< Jeremaya 52 >

1 Zedekaya gbara iri afọ abụọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị dị ka eze na Jerusalem afọ iri na otu. Aha nne ya bụ Hamutal nwa Jeremaya, onye Libna.
Sédécias était âgé de vingt et un ans quand il commença à régner, et il régna onze ans à Jérusalem. Sa mère s'appelait Hamutal; elle était fille de Jérémie, de Libna.
2 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jehoiakim mere.
Il fit ce qui est mauvais aux yeux de l'Éternel, tout comme avait fait Jéhojakim.
3 Ọ bụ nʼihi iwe Onyenwe anyị ka ihe ndị a niile ji bịakwasị Jerusalem na Juda. Nʼikpeazụ, o sitere nʼihu ya chụpụ ha. Nʼoge a, Zedekaya nupuru isi nʼokpuru eze Babilọn.
Car, à cause de la colère de l'Éternel, il en arriva ainsi à Jérusalem et à Juda, jusqu'à ce qu'il les rejetât de devant sa face. Or Sédécias se révolta contre le roi de Babylone.
4 Nʼihi ya, nʼafọ nke itoolu, nke ọchịchị Zedekaya, nʼụbọchị nke iri nʼọnwa nke iri, nke afọ ahụ, Nebukadneza, eze Babilọn, duuru usuu ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha. Ha mara ụlọ ikwu ndị agha nʼazụ obodo ahụ, wuokwa mgbidi nnọchibido gburugburu obodo ahụ.
Et il arriva, la neuvième année du règne de Sédécias, le dixième jour du dixième mois, que Nébucadnetsar, roi de Babylone, vint contre Jérusalem, lui et toute son armée; et ils campèrent contre elle et bâtirent des forts tout autour.
5 Anọchibidoro obodo a nʼagha ruo nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị eze Zedekaya.
Or la ville fut assiégée, jusqu'à la onzième année du roi Sédécias.
6 Nʼabalị nke itoolu, nke ọnwa anọ nʼafọ ahụ, oke ụnwụ siri ike dị nʼobodo ahụ ruo na ọ dịkwaghị nri dị nke ndị mmadụ ga-eri.
Le neuvième jour du quatrième mois, la famine sévissait dans la ville, et il n'y avait plus de pain pour le peuple du pays.
7 Mgbe ahụ, e tipuru oghere nʼaja mgbidi obodo ahụ, ndị agha niile ji abalị gbapụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, nʼagbanyeghị na ndị Babilọn nọ obodo ahụ gburugburu. Ha gbapụrụ chee ihu nʼụzọ Araba.
Alors la brèche fut faite à la ville, et tous les gens de guerre s'enfuirent et sortirent pendant la nuit hors de la ville, par le chemin de la porte, entre les doubles murailles, près du jardin du roi, pendant que les Caldéens bloquaient la ville tout autour; et on s'en alla par le chemin de la campagne.
8 Ma usuu ndị agha Babilọn chụsoro Zedekaya bụ eze nʼazụ, chụkwute ya na mbara ala Jeriko. Ndị agha ya niile sitere nʼebe ọ nọ gbasasịa, hapụ ya,
Mais l'armée des Caldéens poursuivit le roi; et ils atteignirent Sédécias dans les campagnes de Jérico; et toute son armée se dispersa d'avec lui.
9 e jide ya. Ha kpụgara ya eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe a nọ maa ya ikpe.
Ils prirent donc le roi, et le firent monter vers le roi de Babylone, à Ribla, au pays de Hamath, où on lui fit son procès.
10 Na Ribla ka eze Babilọn nọ gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya niile, nʼihu ya, o gbukwara ndịisi ọchịchị Juda niile.
Et le roi de Babylone fit égorger les fils de Sédécias en sa présence; il fit aussi égorger tous les chefs de Juda à Ribla.
11 Ọ ghụpụrụ anya Zedekaya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, kpụrụ ya gaa Babilọn, ebe o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ tutu ruo ụbọchị ọnwụ ya.
Puis il fit crever les yeux à Sédécias, et le fit lier de chaînes d'airain. Et le roi de Babylone l'emmena à Babylone, et le mit en prison jusqu'au jour de sa mort.
12 Nʼụbọchị nke iri, nʼọnwa nke ise, nke afọ iri na itoolu, nke ọchịchị Nebukadneza eze Babilọn, Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze, onye na-ejere eze Babilọn ozi, bịarutere Jerusalem.
Le dixième jour du cinquième mois, la dix-neuvième année de Nébucadnetsar, roi de Babylone, Nébuzar-Adan, capitaine des gardes, officier ordinaire du roi de Babylone, entra dans Jérusalem.
13 O sunyere ụlọnsọ Onyenwe anyị ọkụ, ụlọeze na ụlọ niile dị na Jerusalem, ụlọ ọbụla bụ nke dị mkpa ka o surere ọkụ.
Il brûla la maison de l'Éternel, et la maison royale, et toutes les maisons de Jérusalem; et il livra aux flammes toutes les grandes maisons.
14 Usuu ndị agha Kaldịa niile bụ ndị nọ nʼokpuru onyeisi ndị nche eze ahụ, kwaturu mgbidi ahụ niile gbara Jerusalem gburugburu.
Puis toute l'armée des Caldéens, qui était avec le capitaine des gardes, démolit toutes les murailles qui étaient autour de Jérusalem.
15 Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, buru ụfọdụ nʼime ndị dakarịsịrị nʼogbenye na ndị fọdụrụ nʼime obodo ahụ, ha na ndị ǹka niile fọdụrụ, na ndị ahụ ji aka ha gbakwuru eze Babilọn, bulaa ha Babilọn, ka ha ga biri nʼala ọzọ.
Et Nébuzar-Adan, capitaine des gardes, emmena captifs quelques-uns des pauvres du peuple, ceux qui étaient demeurés de reste dans la ville, ceux qui s'étaient rendus au roi de Babylone et le reste de la multitude.
16 Ma Nebuzaradan, hapụrụ ndị ahụ bụ nnọọ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ka ha na-elekọta ubi vaịnị niile a gbara ogige na ala ubi niile.
Toutefois Nébuzar-Adan, capitaine des gardes, en laissa quelques-uns des plus pauvres du pays, comme vignerons et laboureurs.
17 Ma ndị Babilọn tipịara ogidi bronz niile, ha na ihe ndọkwasị niile na Oke osimiri bronz ndị ahụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, buru bronz ahụ niile bulaa Babilọn.
Et les Caldéens mirent en pièces les colonnes d'airain qui étaient dans la maison de l'Éternel, les socles, et la mer d'airain, qui étaient dans la maison de l'Éternel, et ils en emportèrent tout l'airain à Babylone.
18 Ha chịkọọrọ ite niile, na shọvel niile na ihe ịkpakepụ ọkụ niile, na efere ịkwọsa mmiri niile, na ngaji ukwu niile, na ihe bronz niile, bụ nke e ji eje ozi nʼime ụlọnsọ ahụ.
Ils emportèrent aussi les chaudières, les pelles, les serpes, les bassins, les tasses, et tous les ustensiles d'airain employés pour le service.
19 Ọchịagha ndị nche eze ahụ sikwa nʼụlọnsọ ahụ chịrị ihe ndị a: efere ukwu niile, ihe ịgụnye ọkụ niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ite niile, ihe ịdọkwasị oriọna niile, ngaji ukwu niile na iko e ji enye onyinye ihe ọṅụṅụ, ya bụ ihe ndị ahụ niile e ji ọlaedo a nụchara anụcha maọbụ ọlaọcha kpụọ.
Le capitaine des gardes emporta aussi les coupes, et les encensoirs, et les bassins, et les chaudières, et les chandeliers, et les tasses et les gobelets, ce qui était d'or et ce qui était d'argent.
20 O burukwara bronz sitere nʼogidi abụọ ahụ, oke Osimiri ahụ na ehi iri na abụọ e ji bronz kpụọ, bụ nke dị nʼokpuru ya, na ihe ndọkwasị ya niile, nke eze bụ Solomọn mere nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha karịrị ihe a ga-eji ihe ọtụtụ tụọ.
Pour ce qui est des deux colonnes, de la mer et des douze bœufs d'airain qui lui servaient de base, et que Salomon avait faits pour la maison de l'Éternel, on ne pouvait peser l'airain de tous ces objets.
21 Ị dị elu nke otu nʼime ogidi abụọ ndị a bụ mita asatọ na ụma nʼọtụtụ. Ị dị gburugburu ya bụkwa mita ise na ụma anọ, nke ọbụla nʼime ha bụ mkpịsịaka anọ. Oghere dịkwa nʼime ha.
Pour les colonnes, chaque colonne avait dix-huit coudées de haut, et un cordon de douze coudées en pouvait faire le tour; elle était épaisse de quatre doigts et creuse.
22 Isi bronz nke e kpụkwasịrị nʼotu ogidi dị mita abụọ na ụma atọ nʼịdị elu. Ọ bụkwa ihe yiri mkpụrụ pomegranet e ji bronz kpaa, ka e ji chọọ ya mma gburugburu ya niile. Ogidi nke abụọ nwekwara pomegranet, yiri ibe ya.
Et il y avait au-dessus un chapiteau d'airain; et la hauteur d'un des chapiteaux était de cinq coudées; et sur le chapiteau, à l'entour, étaient un réseau et des grenades, le tout d'airain. La seconde colonne était en tout semblable, et il y avait aussi des grenades.
23 Pomegranet ndị ahụ dị iri itoolu na isii, ọ bụkwa nʼakụkụ ọbụla ka ọ dị. Ọnụọgụgụ pomegranet niile dị nʼelu ihe ahụ a kpụrụ akpụ dị otu narị.
Et il y avait quatre-vingt-seize grenades extérieurement. Toutes les grenades sur le réseau étaient au nombre de cent, à l'entour.
24 Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata dịka ndị mkpọrọ.
Et le capitaine des gardes prit Séraja, premier sacrificateur, et Sophonie, second sacrificateur, et les trois gardes du seuil.
25 O sitere nʼetiti ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo kpụụrụ otu onyeisi na-ahụ maka ndị agha, na ndị ikom asaa na-enye eze ndụmọdụ. O kpukwaara ode akwụkwọ, onye isi ọrụ na-ahụ maka ịmanye ndị ga-aga agha, jidekwa iri ndị ikom isii bụ ndị a hụrụ nʼime obodo ahụ.
Et de la ville il prit un eunuque qui avait la charge des gens de guerre, et sept hommes de ceux qui voyaient la face du roi, qui se trouvèrent dans la ville, le secrétaire en chef de l'armée, qui enrôlait le peuple du pays, et soixante hommes d'entre le peuple du pays, qui furent trouvés dans la ville.
26 Nebuzaradan, bụ ọchịagha kpụụrụ ha niile, dute ha nʼihu eze Babilọn na Ribla.
Nébuzar-Adan, capitaine des gardes, les prit et les mena au roi de Babylone, à Ribla.
27 Nʼebe ahụ na Ribla, dị nʼobodo Hamat, ka eze nọ nye iwu ka e gbuo ha niile. Ya mere, a dọọrọ Juda nʼagha, mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ.
Et le roi de Babylone les frappa, et les fit mourir à Ribla, au pays de Hamath. Ainsi Juda fut transporté hors de son pays.
28 Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ahụ Nebukadneza mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ. Nʼafọ nke asaa nke ọchịchị ya, puku atọ ndị Juu na iri abụọ na atọ, 3,023.
C'est ici le peuple que Nébucadnetsar emmena en captivité: La septième année, trois mille vingt-trois Juifs.
29 Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Nebukadneza, ka o mere ka narị mmadụ asatọ na iri atọ na abụọ, 832 si na Jerusalem gaa biri nʼala ọzọ.
La dix-huitième année de Nébucadnetsar, on emmena de Jérusalem huit cent trente-deux personnes.
30 Nʼafọ nke iri abụọ na atọ, Nebuzaradan, onyeisi ndị nche alaeze Babilọn bulara ndị dị narị ndị Juu asaa na iri anọ na ise, 745 ka ha ga biri nʼala ọzọ. Ọnụọgụgụ ha niile dị puku anọ na narị isii, 4,600.
La vingt-troisième année de Nébucadnetsar, Nébuzar-Adan, capitaine des gardes, transporta sept cent quarante-cinq personnes des Juifs. Toutes ces personnes furent donc quatre mille six cents.
31 Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn. Mgbe ahụ, o mere ka Jehoiakin eze Juda, si nʼụlọ mkpọrọ pụta, nwere onwe ya. O mere nke a nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa iri na abụọ.
Or il arriva, la trente-septième année de la captivité de Jéhojakim, roi de Juda, le vingt-cinquième jour du douzième mois, qu'Évilmérodac, roi de Babylone, l'année où il devint roi, releva la tête de Jéhojakim, roi de Juda, et le tira de prison.
32 Ọ gwara ya okwu ọma, nyekwa ya ọnọdụ ugwu dị elu karịa ọnọdụ ndị eze ndị ọzọ niile ha na ya nọ na Babilọn.
Il lui parla avec douceur, et il mit son trône au-dessus du trône des rois qui étaient avec lui à Babylone.
33 Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri.
Et après qu'il lui eut changé ses vêtements de prisonnier, il mangea constamment en sa présence, tout le temps de sa vie.
34 Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, eze Babilọn na-enye Jehoiakin oke ihe ruru ya kwa ụbọchị niile nke ọ dị ndụ, ruokwa nʼụbọchị ọnwụ ya.
Et pour son entretien, un ordinaire continuel lui fut établi par le roi de Babylone, pour chaque jour, jusqu'à sa mort, tout le temps de sa vie.

< Jeremaya 52 >