ịhụ ma m nwere olileanya?
Ay, where is then my hope? as for my hope, who will see it [fulfilled]?
16 Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ? Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?” (Sheol )
Let then my limbs sink down to the nether world: truly in the dust alone there is rest for all. (Sheol )