< Aịzaya 50 >

1 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Olee ebe akwụkwọ m ji gbaa nne unu alụkwaghị m dị bụ nke m ji chụpụ ya? Ma ọ bụ onye nʼime ndị m ji ụgwọ ka m resiri unu? Ọ bụ nʼihi mmehie unu ka e ji ree unu; nʼihi mmebi iwu unu ka e jiri chụọ nne unu.
Yahwe asema hivi, ''Kiko wapi cheti cha talaka ambacho nimempa tataka mama yako? na kwa nani niliowauza mimi? Tazama, umewauza kwa sababu ya dhambi zako, na kwa sababu ya uasi wako, na mama yako amepelekwa mbali.
2 Gịnị mere o ji bụrụ na o nweghị onye nọ ya mgbe m bịara? Gịnị mere o nweghị onye zara m mgbe m kpọrọ oku? Ọ pụtara na aka m dị mkpụmkpụ ịzọpụta unu? Ọ ga-abụ na m enwekwaghị ike ịzọpụta? Nʼihi na enwere m ike ịbara osimiri mba mee ya ka ọ ghọọ ala akọrọ. Enwere m ike ime ka osimiri ghọrọ ọzara, ka azụ niile dị nʼime ya nwụọ nʼihi enweghị mmiri.
Kwa nini nimekuja maana hakuna mtu pale? Kwa nini nimeita lakini hakuna aliyejibu? Je mkono wangu ni mfupi kukufidia wewe? Je hakuna nguvu katika ukombozi wngu kwako? Tazama, maonyo yangu, nimeikausha bahari; nimeufanya mto kuwa jangwa; samaki wake wamekufa na kuoza kwa kukosa maji.
3 Ọ bụ mụ bụ onye ahụ na-eme ka ọchịchịrị kpuchie ihu eluigwe, ka ihu eluigwe dịrị ka ihu onye na-eru ụjụ.”
Nimelivisha giza; na ku kwa ngfunika nguo za magunia.''
4 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ. Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m, meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya.
Bwana Yahwe amenipa mimi lugha kama wale wanayofundishwa, ili kwamba nizungumze maneno ya kudumisha kwa yeye aliyechoka; huniamsha mimi asubuhi kwa asubuhi; huyaamsha masikio yangu kama wale wanofundisha.
5 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị emeghela ntị m abụọ, ma enupughị m isi, a tụgharịkwaghị m azụ.
Bwana Yahwe amefungua sikio langu, na sikuaasi, wala kurudi nyuma.
6 Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe; agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m. Ezopụghị m ihu m nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ.
Niliwapa mgongo wangu wale wanaonipiga mimi, na shavu langu kwa wale wanaopokonya nje ndevu zangu; Sitouficha uso wangu kutokana na matendo ya aibu na kutema mate.
7 Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka, ihere agaghị eme m. Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ, a maara m na ihere agaghị eme m.
Maana Bwana Yahwe atanisaidia mimi; hivyo basi sitapatwa na aibu; hivyo nimeufanya uso wangu kama jiwe, maana ninajua kwamba sitaabishwa.
8 Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso. Onye ga-apụta ibo m ebubo? Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu! Onye nwere ebubo megide m? Ya bịa ka anyị kwuo ya.
Yeye aliye nitakasa mimi yu karibu. Ni nani atakayenipinga mimi? Basi na tusimame tufarijiane mmoja mmoja. Nani aliye mshitaki? Muache aje karibu na mimi.
9 Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Onye pụrụ ịma m ikpe? Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe, nla ga-erichapụkwa ha.
Tazama, Bwana Yahwe atanisaidia mimi. Nani atakayetangaza kuwa mimi ni mwenye hatia? Tazama, watavaa nje kama vazi; mdomo utawala wao juu.
10 Onye nʼetiti unu bụ onye ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị, na-egekwa ntị nʼokwu odibo ya? Ka onye ahụ na-eje ije nʼọchịchịrị, nke na-enweghị ìhè ọbụla, tụkwasị obi nʼaha Onyenwe anyị daberekwa na Chineke ha.
Ni nani miongoni mwenu anayemuogopa Yahwe? Ni nani anayehieshimu sauti ya Yahwe? Ni nani atakayetembea kwenye giza nene pasipo mwanga?
11 Ma lee, unu niile ndị na-amụnye ọkụ, ndị meere onwe ha ọwaọkụ, nke unu ji na-ejegharị nʼọchịchịrị, gaanụ nʼihu na-ejegharị nʼìhè ọkụ ahụ unu mụnyeere onwe unu. Ihe unu ga-anata site nʼaka Onyenwe anyị bụ ihe mwute nke ga-abịakwasị unu.
Tazama, ninyi nyote mnaowasha, ni nani aliyewapa wenyewe kwa tochi: tembeni katika mwanga wa moto wenu na katika moto mliouwasha. Hili ndilo mlilopokea kutoka kwangu: utalala chini katika mahali pachungu.

< Aịzaya 50 >