< Job 14 >

1 “Mmadụ nke nwanyị mụrụ nwere ụbọchị ole na ole nke jupụtara na nsogbu.
"Man, who is born of a woman, is of few days, and full of trouble.
2 Ọ na-awalite dịka okoko osisi, ma kpọnwụọkwa mgbe na-adịghị anya, dịka onyinyo, ọ na-agabiga agabiga.
He comes forth like a flower, and is cut down. He also flees like a shadow, and doesn't continue.
3 Ị na-elegide onye dị otu a anya? Ị ga-akpọ ya ikpe nʼihu gị?
Do you open your eyes on such a one, and bring me into judgment with you?
4 Onye pụrụ iwepụta ihe dị ọcha site nʼihe na-adịghị ọcha? Ọ dịghị onye ọ bụ.
Who can bring a clean thing out of an unclean? Not one.
5 Ị kpebiela ụbọchị ndụ nke mmadụ; ị kabiela ọnụọgụgụ nke ọnwa ya niile, kpaakwa oke ebe ọ na-agaghị agabiga.
Seeing his days are determined, the number of his months is with you, and you have appointed his bounds that he can't pass;
6 Nʼihi nke a, wepụ anya gị nʼebe ọ nọ, hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya ruo mgbe ụbọchị ya ga-ezu dịka onye e goro ọrụ.
Look away from him, that he may rest, until he shall accomplish, as a hireling, his day.
7 “Ma olileanya dịịrị osisi; nʼihi na ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epuchikwa, alaka ọhụrụ ya aghaghị ịwapụtakwa.
"For there is hope for a tree, If it is cut down, that it will sprout again, that the tender branch of it will not cease.
8 A sịkwarị na mgbọrọgwụ ya emeela ochie nʼala, maọbụ na ogwe ya anwụọ nʼaja,
Though its root grows old in the earth, and its stock dies in the ground,
9 mgbe ọbụla mmiri zokwasịrị ya, ọ na-epupụta dịka ihe a kụrụ akụ.
yet through the scent of water it will bud, and put forth boughs like a plant.
10 Ma mmadụ na-anwụ, e lie ya; ọ na-ekubikwa ume si otu a gabiga.
But man dies, and is laid low. Yes, man gives up the spirit, and where is he?
11 Dịka mmiri dị nʼoke osimiri si ata, maọbụ ka mmiri dị nʼiyi si ata nʼoge ọkọchị,
As the waters fail from the sea, and the river wastes and dries up,
12 otu a ka mmadụ si e dinaa ma ọ dịghị etetakwa ọzọ; tutu ruo mgbe eluigwe na-agaghị adịkwa; mmadụ ọbụla apụghị i si nʼụra kpọtee ya, agaghị akpọtekwa ha site nʼụra ha.
so man lies down and doesn't rise. Until the heavens are no more, they shall not awake, nor be roused out of their sleep.
13 “A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ, na ị ga-ezobe m tutu ruo mgbe iwe gị gabigara. A sị na ị ga-akanyere m oge ma mesịa cheta m. (Sheol h7585)
"Oh that you would hide me in Sheol, that you would keep me secret, until your wrath is past, that you would appoint me a set time, and remember me. (Sheol h7585)
14 Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ? Ụbọchị niile nke ọrụ ahụhụ m, aga m echere mgbe nnapụta m ga-abịa.
If a man dies, shall he live again? All the days of my warfare would I wait, until my release should come.
15 Ị ga-akpọ, aga m azakwa gị, agụụ ọrụ aka gị ga-agụ gị.
You would call, and I would answer you. You would have a desire to the work of your hands.
16 Nʼihi mgbe ahụ ị ga-agụ nzọ ụkwụ m niile ọnụ, ma ị gaghị agụkọ mmehie m.
But now you number my steps. Do you not watch over my sin?
17 A ga-ekechi njehie m nʼakpa, ị ga-ekpuchi mmehie m.
My disobedience is sealed up in a bag. You fasten up my iniquity.
18 “Ma dịka ugwu si erichasi daa, na dịka a na-enupu oke nkume nʼọnọdụ ya,
"But the mountain falling comes to nothing. The rock is removed out of its place;
19 dịka mmiri si akwọchasị nkume, na dịka oke mmiri ozuzo si akwazekwa aja ala, otu a ka i si eme ka olileanya mmadụ laa nʼiyi.
The waters wear the stones. The torrents of it wash away the dust of the earth. So you destroy the hope of man.
20 Ị na-egosi ya na ị karịrị ya ike, ma ha na-agabiga; ị na-eme ka ihu ya gbanwee, ma zilaga ya.
You forever prevail against him, and he departs. You change his face, and send him away.
21 Ọ bụrụ na a na-asọpụrụ ụmụ ha, ha adịghị amata nke a; ọ bụrụkwa na a na-eweda ha nʼala, ha ọ dịghị ahụ ya.
His sons come to honor, and he doesn't know it. They are brought low, but he doesn't perceive it of them.
22 Ihe mgbu nke anụ ahụ ya ka ọ na-ama ma na-erukwara naanị onwe ya ụjụ.”
But his flesh on him has pain, and his soul within him mourns."

< Job 14 >